Ụbọchị nke Ise N’Izuụka Krismas.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
1 Jn: 2:3-11
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 96:1-2, 2-3, 5-6.
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk: 2: 22-35.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –1 Jn: 2:3-11
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Jọn nke mbụ
N’ụzọ dị otu a, ọ ga-edo anyị anya na anyị maara ya, ma ọ bụrụ na anyị edobe iwu ya niile. Onye na-asị, “Amaara m ya” ma na-enupụrụ iwu ya isi, bụ onye ụgha. Eziokwu ahụ adịghị n’ime ya. Onye ọbụla nke na-edobe okwu ya, n’ezie, ịhụnaanya maka Chineke zuru oke n’ime ya. Onye na-ekwu na ya bi n’ime Kristi kwesịrị ibi ndụ dịka ya. Ndị m hụrụ n’anya, ọ bụghị iwu ọhụrụ ka m na-edere ụnụ, kama ọ bụ iwu ochie nke e nyere ụnụ site na mbụ. Iwu ochie a bụ okwu ahụ nke ụnụ nụrụla. Ma otu ọ dị, ana m edere ụnụ iwu ọhụrụ, nke bụ eziokwu n’ime ya na n’ime ụnụ. N’ihina ọchịchịrị na-agafe, ezi ihé ebidola ịchawapụta. Onye na-asị na ya nọ n’ihe ahụ ma na-akpọ nwanne ya asị, ka nọkwa n’ọchịchịrị. Onye na-ahụ nwanne ya n’anya na-anọgide n’ihe. Ọ dịghịkwa ihe ịsọ ngọngọ dị n’ime ya; Onye ọbụla na-akpọ nwanne ya asị, bi n’ime ọchịchịrị, na-agagharịkwa n’ime ọchịchịrị. Ọ maghịkwa ebe ọ na-aga, n’ihi na ọchịchịrị mere ka o kpuo isi.
Okwu nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 96:1-2, 2-3, 5-6.
Azịza: Ka Eluigwe na ụwa kwebe ukwe añụrị.
1. Kweerenụ Onyenweanyị ukwe ọhụrụ;
ụwa niile kweere Onyenweanyị ukwe.
Kweerenụ Onyenweanyị ukwe,
toonụ aha ya.
Azịza: Ka Eluigwe na ụwa kwebe ukwe añụrị.
2. Kwupụta nzọpụta ya ụbọchị niile.
Mee ka ụwa niile mara maka otito ya,
Kwupụtakwa ọrụ ịtụnaanya ya n’ebe ndị mmadụ nọ.
Azịza: Ka Eluigwe na ụwa kwebe ukwe añụrị.
3. Onyenweanyị kere eluigwe.
Otito na ebube gbara ya gburugburu,
Ike na mma jupụtara ụlọ nsọ ya.
Azịza: Ka Eluigwe na ụwa kwebe ukwe añụrị.
MBEKU:
ALLELUIA ALLELUIA:
Okwu ahụ bụụrụ mmadụ, wee binyere anyị.
Ma ndị niile nabatara ya, kwerekwa n’aha ya,
ka o nyere ike ịbụ ụmụ nke Chineke.
ALLELUIA.
OZIỌMA –Lk: 2: 22-35.
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Mgbe oge bịara maka emume nke ịdịọcha dịka iwu Mosis siri dị, Josef na Marịa kutere Jesu na Jerusalem n’ihu nke Dinwenụ. Dịka e dere n’iwu nke Yahweh sị, “Nwa mbụ ọbụla nke bụ oke ga- abụ ihe dị nsọ n’ihu Yahweh.” Ha bịara ịchụ aja dịka e nyere n’iwu nke Dinwenụ, “Nduru abụọ ma ọ bụ ụmụ kparakwukwu abụọ.” N’oge a, e nwere otu nwoke bi na Jerusalem, aha ya bụ Simiọn, ọ bụ onye eziomume bụrụkwa onye na-atụ egwu Chineke. Ọ nọ na-elekwa anya maka nkasịobi nke Izrel, Mmụọ Nsọ nọnyekwaara ya. Mmụọ Nsọ emeelarịị ka ọ mata na ọ gaghị ahụ ọnwụ tupu ọ hụ Kristi nke Onyenweanyị. Site n’odudu nke Mmụọ Nsọ, nwoke a batara n’Ụlọnsọ. Ma mghe nne na nna Jesu kubatara ya n’ụlọnsọ ka e meere ya dịka omenaala nke iwu si dị. Simiọn kuuru ya n’aka ya abụọ, kelee Chineke sị: “Ugbu a, Onyenwe m ka nwodibo gị laa n’udo, dịka nkwa gị siri dị. N’ihina anya m ahụla nzọpụta gị, nke ị kwadobere n’ihu mmadụ niile. Ọ bụ ihe nke ga-ekpughe ụzọ nye ndị mba ọzọ, na, otito nke ndị gị bụ Izrel.” Ihe niile Simiọn kwuru gbasara nwatakịrị ahụ bụ Jesu tụrụ nne na nna ya n’anya. Simiọn wee gozie ha, gwa Marịa nne Jesu sị: “Lee e dobere nwatakịrị a maka ọdịda na mbili ọtụtụ mmadụ n’Izrel, na maka ihe ọmụmaatụ a ga-ekwutọ-ekwutọ, (ma mmaagha ga-amawa gị obi) ka e were kpughee ihe dị ọtụtụ mmadụ n’obi.”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu