Mọnde Izuụka nke Atọ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Nm: 24:2-7, 15-17.
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 25:4-5. 6-7. 8-9.
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMatt: 21:23-27
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Nm: 24:2-7, 15-17.
Ihe Ọgụgụ ewetara n’akwụkwọ Ọnụọgụgụ
Mgbe Balam chere ihu n’ịkpa, hụ ndị Izrel ka ha nọ n’agbụrụ n’agbụrụ. Mmụọ nke Chineke dakwasịrị ya, o wee buo amụma nke a sị: Ozi Balam nwa Beọ, okwu nwoke ahụ nke na-ekwu ihe miri emi. Nke pụrụ ịnụzu ihe Chineke na-ekwu. Eji m anya na-eke gbaa na-ahụ ọhụ nke sị n’aka Chineke nke pụrụ ime ihe niile. Ụlọikwu ndị Izrel mara mma nke ukwuu, dịka igu nkwụ nke a tụrụ n’ọgbara dị ogologo ma ọ bụ dịka ubi nke a kụrụ n’akụkụ osimiri, dịka achara aloos nke Yahweh kụrụ, ma ọ bụ osisi sida nke na-eto n’akụkụ iyi! Mmiri ga ezoro ha nke ukwuu, si n’ite mmiri ha na-awụsi. Ha ga-aghakwa mkpụrụ n’ubi ha nke mmiri dere nke ọma. Eze ha ga-adị elu karịa Agag. A ga-ebuli alaeze ya elu. Mgbe ahụ ọ bụkwara amụma nke a, sị: Ozi Balam nwa Beọ, okwu nwoke ahụ nke na-ahụ ihe dị omimi, onye pụrụ ịnụzu ihe Chineke na-ekwu, onye maara nzube nke onye kacha elu, eji m anya na-eke gbaa na ahụ ọhụ nke si n’aka Chineke nke pụrụ ime ihe niile. Ana m ahụ mba Izrel n’ogologo afọ ndị na-abịanụ Otu eze ga-esi na mba ahụ wapụta, dịka kpakpando na-eke gbaa. Eze ahụ ga-esi n’Izrel waa dịka ọnwa, Ọ ga-ejikwa mkpara ya si n’akụkụ tigbuo ndị ndu Moab niile, werekwa ike ya tidaa ndị Set nan ganga ha niile.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 25:4-5. 6-7. 8-9.
Azịza: Mee ka m mata ụzọ gị, O Onyenwenayị.
1. Mee ka m mata ụzọ gị O Onyenweanyị,
kuziere m ụzọ gị.
Dube m n’ụzọ eziokwu gị, ma kụzibere m
N’ihina na ọ bụ gị bụ Chineke onye nzọpụta m.
Azịza: Mee ka m mata ụzọ gị, O Onyenwenayị.
2. Cheta ebere gị, O Onyenweanyị,
chetakwa ịhụnanya gị na-enweghị ube nke
Ị gosịrị site na mgbe ochie.
Echetakwala mmehie niile m mere mgbe m dị na nwata,
Kama cheta m n’ịhụnanya gị,
n’ihi ịdị mma gị, O Onyenweanyị.
Azịza: Mee ka m mata ụzọ gị, O Onyenwenayị.
3. Onyenweanyị dị mma, bụrụkwa onye eziomume,
Ọ na-akụziri ndị mmehie ụzọ
Ọ na-eduzi ndị umeala n’ihe niile kwụ ọtọ,
Ọ na-akụziri ndị ogbenye ụzọ ya.
Azịza: Mee ka m mata ụzọ gị, O Onyenwenayị.
MBEKU:
ALLELUỊA ALLELUỊA:
Gosị anyị ịhụnaanya gị dị ọkpụ O Onyenweanyị, nyekwa anyị nzọpụta gị.
ALLELUỊA.
OZIỌMA –Matt: 21:23-27
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.
Mgbe Jesu batara n’ụlọnsọ, ndị isi nchụaja na ndị okenye ndị Juu bịakwutere ya ka Ọ nọ na-akụzi nkuzi jụọ ya sị, “Olee ike I ji eme ihe ndị a niile, onye nyere gị ike a?” Jesu zara ha sị, “Aga m ajụkwa ụnụ ọtụtụ ajụjụ. Ọ bụrụ na ụnụ zaaa m ya, aga m agwa ụnụ ike m ji eme ihe ndị a niile. Ebee ka mmirichukwu nke Jọn si? O si n’eluigwe ka o si n’aka mmadụ?” Ha bidoro rụrịtaba ụka n’etiti onwe ha na-asị, “Ọ bụrụ na anyị ekwuo sị, o si n’eluigwe; ọ ga-ajụ anyị sị; gịnị mere ụnụ ejighị kwenye nay a? Ma ọ bụrụ na anyị sị, o si n’aka mmadụ, ụjọ ihe ndị mmadụ ga-eme na-atụ anyị n’ihi na onye ọ bụla kwere na Jọn bụ onyeamụma.” Ha zara Jesu sị, “Anyị amaghị.” Jesu asị ha, Mụ onwe m agaghịkwa agwa ụnụ ike m ji eme ihe ndị a niile.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu