Wenezde N'Izu Uka nke Ato N'Oge Adventi
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Gn: 49:2, 8-10
-
Abụọma na azịza ya
Ps: 72: 1-2, 3-4, 7-8, 17.
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMatt: 1:1-17
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Gn: 49:2, 8-10
Ihe ọgụgụ ewetara na akwụkwọ Jenesis
Jekọb kpọrọ ụmụ ya, sị ha, “Gbakọtanụ ọnụ ka m gwa ụnụ ihe kwụ eche ụnụ n’ọdịniihu. Nọruwenụ m okirikiri ụmụ Jekọb, ka ụnụ gee nna ụnụ Izrel ntị. Juda, ụmụnne gị ga-eto gị; aka gị ka Ị ga-eji dọgbuo ndị iro gi niile. Ụmụnna gị ga asọpụrụ gị. Juda, ị bụ nwa ọdụm. Site n’igbu anụ oriri, nwa m, ị gbagolitela. O hulatara ala; o dina na-ala ka ọdụm, dịka nne ọdụm; kedụ onye nwere ike imesu ya? Mkpara ọchịchị agaghị apụ na Juda. Ụmụụmụ ya ga na-achị mgbe niile.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 72: 1-2, 3-4, 7-8, 17.
Azịza: N’oge ya eziomume ga-achawapụta, udo ga-adịkwa ruo na njedebe ụwa.
1. Nye eze ikpe nkwụmọtọ gị, O Chineke,
nyekwa nwa eze eziomume nke gị,
ka o were nwee ike ịchị ndị nke gị n’ụzọ ziri ezi,
nyekwa ndị ogbenye ikpe ziri ezi.
Azịza: N’oge ya eziomume ga-achawapụta, udo ga-adịkwa ruo na njedebe ụwa.
2. Ka ugwu ukwu na ugwu nta niile
wetara ndị nke gị ozi udo
N’ụzọ ziri ezi, ọ ga-azọpụta ụmụ ndị ogbenye
zọkwaa ụmụ ndị nọ na mkpa.
Azịza: N’oge ya eziomume ga-achawapụta, udo ga-adịkwa ruo na njedebe ụwa.
3. N’oge ya eziomume ga-achawapụta,
udo ga-adịkwa ruo na njedebe ụwa,
Alaeze ya ga-esi n’osimiri ruo n’osimiri,
bido na mmiri ruo n’isi ngwụcha nke ụwa.
Azịza: N’oge ya eziomume ga-achawapụta, udo ga-adịkwa ruo na njedebe ụwa.
4. Ngọzi dịrị aha ya ebeebe,
ka ọ dịgide dịka anyanwụ,
ka agbụrụ niile dị n’ụwa nweta ngọzi na ya,
ka mba niile kpọọ ya onye dị ngozi.
Azịza: N’oge ya eziomume ga-achawapụta, udo ga-adịkwa ruo na njedebe ụwa.
MBEKU:
ALLELUỊA ALLELUỊA :
Bịa, amamihe nke Chineke anyị kachasị elu,
iji ike n’ịhụnaanya n’echekwaba ihe niile i kere,
kụziere anyị ka anyị n’aga ije n’ụzọ nke amamihe gị.
ALLELUỊA.
OZIỌMA –Matt: 1:1-17
Ihe ọgụgụ ewetara n’oziọma dị asọ nke Matiu dere.
Nke a bụ usoro agbụrụ Jesu Kristi, nwa Devid onye si n’agbụrụ Abraham. Abraham mụrụ Aịzik, Aịzik amụta Jekọb, Jekọb wee mụta Juda na umunne ya. Juda mụtara Perez na Zera ndị nne ha bụ Tama, Perez amụta Hezrọn; Hezrọn wee mụta Ram, Ram mụtara Aminadab, Aminadab amụta Nashọn, Nashọn wee mụta Salmọn. Salmọn mụtara Boaz onye nne ya bụ Rahab, Boaz amụta Obed onye nne ya bụ Rut, Obed wee mụta Jese, onye bụ nna eze Devid. Devid mụtara Solomọn site n’aka nwunye Uria. Solomọn mụtara Rehoboam, Rehoboam amụta Abija, Abija wee mụta Asa, Asa mụtara Jehoshafat, Jehoshafat amụta Joram, Joram amụta Uzia. Uzia mụtara Jotam, Jotam amụta Ahaz, Ahaz wee mụta Hezekaya, Hezekaya mụtara Manase, Manase amụta Emọn, Emọn wee mụta Josaya, onye nke mụtara Jekọnaya na ụmụnne ya, n’oge a dọkpụrụ ụmụ Izrel n’agha jee Babilọn. Mgbe a dọtachara ụmụ Izrel n’agha jee Babilọn, Jekọnaya mụtara Shealtiel, Shealtiel wee mụta Zerubabel, Zerubabel mụtara Abiud, Abiud amụta Eliakim, Eliakim wee mụta Azọ, Azọ mụtara Zadọk, Zadọk amụta Akim, Akim wee mụta Eliud, Eliud mụtara Elieza, Elieza amụta Matan, Matan wee mụta Jekọb. Jekọb mụtara Josef di Marịa bụ nne Jesu, onye a na-akpọ Kristi. Ya mere ọgbọ niile nke ụmụ Izrel site n’Abraham ruo na Devid dị ọgbọ iri na anọ. Site n’oge nke Devid ruo n’oge a dọkpụrụ ụmụ Izrel n’agha Babilọn ruo ọmụmụ Kristi dị ọgbọ iri na anọ.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu