Satọde Izuụka nke Atọ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Is: 7:10-14
-
Abụọma na azịza ya
Ps: 24: 1-2, 3-4, 5-6.
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk: 1:26-38
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – Is: 7:10-14
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ onye amụma Aịzaya
Yahweh gwakwara Ahaz ọzọ sị ya, “Rịọ Yahweh Chineke gị akara ọbụla; ọ sọkwa, ya bụrụ nke si n’ala mmụọ ma ọ bụ nke si n’eluigwe.” Mana Ahaz kwuru sị, “Mba, agaghị m arịọ ihe ọbụla agaghịkwa m anwale Yahweh. O wee sị, “Nụrụnụ nke a ụnụ ụlọ nke Devid niile! Ọ bụụrụ ụnụ obere ihe na ụnụ na-eme ndị mmadụ ka ike gwụ ha, ụnụ ji bịa ime Chineke m otu aka ahụ? N’ihi nke a, Yahweh n’onwe ya ga-enye gị akara. Lee, otu nwaagbọghọ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime mụta nwa nwoke; aha ọ ga-akpọ ya bụ Immanuel.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 24: 1-2, 3-4, 5-6.
Azịza: Ka Dinwenụ bata, ọ bụ ya bụ eze nke otito.
1. Chineke nwe ụwa na ihe niile dị na ya,
ụwa na ndị niile bi n’ime ya;
ọ bụ ya wukwasara ya n’elu mmiri
Ọ bụ ya wuru ya n’elu osimmiri.
Azịza: Ka Dinwenụ bata, ọ bụ ya bụ eze nke otito.
2. Onye nwere ike ịrịgoro n’ugwu nke Onyenweanyị?
Onye nwere ike ịnọ n’ebe ya dị nsọ?
Onye aka ya na obi ya dị ọcha
onye anaghị etinye obi ya n’ihe efu.
Azịza: Ka Dinwenụ bata, ọ bụ ya bụ eze nke otito.
3. Onye dị otu a ga-anata ngọzi n’aka Onyenweanyị,
Ọ ga-anatakwa eziomume n’aka Chineke onye nzọpụta ya.
Ọ bụ ụdị ndị dị otu a na-achọ Onyenweanyị.
ndị na-achọ ihu Chineke nke Jekọb!
Azịza: Ka Dinwenụ bata, ọ bụ ya bụ eze nke otito.
MBEKU:
ALLELUIA ALLELUIA:
Bịa igodo nke Devid, meeghee ọnụ ụzọ nke Onyenweanyị, tọghapụ ndị nọ na mkpọrọ nke isii.
ALLELUIA.
OZIỌMA –Lk: 1:26-38
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị nsọ nke Luk dere.
N’ọnwa nke isii, Chineke zigara Mmụọọma Gebrel ka ọ gaa n’obodo Galili a na-akpọ Nazaret, ka ọ gakwuru otu nwagbọghọ na-amaghị nwoke, onye ikwunibe ya kwekọrịtara na otu nwoke aha ya bụ Josef, nke si n’agbụrụ Devid, ga-alụ. Aha nwagbọghọ ahụ bụ Marịa. Mmụọọma ahụ bịakwutere Marịa sị ya, “Ekele, “I jupụtara na grasịa, Osebụrụwa nọnyere gị.” Obi lọrọ ya mmiri nke ukwuu n’ụdị ekele a, nke mere na ọ malitere ịtụle n’uche ya ihe ụdị a pụtara. Mmụọọma ahụ sịrị ya, “Atụla egwu, Marịa, n’ihina Ị natakwa ngọzi na-aka Chineke. Lee, Ị ga-adị ime, mụta nwa nwoke; aha Ị ga-akpọ ya bụ Jesu. ọ ga-adị ukwuu, a ga-akpọkwa ya nwa onye kacha elu. Dinwenụ Chineke ga-enye ya ocheeze nna ya Devid. Ọ ga-achị ezinụụlọ Jekọb ebeebe: alaeze ya agaghị enwe ọgwụgwụ. Marịa jụrụ Mmụọọma ahụ sị, “Olee otu nke a ga-esi mee ebe ọ bụ na amaghị m nwoke. “Ma Mmụọọma ahụ zara ya sị, “Mmụọ Nsọ ga-abịakwasa gị; ike nke onye kacha elu ga-ekpuchi gị. N’ihi nke a, a ga-akpọ nwa ahụ Ị ga-amụ onye nsọ, nwa Chineke. Lee, Elizabet onye ikwu gị, onye ndị mmadụ na-akpọ nwaanyị aga, atụrụla ime n’agadi ya; ugbu a ọdị ime ọnwa isii. N’ihi na ebe Chineke nọ, o nweghị ihe nyịrị omume.” Marịa kwuru sị, “Lee, abụ m odibo nwaanyị nke Osebụrụwa, ka o reere m ka I siri kwu.” Mmụọọma ahụ wee si n’ebe ọ nọ pụọ.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu