Tuezde Izuụka nke Atọ n’Oge Adventi
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Zep:3:1-2, 9-13
-
Abụọma na azịza ya
Ps: 34:2-3. 6-7. 17-18. 19-23.
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMatt: 21:28-32
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ – Zep:3:1-2, 9-13
Ihe Ọgụgụ ewetara n’akwụkwọ Onye Amụma Zefanaya
Azị gbaa gị bụ onye nnupụisi rụkwara arụ, obodo mmegbu! Ọ naghị ege ntị n’olu ọbụla, nke ọ na-anabata ntụzi aka ọbụla. Ọ naghị atụkwasa obi na Yahweh, nke ọ na-anọketa Chukwu ya nso. Aga m agbanwe okwu ndị mmadụ niile ka ọ bụrụ ihe dị ọcha ka ha niile wee na-akpọku aha nke Yahweh, ma werekwa otu obi fee ya. Site n’ofe osimiri Etiopia ndị na-akpọku m, bụ ada ndị nke m gbasasịrị agbasasị, ga-ebute ihe onyinye m. N’ụbọchị ahụ, agaghị emenye ụnụ ihere n’ihi omume ụnụ, nke ụnụ jiri nupụrụ m isi; n’ihi na aga m esite n’etiti ụnụ wezuga ndị na-añụrị ọñụ na mpako ha, ụnụ agaghị enwe ọnụ ọjọọ n’ugwu nke m dị nsọ. N’ihi na aga m ahapụ n’etiti ụnụ ndị dị nwayọọ ma dịkwa umeala n’obi. Ha ga-achọ nchedo n’aha nke Yahweh, bụ ndị a hapụrụ n’Izrel; ha agaghị emehie ma ọ bụ kwuo ụgha, nke a na-ahụ n’ọnụ ha ire nduhie. Ma ha ga-akpa nri zuokwa ike, o nweghị onye ga-emenye ha egwu.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 34:2-3. 6-7. 17-18. 19-23.
Azịza: OnyenweanOnyenweayị na-anụ mkpu akwa nwogbenye.
1. Aga m eto Onyenweanyị oge niile,
Otitio Ya ga-adị n’egbugbere ọnụ m mgbe ọbụla
Mkpụrụobi m na-egorị n’Onyenweanyị,
ka ndị umeala nụrụ ma ñụrịa.
Azịza: OnyenweanOnyenweayị na-anụ mkpu akwa nwogbenye.
2. Ihu ọbụla chere n’ebe Onyenweanyị nọ na-amụke amụke,
Ihere anaghị eme ya ma ọlị.
Onyenweanyị na-anụ mkpu akwa nwogbenye
Ọ na-enyekwara ya aka na nsogbu ya niile.
Azịza: OnyenweanOnyenweayị na-anụ mkpu akwa nwogbenye.
3. Mana Onyenweanyị na-agbarụ ihu n’ebe ndị ajọomume nọ,
Ọ na-eme ka a ghara ichetakwa ha n’ụwa.
Ndị eziomume kpọkuru Onyenweanyị, Ọ zara ha,
wee zọpụta ha na nsogbu ha niile.
Azịza: OnyenweanOnyenweayị na-anụ mkpu akwa nwogbenye.
4. Onyenweanyị na-anọ ndị obi loghara elogha nso,
na-enyere ndị dara mba na mmụọ aka.
Onyenweanyị na-azọpụta ndụ ndị odibo ya,
ndị niile gbabara na ya agaghị akwụ ụgwọ ọbụla.
Azịza: OnyenweanOnyenweayị na-anụ mkpu akwa nwogbenye.
MBEKU:
ALLELUỊA ALLELUỊA:
Bịa O Onyenweanyị, atụfula oge, gbaghara njọ ndị nke gị.
ALLELUỊA.
OZIỌMA –Matt: 21:28-32
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.
Jesu gwara ndịisi nchụaja na ndị okenye ndị Juu sịọ: “Gịnị ka ụnụ chere maka otu nwoke mụtara ụmụ abụọ. Ọ gwara nke mbụ sị, “Nwa m gaa ọrụ n’ugbo vaịn m taa. Ma ọ zara ya sị, “Agaghị m aga.” E mechaa o chegharịa gaa ọrụ ahụ. Nwoke ahụ gakwuru nwa ya nke abụọ gwakwa ya otu ihe ahụ, ma ọ zara ya sị, “Nna m aga m aga.” Mana ọ gaghị. N’ime ụmụ abụọ ndị a olee nke mere uche nke nna ya? Jọn onye na-eme mmirichukwu bịara igosị ụnụ ụzọ eziomume. Ụnụ ekwenyeghị na ya ma ndị ọnaụtụ na ndị akwụna kwenyere na ya. Ọ bụladị mgbe ụnụ hụrụ nke a, ụnụ emechaghị chegharịa kwere na ya.”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu