Emume Ncheta Jọn Dị asọ – Onye Apọstụl.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Jn: 1:1-4
-
Abụọma na azịza ya
Ps: 97: 1-2, 5-6, 11-12.
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaJn: 20:2-8
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Jn: 1:1-4
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Jọn nke mbụ
Anyị na-edere ụnụ banyere ihe ahụ nke dị site na mbido, nke anyị nụrụla, ma jirikwa anya anyị hụ, lekwasa ya anya ma metụkwa ya aka, ọ bụ ihe gbasara okwu nke ndụ. E mere ka ndụ ahụ pụta ihe. Anyị hụrụ ya ma na-agbakwa aka ebe. Anyị na-akọrọ ụnụ maka ndụ ebeebe, nke ya na Nna nọ na nke e mere ka ọ pụta ihè n’ebe anyị nọ. Ihe anyị hụrụla na nke anyị nụkwara, ka anyị na- akọrọ ụnụ, ka ụnụ soro anyị nwee mmekọ, nke anyị na Nna na Nwa ya bụ Jesu Kristi na-enwe. Anyị na-edere ụnụ akwụkwọ ozi nke a, ka ọñụ anyị zuo oke.
Okwu nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 97: 1-2, 5-6, 11-12.
Azịza Ñụrịanụ n’Onyenweanyị ụnụ bụ ndị eziomume.
1. Onyenweanyị bụ eze! Ka ụwa ñụrịba;
Ñụrịanụ, ala niile mmiri gbara gburugburu.
Urukpu na ọchịchịrị gbara ya okirikiri;
o jiri eziomume na ikpe nkwụmọtọ,
were tọọ ntọala oche eze ya.
Azịza Ñụrịanụ n’Onyenweanyị ụnụ bụ ndị eziomume.
2. Ugwu niile gbazere dịka mmanụ,
n’ihu Onyenweanyị nke ụwa niile.
Eluigwe na-ekwupụta eziomume ya,
mba niile na-ahụkwa otito ya.
Azịza Ñụrịanụ n’Onyenweanyị ụnụ bụ ndị eziomume.
3. Ihe na-achakwasị ndị na-akwụba aka ha ọtọ,
añụrị na-adịrị ndị obi ha dị ọcha.
Ñụrịanụ n’Onyerweanyị ụnụ bụ ndị eziomume,
tookwanụ aha ya dị nsọ.
Azịza Ñụrịanụ n’Onyenweanyị ụnụ bụ ndị eziomume.
MBEKU:
ALLELUIA ALLELUIA:
Anyị etoo gị, Chineke,
Anyị n’ekwupụta gị dịka Onyenweanyị dị otito,
ndị ụmụazụ na-aja gị mma.
ALLELUIA
OZIỌMA –Jn: 20:2-8
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
Ọ gbaara ọsọ bịakwute Saịmọn Pita na nwaazụ ahụ Jesu hụrụ n’anya sị ha, “Ha ebupụla Onyenweanyị n’ili, anyị amaghịkwa ebe ha dotere ya”. Pita na nwaazụ nke ọzọ ahụ wee pụọ gaa n’ili. Ha abụọ jiri ọsọ gaa, mana nwa azụ nke ọzọ gbalahụrụ Pita n’ọsọ wee buru ya ụzọ ruo n’ili. O hulatara, nyoo anya n’ime ili, hụ akwa ahụ ebe ha wụsara n’ala, mana ọ baghị n’me ili. Saịmọn Pita, onye na-eso ya n’azụ bịaruru, banye n’ime ili. Ọ hụrụ akwaozu ahụ ka ọ wụsara n’ala, ya na ịchafu nke e ji kechie ya isi. Ịchafu a na akwaọcha ahụ adịghị n’otu ebe, kama a pịara ya apịa dobe ya iche n’ebe ọzọ. Nwaazụ ọzọ ahụ, onye nke buru ụzọ bịaruo n’ili, banyekwara n’ime ili ahụ. Ọ hụrụ ma kwerekwa.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu