Ụka Ncheta Ọmụmụ Jesu Kristi – Ụka Ụtụtụ .
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Is: 52:7-10
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 97:1-6, Aịz. 3.
-
Ihe ọgụgụ nke abụọ
Hib: 1:1-6
- OziọmaJn: 1:1-18
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Is: 52:7-10
Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya
Lee ka ụkwụ onye butere Oziọma si maa mma n’elu ugwu; onye na-ekwusa udo: na-ewetakwa obi añụrị; na-ekwupụta nzọpụta, bịakwa na-agwa Zayọn sị: “Chineke gị bụ eze.” Gee ntị! Ndị nche gị eweliela olu ha elu na-etikọta mkpu ọñụ. Maka na ha ahụla Onyenweanyị ihu na ihu, ebe Ọ na-alọghachi na Zayọn. Ụnụ niile bụ ihe a lara n’iyi na Jerusalem, tikọtanụ mkpu ọñụ ọnụ; n’ihi na Onyenweanyị na-akasị ndị nke ya obi n’ịgbapụta Jerusalem. Onyenweanyị agbawala ogwe aka Ya dị nsọ ọtọ n’anya mba niile. Akụkụ ụwa niile ga-ahụ nzọpụta Chineke anyị.
Okwu nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 97:1-6, Aịz. 3.
Azịza: Akụkụ ụwa niile ahụla nzọpụta Chineke anyị.
1.Kweerenụ Onyenweanyị ukwe ọhụrụ n’ihi na ọ rụọla ọrụ ebube.
Aka nri Ya na ogwe aka Ya dị nsọ ewetala nzọpụta.
Azịza: Akụkụ ụwa niile ahụla nzọpụta Chineke anyị.
2. Onyenweanyị emeela ka a mata nzọpụta Ya.
O gosila ụwa niile ikpe nkwụmọtọ Ya.
O chetala ezi okwu na ịhụnanya O nwere maka ụlọ Izrel.
Azịza: Akụkụ ụwa niile ahụla nzọpụta Chineke anyị.
3. Akụkụ ụwa niile ahụla nzọpụta Chineke anyị.
Ụwa niile tierenụ Onyenweanyị mkpu ọñụ.
Kwupụtanụ na obi dị ụnụ mma.
Azịza: Akụkụ ụwa niile ahụla nzọpụta Chineke anyị.
4. Werenụ ụbọ akwara bụọrọ Onyenweanyị abụ ọma;
werenụ ụda egwu mara mma.
Fụọnụ opi ike, gbuọnụ ụja. Toonụ Onyenweanyị na Eze anyị.
Azịza: Akụkụ ụwa niile ahụla nzọpụta Chineke anyị.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ –Hib: 1:1-6
Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ozi e degaara ndị Hibru.
N’oge gara aga, Chineke gwara nna anyị ha okwu ugboro ugboro n’ụzọ dị iche iche, site n’ọnụ ndị amụma. Ma n’oge nke anyị, nke bụ mgbe oge nọ n’ọgwụgwụ ya, Ọ gwala anyị okwu site na Nwa ya, Onye O sitere na Ya mee ihe niile dị adị. Nwa Ya ahụ bụ Onye Ọ họpụtara ka O rite ihe niile n’ekpe. Ya bụ ìhè na-enwu bam bam nke ebube Chineke, bụrụkwa kpọm kwem onyinyo Chineke n’ihe niile O ji bụrụ Chukwu. Ike dị n’iwu O tiri ka ụwa ji kwụrụ ebe ọ kwụụrụ. Ugbu a, ebe ọ bụ na O bibiela mmerụ nke njọ, O gala were ọnọdụ Ya n’eluigwe, n’aka nri nke ebube eze Chineke. Ihe ọ pụtara ugbu a bụ na ọkwa e bugoro Ya akarịka nke e bugoro ndị Mmụọma, dịka aha a gụrụ Ya si karịa nke a gụrụ ndị Mmụọma. O nwebeghị mmụọma Chineke gwara: “Ị bụ Nwa M; taa ka M mụtara gị.” Ma ọ bụ: “Aga M abụrụ ya Nna; Ọ ga-abụkwara M Nwa.” Ọzọkwa, mgbe Ọ kpọtara dị ọkpara Ya n’ụwa, Ọ sịrị: “Ka ndị mmụọma niile nke Chineke kpọọrọnụ Ya isi ala.”
Okwu nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu
MBEKU
Alleluịa, Alleluịa:
Ụbọchị dị nsọ abịakwasịla anyị.
Mba niile! bịanụ sekpuoro Onyenweanyị;
n’ihi na taa, nnukwu ìhè achakwasala ụwa.
Alleluịa.
OZIỌMA –Jn: 1:1-18
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
Okwu ahụ dị adị na mbụ. Okwu ahụ na Chineke dị. Okwu ahụ bụkwa Chineke. Ya na Chineke dị adị n’isi mbido. Ihe niile si na Ya dịrị. Ọ dịghị ihe ọ bụla dị adị, nke na-esighị na Ya dịrị. Ihe niile dị adị, sitere na Ya dị ndụ. Ndụ ahụ bụ ìhè nke mmadụ. Ìhè nke na-acha n’ime itiri, nke itiri na-apụghị imenyụ. Ọ dị otu nwoke Chineke zitere, aha ya bụ Jọn. Ọ bịara ịgba akaebe; ịgbara Ìhè ahụ akaebe, ka mmadụ niile wee si na ya kwere. Ya onwe ya abụghị Ìhè ahụ, kama ọ bịara ịgbara Ìhè ahụ akaebe. Okwu ahụ bụ ezi Ìhè ahụ na-enye mmadụ niile ìhè. Ọ bịara n’ime ụwa. Ọ nọkwa anọ n’ime ụwa nke siri na Ya bido, ma ụwa amataghị Ya. Ọ bịakwutere ndị nke Ya, ma ndị nke Ya anabataghị Ya. Ma ndị niile nabatara Ya, ka O nyere ike ịbụ ụmụ Chineke; ndị niile kwere n’aha Ya, ndị ọmụmụ ha na-esiteghị n’ọbara mmadụ, ma ọ bụ n’ọchịchọ nke anụ ahụ, ma ọ bụ n’ọchịchọ nke mmadụ; kama o sitere na Chineke. Okwu e mere ahụ, O wee binyere anyị. Anyị hụrụ ebube Ya; nke bụ ebube ahụ O ji bụrụ Sọ otu Nwa nke Nna; nke jupụtara n’amara na eziokwu. Jọn bịara ka onye akaebe. O kwupụtara sị: “Lee Onye ahụ m kwuru sị: “Onye na-abịa na-azụ m akarịka m! N’ihi na O buru m ụzọ dịwa. N’ezie, ọ bụ n’uju afọ ọma Ya ka anyị niile siri nweta amara kwuru amara. Ebe ọ bụ na e nyere iwu site n’aka Mosis; Amara na ezi okwu si n’aka Jesu Kristi bịa. Ọ dịbeghị onye ọ bụla hụrụ Chineke anya. Ọ bụ naanị otu Nwa Ya, onye dịkarịrị nso n’obi Nna; Ọ bụ Ya mere ka anyị mara Nna.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu