Wednezde n’ime Izuụka nke Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
1 Sam: 17:32-33, 37, 40-51
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 144:1, 2, 9-10
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMak: 3:1-6
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –1 Sam: 17:32-33, 37, 40-51
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Akwụkwọ mbụ nke Samuel
Devid wee sị Sọl, “Onyenwe m, ụjọ atụla onye ọbụla maka onye Filistia nke a! Aga m eje lụso ya agha.” Sọl zara ya sị, “mba! Olee otu ị ga-esi alụso ya agha? Ị bụ nwata.
Ma ya onwe ya bụ onye agha ogologo ndụ ya nile”! Yahweh, onye napụtara m n’aka ọdụm na anụ ndọgbu, ga-anapụtakwa m n’aka onye Filistia nke a.” Sọl wee sị, “Ọ dị mma. Jee Osebụrụwa ga-anọnyekwara gị.”
O weere mpanaka ọ na-eji achị atụrụ, tụtụrụkwa okwute ise na-akwọ mụrụmụrụ n’ime mmiri iyi, tinye ha n’ime akpa ya. O were ebe ya, pụọ izute Goliat. Onye Filistia ahụ na onye na-eburu ya ọta ji nwayọọ na-abịa nso n’ebe Devid nọ.
Mgbe onye Filistia ahụ bịaruru nso, o lezuru Devid anya, wee lelịa ya, n’ihina ọ bụ nwata, makwaa mma ile anya. O wee sị Devid, Gịnị ka i ji osisi nke a ịkpa n’aka eme? I chere na abụ m nkịta nke na i ji osisi abịa ebe m nọ?” O jiri aha chi ya kpọọ Devid iyi.
O cheere Devid aka ọgụ, sị, “Bịa, ka m dorie gị, were anụ gị fesaara ụmụnnụnụ na anụmaanụ nke ọhịa.” Devid zara Goliat, sị, “I ji mmaagha, ogologo ube na mkpụmkpụ ube na-abịakwute m. Ma mụ onwe m ji aha Yahweh, Chineke igwe ndịagha na-abịakwute gị, nke bụ Chineke usuu ndịagha Izrel, onye I leliri.
Ụbọchị taa ka Yahweh ga-etinye gị n’aka m. Aga m egbukwa gị, bepụ gị isi. Aga m ewerekwa ozu ndịagha Filistia nye ụmụnnụnụ nke igwe na anụmaanụ nke ọhịa ka ha jiri mere ihe oriri.
Mgbe ahụ ụwa niile ga-amata na Izrel nwere Chi. Mmadụ niile ga-amata na Izrel na ọ bụghị mmagha na ube ka Yahweh ji enye mmeri, n’ihina Yahweh nwe mmeri n’agha nke a.
Ọ ga-enyekwa ụnụ niile n’aka anyị”. Goliat ebilie ijeru Devid nso ọzọ, Devid mere ngwa, gbaa ọsọ, ruo n’ọgbọ agha ndị Filistia ibuso Goliat agha. O tinyere aka n’ime akpa ya, wepụta otu okwute ahụ gbaa ya Golia n’egedege ihu. Okwute ahụ baruru n’ụbụrụ ya.
Goliat wee daa, kụọ ihu n’ala. Otu a ka Devid siri jiri ebe na okwute gbuo Goliat, na-ejighị mmagha. Devid gbaara ọsọ, garuo ebee Goliat tọgbọrọ zọdo ya ụkwụ, mịrị mmaagha Goliat n’ọbọ ya, bepụ ya isi, ọ nwụọ. Mgbe ndị Filistia hụrụ na dike ha anwụọla, ha wee gbalaga.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 144:1, 2, 9-10
Azịza: Ngọzi dịrị Osebụrụwa, nkume m.
1. Ngọzi dịrị Osebụrụwa, nkume m,
Onye na-azụ aka m maka ịlụ ọgụ
mkpịsị aka m maka ibu agha.
Azịza: Ngọzi dịrị Osebụrụwa, nkume m.
2. Ọ bụ ya bụ ịhụnanya m, na onye nkwado m
ụlọ mgbaba m, na onye nzọpụta m,
ọ bụ na ya ka m na-ezo onwe m,
ekpeke m,ọo na-eme ka mba niile rubere m isi.
Azịza: Ngọzi dịrị Osebụrụwa, nkume m.
3. Onyenweanyị, aga m ekwere gị ukwe ọhụrụ
Aga m eji ụbọ akwara kweere gị ukwe
Ọ bụ gị na-enye ndịeze mmeri
Nakwa azọpụta Devid nwaodibo gị.
Azịza: Ngọzi dịrị Osebụrụwa, nkume m
MBEKU
Alleluia, Alleluia:
Jisọs kwusara Oziọma nke Alaeze ma gwọọ ọrịa ọ bụla n'etiti ndị mmadụ
Alleluia.
OZIỌMA –Mak: 3:1-6
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere.
Jesu banyere ọzọ n’ụlọnzukọ ha, ma otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ nọ ebe ahụ. Ụfọdụ mmadụ nọkwa ebe ahụ na-eche ka ha mara ma ọ ga-arụ ọrụ ịgwọ mmadụ n’ụbọchị Sabat, ka ha wee bo ya ebubo.
Jesu sịrị nwoke ahụ aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ, “Bịa ebe a”. O wee jụọ ndị ahụ sị, “O ziri ezi n’iwu ime iheọma n’ụbọchị Sabat ka ọ bụ ime ihe ọjọọ, ịzọpụta ndụ ka ọ bụ ịla ya n’iyi?”
Ma ha gbara nkịtị. Jesu jiri iwe lezuo ha anya. O wutere ya n’ihi obi ịkpọnkụ ha. Ọ sịrị nwoke ahụ: “Gbatịa aka gị”. Ọ gbatịrị ya, aka ya wee dịkwa mma ọzọ.
N’ihi nke a ndị Farisii siri n’ụlọnzukọ pụọ; ha na ndị otu Herọd gbara izu ozigbo ahụ otu ha ga-esi gbuo Jesu.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu