Tọọzde Izu Uka nke Ato N' Oge Adventi
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Jer: 23:5-8
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 72, 1. 12-13. 18-19.
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMatt: 1:18-24
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Jer: 23:5-8
Ihe ọgụgụ ewetara n’akwụkwọ onye amụma Jeremaya
“Lee ụbọchị ahụ adịla nso, Yahweh na-ekwu, oge m ga-akpalitere Devid Alaka nke eziomume, onye ga-achị ọchịchị ka eze, marakwa ihe, ma na ekpekwa ikpe nkwụmọtọ na eziomume n’ala ahụ. N’ụbọchị ahụ Juda ga-enwe nzọpụta, Izrel ga ebikwa n’udo. Nke a bụ aha a ga-akpọ ya: Yahweh bụ onye eziomume anyị’ “Lee, ụbọchị ahụ na-abịa, Yahweh na-ekwu, oge ndị mmadụ agaghịkwa añụ iyi na-asị, ‘N’aha nke Yahweh onye gbapụtara ndị Izrel n’obodo ljipt, Kama ha ga na-asị: ‘N’aha nke Yahweh dị ndụ, onye siri na mba ugwu, na mba dị iche-iche nke ụwa, ebe a dọgachara ndị nke ya n’agha kpọlata ha. Mgbe ahụ, ha ga-ebi n’ala nke ha”.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 72, 1. 12-13. 18-19.
Azịza: N’oge ya eziomume ga-achawapụta, udo ga-adịkwa ruo na njedebe ụwa.
1. Nye eze ikpe nkwụmọtọ gị, O Chineke,
nyekwa nwa eze eziomume nke gị,
ka o were nwee ike ịchị ndị nke gị n’ụzọ ziri ezi,
nyekwa ndị ogbenye ikpe ziri ezi.
Azịza: N’oge ya eziomume ga-achawapụta, udo ga-adịkwa ruo na njedebe ụwa.
2. Ọ ga-atọhapụ onye ogbenye kpọkuru ya,
na ndị niile chọrọ enyemaka ya.
Ọ ga emere ndị ogbenye na ndị esighị ike ebere,
na-azọkwa ndụ ndị nọ na mkpa.
Azịza: N’oge ya eziomume ga-achawapụta, udo ga-adịkwa ruo na njedebe ụwa.
3. Ngọzi dịrị Onyenweanyị, Chineke nke Izrel
Onye na-arụ ọrụ ebube ndị a
Ngọzi dịrị aha ya dị otito ebeebe
ka ụwa niile juputa n’otito ya! Amen.
Azịza: N’oge ya eziomume ga-achawapụta, udo ga-adịkwa ruo na njedebe ụwa.
MBEKU:
ALLELUỊA ALLELUỊA
Bịanụ ndị ndu ochie nke Izrel,
ndị nyere iwu Moses na Sịnaị, zọpụta anyị n’ike gị.
ALLELUỊA.
OZIỌMA –Matt: 1:18-24
Ihe ọgụgụ ewetara n’oziọma dị asọ nke Matiu dere.
Otu a ka esiri mụọ Jesu Kristi: Mgbe ndị ikwunibe kwekoritara na Josef ga-alụ Marịa nne Jesu, a hụrụ na Marịa dị ime site ma mmụọ Nsọ tupu ha ebikọọ ọnụ. Mana di ya bụ Josef, bụ onye eziomume, ọ chọghị imenye ya ihere kama o kpebiri ịchụ ya na nzuzo. Mgbe ọ na-atule ihe ndị a n’obi ya, mmụọọma nke Onyenweanyị bịakwutere ya na nrọ, sị ya, “Josef, nwa Devid atụla egwu ịkpọrọ Marịa nwunye gị, n’ihi na nwa ọ dị ime ya sitere n’ike nke Mmụọ Nsọ, Ọ ga-amụ nwa nwoke, Ị ga-agụ ya Jesu, n’ihi na ọ ga-azọpụta ndị nke ya na njọ ha niile.” Ihe niile ndị a mere iji mejupụta ihe Yahweh kwuru site n’olu onye amụma sị: “Lee otu nwaagbọghọ na-amaghị nwoke ga-adị ime, mụta nwa nwoke. A ga-agụ ya Immanel” (nke pụtara Chineke nọnyere anyị). Ya mere, mgbe Josef tetara n’ụra, o mere dịka mmụọọma nke Onyenweanyị gwara ya, were kpọrọ Marịa nwunye ya. Ha enweghị mmekọ Di na Nwunye ọbụla, o wee mụta nwa nwoke. Josef agụọ ya Jesu.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu