Satọdee Izuụka nke Abụọ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Sir: 48:1-4, 9-11.
-
Abụọma na azịza ya
Ps: 80:1-3
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMatiu 17:10-13
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Sir: 48:1-4, 9-11.
Ihe Ọgụgụ ewetara n’akwụkwọ Sịrak
Oge ahụ ka onye amụma Elaịja ji bilite ka ọkụ na-enwu enwu. Okwu ya na-achawapụta ka ire ọkụ. O weteere ha ụganị. N’obiịnụọkụ ya, o belatara ọnụọgụgụ ha. Site n’okwu nke Chineke, o mechiri eluigwe mmiri kwụsị izo. Ugboro atọkwa ka o si n’elu kpọdata ọkụ. Elaịja, Ị dị ebube n’ọrụ ịtụnaanya gị, onye tosịrị ịnya isi dịka ị pụrụ ime? Gị bụkwa onye ike ikuku nke ọkụ bugoro n’elu; gị onye dị nkwadebe n’oge a kara, dịka akwụkwọ nsọ siri kwuo, ime ka iwe Chineke dajụọ tupu oke amụma ebido; Hụgharịa obi ndị bụ nna n’ebe ụmụ ha nọ, ma dozie ebo Jekọb niile dịka ha dị na mbụ. Ngọzi na-adịrị ndị ahụ ga-ahụ gị, ya na ndị nke ahụ ji ịhụnaanya daa n’ụra nke ọnwụ, maka na anyị onwe anyị ga-enwekwa ndụ.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 80:1-3
Azịza: Chineke nke igwe ndịagha, kpọchigha anyị azụ, mee ka ihu gị chakwasị anyị, ka anyị wee nweta nzọpụta.
1. Gee ntị, onye nche nke Izrel,
Gị onye nọ n’ebe kachasị ihe niile elu,
chawapụta ìhè gị,
were ike gị bịa zọpụta anyị.
Azịza: Chineke nke igwe ndịagha, kpọchigha anyị azụ, mee ka ihu gị chakwasị anyị, ka anyị wee nweta nzọpụta.
2. O Chineke nke igwe ndịagha!
Si n’eluigwe ledata anya, ka Ị hụ osisi vaịn a.
Bịa chekwaba mkpụrụ vaịn a
I ji aka gị kụọ.
Azịza: Chineke nke igwe ndịagha, kpọchigha anyị azụ, mee ka ihu gị chakwasị anyị, ka anyị wee nweta nzọpụta.
3. Ka aka gị chekwaba nwoke ahụ Ị họọrọ,
onye ahụ Ị nyere ike.
Mgbe ahụ anyị agaghị agbakụta gị azụ ọzọ;
Nye anyị ndụ ka anyị were na-akpọku aha gị.
Azịza: Chineke nke igwe ndịagha, kpọchigha anyị azụ, mee ka ihu gị chakwasị anyị, ka anyị wee nweta nzọpụta.
MBEKU:
ALLELUỊA ALLELUỊA:
Dozienụ ụzọ nke Onyenweanyị, Meenụ ka ụzọ ya kwụrụ ọtọ.
ALLELUỊA.
OZIỌMA – Matiu 17:10-13
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.
Ka ha si n’elu ugwu nnwogha ahụ na-arịdata, ndị na-eso ụzọ Jesu jụrụ ya sị, “Gịnị mere ndị odeakwụkwọ ji kwuo na Elaịja eburịrị ụzọ bịa?” Jesu zara ha sị, ‘N’ezie Elaịja na-abịa imezi ihe niile. Ma ana m agwa ụnụ na Elaịja abịalarịị, ma ha amataghị ya. Kama ha jiri ya mere ihe masịrị ha. Otu ahụkwa ka ha ga-esi taa Nwa nke mmadụ ahụhụ. Oge ahụ ka ndị na-eso ụzọ ya ji ghọta na ọ na-ekwu maka Jọn onye na-eme mmirichukwu.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu