Fraịde Izuụka nke Atọ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Jgs 13:2-7, 24-25
-
Abụọma na azịza ya
Ps 71, 3-4. 5-6. 16-17.
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk: 1:5-25
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Jgs 13:2-7, 24-25
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ndịikpe
Na mgbe ahụ, e nweere onye obodo Zora, aha ya bụ Manoa. Nwoke ahụ bụkwa onye agbụrụ Dan. Nwụnye ya bụ nwaanyị aga. Mana mmụọọma Osebụrụwa wee bịakwute nwaanyị ahụ sị ya, “Ị bụ nwaanyị aga, na-enweghị nwa. Ma n’oge a, Ị ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ya mere, lezie anya, ka ị ghara ịñụ mmanya ọkụ ọbụla, ma ọ bụ ihe ọñụñụ ọbụla na-aba n’anya, ma ọ bụ iri ihe ọbụla rụrụ arụ. Mgbe ị mụtara nwa nwoke ahụ, agụba ọbụla agaghị aga ya n’isi. N’ihi na site n’ụbọchị a mụrụ ya, a ga-edoro ya Chineke nsọ ịbụ onye Nazịraịt. Ọ ga-amalitekwa ọrụ ịnapụta ndị Izrel na-aka ndị Filistia. Nwaanyị ahụ wee gaa, gwa di ya sị, “Onye nke Chineke bịakwutere m. Ọ dịka mmụọọma Chineke, na-atụ egwu. Ajụghị m ya ebe o siri bịa, Ọ gwaghịkwa m aha ya. Mana ọ gwara m na m ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ọ gwakwara m ka m ghara ịñụ mmanya ọkụ ọbụla, ma ọ bụ rie ihe ọbụla rụrụ arụ. N’ihi na a ga-edoro Chineke nwa ahụ nsọ na ndụ ya niile.” Nwaanyị ahụ mụtara nwa nwoke, kpọọ aha ya Samsịn. Nwata ahụ tolitere. Yahweh gọzikwara ya. Mmụọ nke Yahweh wee bido ịkwalite ike Samsịn n’oge ọ nọ na-aghata Zora na Eshtaol, n’ebe obibi agbụrụ Dan.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 71, 3-4. 5-6. 16-17.
Azịza: Ọnụ m jupụtara n’otito nke gị ogologo ụbọchị niile.
1. Bụrụ okwute nke mgbaba m,
mgbidi aja nke ga-azọpụta m!
n’ihina Ị bụ okwute m, nchedo m,
Chineke m, zọpụta m n’aka ndị ajọ mmadụ.
Azịza: Ọnụ m jupụtara n’otito nke gị ogologo ụbọchị niile.
2. N’ihi na sọ gị Onyenweanyị bụ nchekwube m,
Onyenweanyị, echekwubere m na gị bido na mgbe m dị n’okorobị.
Atụkwasara m gị obi bido na mgbe a mụrụ m,
Ị bụrịị oke nke m site n’afọ nne m
Ọ bụ gị ka m na-eto mgbe niile.
Azịza: Ọnụ m jupụtara n’otito nke gị ogologo ụbọchị niile.
3. Aga m abịa n’ike nke Onyenweanyị,
wee cheta ikpe nkwụmọtọ gị, sọọsọ nke gị.
O Chineke, Ị kụziiri m bido na nwata m,
aga m na-ekwupụta ọrụ ebube gị.
Azịza: Ọnụ m jupụtara n’otito nke gị ogologo ụbọchị niile.
MBEKU:
ALLELUIA ALLELUIA:
Bịa igodo nke Devid, mmeghe ọnụ ụzọ alaeze gị dị ebeebe,
mee ka ndị nọ na mkpọrọ nke ọchịchịrị nwere onwe ha.
ALLELUIA.
OZIỌMA –Lk: 1:5-25
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
N’oge eze Herọd na-achị ala Judia niile, e nwere otu onye nchụaja aha ya bụ Zekarịa. O so n’otu ndị ojeozi nke Abija. O nwere nwunye aha ya bụ Elizabet, onye si n’agbụrụ Erọn, onyeisi nchụaja. Di na nwunye a bụ ndị eziomume n’ihu Chineke. Ha na-edobe iwu niile na ụkpụrụ niile nke Onyenweanyị, n’enweghị ntụpọ. Ma ha amụtaghị nwa, n’ihi na Elizabet bụ nwaanyị aga. Ya na di ya emekwala agadi. Mgbe Zekarịa nọ na-eje ozi n’ihu Chineke oge ndị otu ya ketara ịga ozi, ka usoro omenala ndị nchụaja si dị, ọ manyere Zekarịa ịbanye ebe nchụaja dị n’ụlọnsọ nke Chineke kpọọ mgbaisiọma ọkụ. Ọha ndị Juu niile nọ n’ezi na-ekpe ekpere n’oge aja mgbaisiọma ahụ. N’ebe ahụ ka mmụọọma nke Osebụrụwa bịakwutere ya, guzoro n’aka nri nke ekwuaja mgbaisiọma ahụ. Mgbe Zekarịa hụrụ ya, obi mmapụ na ụjọ jidere ya. Ma mmụọọma ahụ sịrị ya, Atụla egwu, Zekarịa n’ihi na a nụla ekpere gị; Elizabet nwunye gị ga-amụtara gị nwa nwoke. Ị ga-akpọkwa ya Jọn. Ị ga-enwe ọñụ na obi ụtọ, Ọtụtụ mmadụ ga-enwe añụrị n’ọmụmụ ya; N’ihina ọ ga-abụ onye dị ukwu n’ihu Chineke. Ọ gagị añụ mmanya ọbụla. Ma ọ bụ ihe ọñụñụ ọbụla na-egbu egbu. Ọ ga-ejupụtakwa na Mmụọ Nsọ ọ bụladị site n’afọ nne ya. Ọ ga-eme ka ọtụtụ ụmụ Izrel lọghachi azụ n’ebe Chukwu ha nọ. Ọ ga-aga ịkwadoro Dinwenụ ụzọ. N’ụdị mmụọ na ike nke onye amụma Elaija, ka ọ ga-eji tụgharịa obi ndị bụ nna n’ebe ụmụ ha nọ. Meekwa ka ndị isi ike tụgharịa obi lekwasị anya n’amamihe nke ndị eziomume, bịa kwadobere Chineke ndị nke ya.” Zekarịa jụrụ Mmụọọma ahụ sị, “Olee otu m ga-esi mata nke a n’ihi na aghọọla m agadi. Nwunye m akakwala nka?” Mmụọọma ahụ zara ya sị, Abụ m Gebrel, onye na-akwụ n’ihu Chineke. E zitere m ka m gwa gị okwu ma wetara gị oziọma nke a. Lee, Ị ga-ada ogbi, ị gaghi ekwu okwu ruo ụbọchị ihe ndị a ga-emezu, n’ihina I kwenyeghị n’okwu m, nke ga-emezu mgbe oge ha ruru.” Ndị mmadụ nọ n’ezi na-eche Zekarịa, ọ gbakwara ha gharịị ihe kpatara o ji nọọ ọdụ ịpụta n’ikwu ụlọnsọ. Mgbe ọ pụtara, o nweghị ike ịgwa ha okwu ọbụla. Ha matara na ọ hụrụ ọhụ n’ime ikwu ụlọnsọ, o jiri ife aka na-agwa ha okwu n’ihina ọ bụzi onye ogbi. Mgbe ụbọchị ofufe ya zuru, ọ lara n’ụlọ ya. Ka ụbọchị ndị a gachara, Elizabet nwunye ya tụụrụ ime. O zoro onwe ya n’ime ụlọ ọnwa ise; na-ekwu n’obi ya sị, “Ọ bụ otu a ka Dinwenụ si meere m ihe ọma, n’ụbọchị o ji lee m anya ebere, iwepụrụ m ihere n’etiti mmadụ.”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu