Nnukwu Oriri Marịa dị Asọ Nne nke Chukwu.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Num: 6:22-27
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 67:2-3, 5,6,8, Az. 2
-
Ihe ọgụgụ nke abụọ
Gal : 4:4-7
- OziọmaLuk: 2:16-21
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – Num: 6:22-27
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ nke Ọnụọgụgụ
Dinwenụ gwara Mosis sị: “Lee ihe ị ga-agwa Erọn na ụmụ ya: “Otu a ka ụnụ ga-esi na-agọzi ụmụ Izrel. Gwa ha sị: Ka Dinwenụ gọzie ụnụ chegidekwa ụnụ.
Ka ihè nke Dinwenụ chakwasa ụnụ; ka O nyekwa ụnụ amara Ya. Ka Dinwenụ chee ụnụ ihu, bịakwa wetara ụnụ udo. “Otu a ka ha ga-esi kpọdata aha M n’isi ụmụ Izrel, ewere M gọzie ha.”
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA – Ps. 67:2-3, 5,6,8, Az. 2
Azịza: Chineke, biko meere anyị ebere gọzie anyị
1. Chineke, biko, meere anyị ebere, gozie anyị,
meekwa ka ihe nke ihu Gị chakwasa anyị,
ka e were mata ụzọ Gị n’ụwa.
Mba niile abịakwa nweta enyemaka nzọpụta Gị.
Azịza: Chineke, biko meere anyị ebere gọzie anyị
2. Ka mba nile ñụrịa na-egorikwa,
n’ihi na I ji ikpe nkwụmọtọ na-achị ụwa,
Discover more
Litany of the Blessed Virgin Mary
jirikwa ezi obi na-achị ndị mmadụ.
Ọ bụ Gị na-edu mba niile n’ụwa.
Azịza: Chineke, biko meere anyị ebere gọzie anyị
3. Dinwenụ, ka ndị mmadụ too Gị,
ka mmadụ niile nye Gị otito.
Discover more
Litany of the Blessed Virgin Mary
Ka Chineke nọgide na-enye anyị ngọzi Ya,
ruo mgbe mba niile ga-atụrụ Ya egwu.
Azịza: Chineke, biko meere anyị ebere gọzie anyị
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ –Gal : 4:4-7
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Galeshịa
Mgbe oge ahụ a kara aka zuru, Chineke zitere Nwa Ya, Onye nwanyị mụrụ; Onye a mụrụ n’okpuru iwu, ka O wee gbapụta ndị nọ n’okpuru iwu, bịakwa mee anyị ndị e jiri mere ụmụ.
Ihe na-agba akaebe na ụnụ bụ ụmụ n’ezie, bụ na Chineke zitere Mmụọ nke Nwa Ya n’ime obi anyị; ọ bụ Mmụọ ahụ na-eti mkpu na-asị “Abba! Nna!”
Ọ bụ Ya na-eme ka ị bụrụ nwa n’ezie. Ị bụkwaghị ohu ọzọ. Ebe Chineke merela ka ị bụrụ nwa Ya, ọ pụtara na ị bụrụkwala onye ga-erite oke a na-ekenye ụmụ.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ALELUYA – Hib. 1:1-2
Aleluya, aleluya!
N’oge gara aga. Chineke siri n’ọnụ ndị amụma gwa nna nna anyị ha okwu. Ma n’oge ugbu a, O si n’ọnụ Nwa Ya agwa anyị okwu.
Aleluya!
OZIỌMA – Luk: 2:16-21
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Ndị nche atụrụ ji ọsọ na ije gawa Betlehem. Ha hụrụ Marịa na Josef na Nwata ahụ ka O dina n’ihe e ji etinye nri anụ ụlọ. Mgbe ha hụrụ Nwata ahụ, ndị nche atụrụ akọkwa ọzọ ihe a gwara ha banyere Ya.
Akụkọ ndị nche atụrụ tụrụ onye ọ bụla nụrụ ya n’anya. Mana Marịa chịịrị okwu niile ndị a, wụnye n’obi ya, na-atụgharịkwa ha n’obi ya. Mgbe ndị nche atụrụ na-alaghachi, ha na-aja Chineke mma, na-etokwa Ya, maka ihe niile ha nụrụ na ihe niile ha hụrụ.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu