Emume Ezinụụlọ Dị Asọ nke Jesu, Marịa na Josef.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Sir: 3:2-6, 12-14
-
Abụọma na azịza ya
Ps: 127:1-5. Az. 1
-
Ihe ọgụgụ nke abụọ
Col: 3:12-21
- OziọmaMatt: 2:13-15, 19-23
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Sir: 3:2-6, 12-14
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ nke Sirak
Onyenweanyị na-esi n’ụmụ enye nna ha ugwu, na-ewelitekwa elu ikikere nne nwere n’ebe ụmụ ya nọ. Onye ọ bụla na-enye nna ya nsọpụrụ na-akwụ ụgwọ dịịrị njọ ya. Onye na-enye nne ya ugwu dị ka onye na-ekpọkọba akụ na ụba. Onye ọ bụla na-asọpụrụ nna ya ga-enwe añụrị n’ụmụ nke ya. Oge ọ rịọrọ arịrịọ, a ga-aza ya. Onye na-enye nna ya nsọpụrụ na-ebi ogologo ndụ. Onye na-eme ka obi dị nne ya jụụ, na-ehubere Onyenweanyị isi. Nwa m, nyere nna gị aka mgbe o mere okenye. A kpasukwala ya iwe na ndụ ya. Asịgodị na echiche ya ezukwaghị oke site na nka, gosi ya ebere. E jila n’ihi ahụ ịdị ike na ikikere i nwere were eleda ya anya, maka na a dịghị echefu ihe ọma e meere nna echefu; kama, ọ ga-abụ ihe ị ga-eji akwụ ụgwọ dịịrị njọ gị.
Okwu nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA –Ps: 127:1-5. Az. 1
Azịza: Ngọzi ga-adịrị ndị na-atụ Chukwu egwu na-eso ụzọ Ya.
1. Ngọzi ga-adịrị ndị na-atụ Chukwu egwu, na-eso ụzọ Ya.
Ihe aka gị kụtara ka ị ga-eri.
Añụrị na aga m n’ihu ga-abụ nke gị.
Azịza: Ngọzi ga-adịrị ndị na-atụ Chukwu egwu na-eso ụzọ Ya.
2. Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịnị,
na-amị mmịmị n’ime ụlọ gị,
ụmụ gị ga-agarube oche nri gị,
dịka ome osisi olivu.
Azịza: Ngọzi ga-adịrị ndị na-atụ Chukwu egwu na-eso ụzọ Ya.
3. Otu a ka a ga-esi gọzie onye na-atụ Chukwu egwu.
Ka Dinwenụ si na Zayọn gọzie gị,
ụbọchị ndụ gị niile.
Azịza: Ngọzi ga-adịrị ndị na-atụ Chukwu egwu na-eso ụzọ Ya.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ –Col: 3:12-21
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Kolosị
N’ihi na ụnụ bụ agbụrụ Chineke họtara ahọta, na ndị dị nsọ, Ọ hụrụ n’anya, yikwasịnụ obi ebere, obi ọma, obi dị ume ala, ịdị nwayọọ, na ogologo ntachị obi. Na-edinụ ihe ibe ụnụ na-eme ụnụ. Ụnụ ebukwarala mmadụ ibe ụnụ ihe ọjọọ ọ bụla n’obi. Na-agbagharanụ ibe ụnụ mgbe ọ bụla ha mejọrọ ụnụ, dịka Onyenweanyị si agbaghara ụnụ mmehie nke ụnụ. Ma nke kachasị nke n’ezi omume niile ndị a bụ: yikwasịnụ ịhụnanya nke bụ ihe nkekọta nke na-eme ka udo zuru oke dị n’etiti mmadụ na ibe ya. Kweenụ ka udo ahụ Kristi na-enye, bụrụ ihe na-achị obi ụnụ. N’ihi na, ebe e mere ka ụnụ soro bụrụ akụkụ otu ahụ Ya ahụ, a kpọbatala ụnụ n’ime udo Ya ahụ. Na-ebinụ ndụ ekele! Ka okwu nke Kristi, were uju akụ na ụba ya niile biri n’ime ụnụ. Werenụ amamihe zuru oke na-eziritanụ ibe ụnụ ihe, na-adụrịtakwanụ ibe ụnụ ọdụ. Werenụ abụọma, na ukwe, na abụ si n’ime mmụọ ụnụ pụta, na-enyenụ Chineke ekele. N’ihi amara Ya, n’ihe ọ bụla ụnụ na-eme, ma ọ bụ okwu ma ọ bụ ọrụ, na-emenụ ha niile n’aha Onyenweanyị Jesu. Na-enyenụ Chineke Nna ekele site na Kristi. Ndị bụ nwunye, na-edonụ onwe ụnụ n’okpuru di ụnụ. Ndị bụ di, hụnụ nwunye ụnụ n’anya. Ụnụ enwela obi ilu n’ebe ha nọ. Ndị bụ ụmụ, na-añanụ ntị n’olu ndị mụrụ ụnụ, otu o kwesịrị ndị Kristi. N’ihi na ime otu ahụ na-atọ Chineke ụtọ. Ndị bụ nna, ụnụ akpasula ụmụ ụnụ iwe, ka ike ghara ịgwụ ha n’ịgba mbọ ime ihe dị mma.
Okwu nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu
ALELUYA
Aleluya, aleluya!
Ka udo Kristi chịwa n’obi ụnụ;
ka ozi ahụ Kristi ziri bịa n’uju biri n’ime ụnụ.
Aleluya!
OZIỌMA –Matt: 2:13-15, 19-23
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Mgbe ndị amamihe ahụ laghachiri ala ha, mmụọ ozi nke Onyenweanyị gosiri Josef onwe ya na nrọ, sị: “Bilie, kpọrọ Nwa na nne ya gbaga n’ljipt. Nọrọ ebe ahụ, ruo mgbe m ga-agwa gị, n’ihi na Herọd ga-achọ Nwatakịrị ahụ ka o wepụ ndụ ya n’ike.” Josef wee bilie, kpọrọ Nwa na nne n’ime abalị, gaa Ijipt. N’ebe ahụ ka ọ nọ ruo mgbe Herọd nwụrụ. E mere nke a, iji mezuo okwu Onyenweanyị sitere n’ọnụ onye amụma kwuo sị: “Esiri M n’Ijipt kpọpụta Nwa M.” Ma mgbe Herọd nwụrụ, mụọ ozi nke Onyenweanyị gosiri Josef onwe ya na nrọ n’ljipt, wee gwa ya, sị: “Bilie, kpọrọ Nwa na nne laghachi n’ala Izrel, n’ihi na ndị chọrọ igbu ya anwụọla.” Josef wee kulie kpọrọ nwa na nne, lagachi n’ala Izrel. Mgbe Josef nụrụ na Akelos anọchiela anya Herọd bụ nna ya dịka eze Judia, egwu tụrụ ya ịga n’ebe ahụ. Ma Josef nwetara ịdọ aka na ntị na nrọ, nke mere o ji kwafee n’ọnụmara Galili. O jere biri n’obodo a na-akpọ Nazaret. Nke a abịa mezuo ihe ndị amụma kwuru, sị, “A ga-akpọ ya onye Nazaret.”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu