Wenezde Izuụka nke Anọ n’oge Adventi
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
2Sam: 7:1-5, 8-11, 16
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 89: 2-3, 4-5. 27, 29
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk: 1:67-79
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –2Sam: 7:1-5, 8-11, 16
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ abụọ nke Samuel
Mgbe Yahweh nyere Devid ezumike n’ebe ndịiro gbara ya gburugburu nọ, Devid wee biri n’ụlọ ya. Devid sịrị onye amụma Natan, “Lee ugbu a, ebi m n’ụlọ osisi sida. Ma igbe Ọgbụgbandụ Chineke dọrọ n’ime ụlọikwu.” Natan zara ya sị: “Gaa mee ihe ọbụla dị gị n’uche n’ihi na Osebụrụwa nọnyeere gị.” Ma na-abalị ụbọchị ahụ, Yahweh ziri Natan sị, “Jee gwa odibo m bụ Devid, na m sị ya, ‘Ọ bụ gị ga-arụrụ m ụlọ ebe m ga ebi? Ya mere, jee gwa odibo m bụ Devid na mụ, bụ Chineke nke igwe ndịagha, sị ya, ‘Esiri m ebe Ị na-azụ atụrụ n’ọhịa kpọpụta gị, mekwaa ka Ị bụrụ onyendu ndị nke m bụ Izrel. Anọnyekwaara m gị ebe ọbụla I jere merikwaa ndịiro gị niile, n’ihu gị. Aga m emekwa ka aha gị dị ukwu dịka ndị aha ha kacha dị ukwu. Aga m ahọpụtara ndị nke m bụ Izrel otu ebe, kụọkwa ha dịka osisi n’ebe ahụ. Ha ga-ebikwa n’ebe ahụ na-enweghị nsogbu ọzọ; ndị obi ọjọọ agaghị akpagbukwa ha ka na mbụ, bido mgbe m họpụtaara ndị nke m Izrel ndị ikpe; aga m enye ha ezumike site n’aka ndịiro ha.Aga m eme ka Ị dị ukwu; aga m ewuru gị ụlọ. Ezinụụlọ gị na alaeze gị ga-adị ebeebe. Aga m akwụdosi ocheeze gị ike ebeebe.
Okwu nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 89: 2-3, 4-5. 27, 29
Azịza: Aga m eji ukwe kwupụta ịhụnaanya nke Onyenweanyị ebeebe ebeebe.
1. Aga m eji ukwe kwupụta ịhụnaanya nke Onyenweanyị ebeebe ebeebe.
Bido na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ,
aga m na-ekwupụta ntụkwasịobi gị.
N’ihina ịhụnaanya gị ga-adị ebeebe,
ikwesị ntụkwasịobi gị ga-akwụdosi ike dịka igwe.
Azịza: Aga m eji ukwe kwupụta ịhụnaanya nke Onyenweanyị ebeebe ebeebe.
2. “Mụ na onye m họọrọ agbala ndụ,
añụọrọla m Devid nwodibo m ịyị.
Aga m eme ka ọchịchị gị dị ebeebe,
Aga m emekwa ka ocheeze gị dịgide ruo na ndụdụgandụ niile.
Azịza: Aga m eji ukwe kwupụta ịhụnaanya nke Onyenweanyị ebeebe ebeebe.
3. Ọ ga-ebeku m sị, “Ị bụ nna m”,
Chineke m na onye enyemaka m,
Aga m ahụ ya n’anya ebeebe,
Ọgbụgbandụ mụ na ya ga-adị ọkpụ.
Azịza: Aga m eji ukwe kwupụta ịhụnaanya nke Onyenweanyị ebeebe ebeebe.
MBEKU
ALLELUIA ALLELUIA:
Bịa n’etiti anyị Ịmmanuel, gị bụ Chineke nọ n’etiti anyị,
gị bụ eze anyị, gị bụkwa onye ikpe anyị, zọpụta anyị
Onyenweanyị na Chineke anyị.
ALLELUIA.
OZIỌMA –Lk: 1:67-79
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Nna ya bụ Zekarịa jupụtara na Mmụọ Nsọ, bue amụma sị: “Ngọzi dịrị Dinwenụ Chineke nke Izrel makana ọ bịara leta ma zọpụtakwa ndị nke ya. O weliterela anyị onye nzọpụta site n’agbụrụ Devid, nwodibo ya; Otu o siri kwuo n’oge ochie, site n’ọnụ ndị amụma ya: Na a ga-azọpụta anyị site n’aka ndịiro anyị, na sitekwa na-aka ndị niile kpọrọ anị asị. Gosi ebere nke o kwere nnanna anyị ha na nkwa, bịa chetakwa ọgbụgbandụ ya dị nsọ. Ọ ñụụrụ nnanna anyị bụ Abraham iyi. Kwekwa nkwa na ya ga-azọpụta anyị na-aka ndịiro anyị. Ka anyị nwee ike na-ekpere ya n’atụghị egwu ọbụla, n’ịdị nsọ na eziomume n’ihu ya ụbọchị niile nke ndụ anyị. Ma gị bụ nwa, ka a ga-akpọ onye amụma nke onye kacha elu, N’ihina Ị ga-aga n’ihu Dinwenụ idoziri ya ụzọ ya niile. Ime ka ha nwee amamihe nke nzọpụta site na mgbaghara nke njọ ha. Site n’obi ebere nke Chineke anyị, ọ ga-eme ka anyanwụ ụtụtụ bịakwasa ndị nke ya; Inye ndị niile nọ n’ọchịchịrị na onyinyo nke ọnwụ ihe. Bịa duzie ụkwụ anyị n’ụzọ nke udo.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu