Monde Izuụka nke Atọ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
1 Sam: 1:24-28
-
Abụọma na azịza ya
1 Samuel 2:1.4-5.6-7. 8.
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk: 1:46-56
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –1 Sam: 1:24-28
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ mbụ nke Samuel
Mgbe Hana napụchara nwata ahụ ara, o kuuru ya, kpụrụ otu oke ehi gbara afọ atọ, burukwa otu akpa ntụ ọka na otu udu mmanya, jee n’ụlọnsọ Yahweh na Shilọ. Mgbe ha gbuchara oke ehi ahụ, ha kpọjeere Elaị nwata ahụ. Hana gwara Elaị sị, “Nnamukwu, ndeewo! Anwụla! ọ bụ m bụ nwaanyị ahụ kwụrụ n’ihu gị kpeere Yahweh ekpere n’oge gara aga. Ọ bụ nwa a ka m rịọrọ maka ya, Chineke wee nye m ihe m rịọrọ ya. Ya mere, ekuterelam ya Yahweh. Ụbọchị ndụ ya niile ọ ga-abụkwa nke Yahweh. Ha wee fee Yahweh ofufe ebe ahụ.
Okwu nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – 1 Samuel 2:1.4-5.6-7. 8.
Azịza: Obi m na-añụrị ọñụ nke ukwu n’Osebụrụwa.
1. Obi m na-añụrị ọñụ nke ukwu n’Osebụrụwa.
N’ihina o meela ka ike m dị elu!
Ugbu a ka m nwere ọnụ ịgwa ndịiro m okwu,
N’ihina ana m añụrị na nzọpụta ya.
Azịza: Obi m na-añụrị ọñụ nke ukwu n’Osebụrụwa.
2. A nyajiele ụta ndị bụ dike,
Ma e yiwela ndị adịghị ike ike, dịka ajị.
Ndị na-eriju afọ na mbu, na ejezi ọrụ ngo maka ihe oriri.
Ma ndị agụụ na-agụ na-eriju afọ ugbu a.
Nwaanyị aga amụtala ụmụ asaa,
Ebe nwaanyị ahụ mụjuru ụlọ gbazi aka nwa.
Azịza: Obi m na-añụrị ọñụ nke ukwu n’Osebụrụwa.
3. Yahweh na-eweta ọnwụ, na-eweta ndụ,
Ọ na-ezida ndị mmadụ n’ala mmụọ na-akpọlitekwa ha,
Yahweh na-eme ka ụfọdụ daa ogbenye,
na-emekwa ka ụfọdụ bụrụ ọgaranya.
Ụfọdụ ka ọ na-ebuda ala, ụfọdụ ka ọ na-ebulikwa elu.
Azịza: Obi m na-añụrị ọñụ nke ukwu n’Osebụrụwa.
4. Ọ na-esi na ntụ ekuli ndị ogbenye,
Ọ na-esi n’ebe a na-ekpofụ ahịhịa welite ndị nọ na mkpa,
Nye ha ọnọdụ n’etiti ụmụ ndịeze,
iji nye ha úgwu na nsọpụrụ.
Azịza: Obi m na-añụrị ọñụ nke ukwu n’Osebụrụwa.
MBEKU
ALLELUIA ALLELUIA:
Bịa, eze nke ụwa niile,
isi iyi ịdị n’otu na okwukwe nke nzukọ gị,
zọpụta mmadụ niile bụ ọrụ aka gị.
ALLELUIA.
OZIỌMA – Lk: 1:46-56
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Marịa kwuru sị: “Mkpụrụobi m na-eto Dinwenụ m Mmụọ m na-añụrị na Chukwu onye nzọpụta m. Maka na o leele anya n’umeala odibo nwaanyị ya, site taata ndụdụgandụ niile ga na-akpọ m onye ngọzi; Maka na onye dị ike emeerela m nnukwu ihe, aha ya dị nsọ. Obi ebere ya si na ndụdụgandụ ruo na ndụdụgandụ maka ndị na-atụrụ ya egwu, O gosila ike aka ya, ọ chụsachaala ndị nganga dị n’obi; O sila n’ocheeze budaa ndị ukwu, bulie ndị umeala. O nyejuola ndị agụụ na- agụ afọ hapụ ndị ọgaranya ka ha gbara aka laa. O nyerela Izrel nwodibo ya aka, na ncheta ebere ya, Dịka o si gwa nna anyị Abraham na mkpụrụ ya ebeebe.” Marịa nọnyeere Elizabet ihe dị ka ọnwa atọ tupu ọ lọghachi n’ụlọ ya.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu