Ụka nke Anọ N’oge Olileanya Onye Nzọpụta
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Is: 7:10-14
-
Abụọma na azịza ya
Ps: 23:1-6. Az. 7.10
-
Ihe ọgụgụ nke abụọ
Rom: 1:1-7
- OziọmaMatt: 1:18-25
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Is: 7:10-14
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ onye Amụma Aịzaya
Onyenweanyị gwara Ahaz okwu ọzọ sị: “Rịọ Osebụrụwa Chineke ihe ịriịbaama maka onwe gị. I nwere ike ịrịọ ka ihe ahụ si n’ebe miri emi n’ala mmụọ bịara gị; ma ọ bụ n’ebe dị oke elu nke igwe. Mana Ahaz zara ya sị: “Mba! Agaghị m anwa Onyenwe m ọnwụnwa.” Onyenweanyị asịkwa ya: ụlọ Devid, ngwa gee ntị ugbu a: “Ọ bụ na o zubeghịrị gị ịkpasu ndị mmadụ iwe? O ruokwala nke ịkpasu Chineke m iwe? N’ihi ya, ugbu a, Onyenweanyị ga-eji aka Ya enye gị ihe ịrịbaama. Lee ihe ịrịbaama ahụ: Nwagbọghọ ahụ dị ime. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-amụkwa nwa nwoke. Aha a ga-akpọ Ya bụ Ịmmanuel, nke pụtara “Chineke nọnyeere anyị.”
Okwu nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA –Ps: 23:1-6. Az. 7.10
Azịza: Ka Onyenweanyị bata. Ọ bụ eze nke otito.
1. Onyenweanyị nwe ụwa na ihe niile juru n’ime ya;
Ụwa na mmadụ niile bi n’ime ya.
Ọ bụ Ya guzowere ya n’elu osimiri.
O mere ka o guzosie ike n’elu mmiri.
Azịza: Ka Onyenweanyị bata. Ọ bụ eze nke otito.
2. Onye ga-agbago n’ugwu nke Onyenweanyị?
Onye ga-eguzo n’ebe nsọ Ya?
Onye aka ya kwụ ọtọ, onye obi ya dị ọcha.
Onye anaghị achọ ihe na-abaghị uru.
Azịza: Ka Onyenweanyị bata. Ọ bụ eze nke otito.
3. Ọ ga-anata ngọzi n’aka Onyenweanyị.
Natakwa ụgwọ n’aka Chineke onye nzọpụta ya.
Ọ bụ ụdị mmadụ ndị a na-achọ Ya.
Na-achọnụ ihu Chineke nke Jekọb.
Azịza: Ka Onyenweanyị bata. Ọ bụ eze nke otito.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ –Rom: 1:1-7
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Akwụkwọozi nke Pọl dị asọ degaara ndị Rom
Pọl, odibo Kristi Jesu, onye Chineke kpọrọ ịbụ onye ozi, na onye O wepụtara iche ikwusa Oziọma, na-edetara ụnụ akwụkwọ ozi nke a. Chineke kwere nkwa na mgbe ochie izi anyị Ozi ọma nke a, site n’ọnụ ndị amụma Ya, dịka e dere n’Akwụkwọ Nsọ. Ozi ọma nke a bụ maka Nwa Ya bụ Onyenweanyị Jesu Kristi. A bịa n’ịghọ mmadụ ọ ghọrọ, a mụrụ Ya n’agbụrụ Devid. A bịa n’ịbụ chi dị nsọ nke ọ bụ, Chineke jiri ike ukwu gosị na ọ bụ Nwa Ya, site n’ime ka O si n’ọnwụ bilie. Site n’aka Ya, Chineke nyere m amara ịbụ onye ozi n’ihi Kristi, ka m wee mee ka mba niile kwere na Chineke, na-añakwa Ya ntị. Ụnụ ndị bi na Rom, ndị a kpọrọ ịbụ ndị nke Jesu Kristi, sokwa na ndị a niile m ga-eme ka ha kwere na Chineke, ñakwaa Ya ntị. Ya mere, ana m edetara ụnụ niile ndị bi na Rom, akwụkwọ ozi, ụnụ bụ ndị Chineke hụrụ n’anya, na ndị Ọ kpọrọ ịbụ ndị nsọ. Amara dịrị ụnụ, ya na udo nke si n’aka Chineke Nna na nke Onyenweanyị Jesu Kristi.
Okwu nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu
MBEKU:
Aleluya, aleluya!
Nwagbọghọ ga-atụrụ ime n’amaghị nwoke,
bịakwa mụta nwa nwoke.
Aha a ga-akpọ ya bụ Ịmmanuel: ihe ọ pụtara bụ: Chineke nọnyeere anyị.
Aleluya!
OZIỌMA –Matt: 1:18-25
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Otu a ka e si mụọ Jesu Kristi: Mgbe ahụ ikwu na ibe ekwekọrịtala na Josef ga-alụ Marịa nne Jesu. Ma mgbe ha na-ebikọbeghị, a hụrụ na Marịa dị ime site n’ike nke Mmụọ Nsọ. Ma ebe Josef di ya, bụ onye ezi omume, ọ chọghị ịkpọpụtara ya ọha, kama o zubere ịchụ ya na nzuzo. Ma mgbe ọ na-atụgharị ihe ndị a n’obi ya, mmụọ ozi nke Onyenweanyị gosịrị ya onwe ya na nrọ, sị: “Josef, nwa Devid, atụla egwu ịkpọrọ Marịa nwunye gị n’ihi na Nwa ọ dị ime ya sitere n’ike nke Mmụọ Nsọ, Ọ ga-amụ nwa nwoke. Ị ga-akpọkwa Ya Jesu, n’ihi na Ọ ga-azọpụta ndị nke Ya na mmehie ha niile.” Ihe ndị a niile mere ka e wee mezuo okwu nke Onyenweanyị siri n’ọnụ onye amụma kwuo, sị: “Lee. nwagbọghọ na-amaghị nwoke ga-adị ime, mụta nwa nwoke. Aha a ga-akpọ Ya bụ Ịmmanuel,” nke isi ya bụ, “Chineke nọnyeere anyị.” Ya mere, mgbe Josef tetara n’ụra, o mere dịka mmụọ ozi nke Onyenweanyị gwara ya, wee kpọrọ Marịa nwunye ya. Ma ọ bakwughị ya ruo mgbe ọ mụchara nwa. Josef wee kpọọ aha ya Jesu.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu