Fraịde Izuụka nke Abụọ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Is: 48:17-19
-
Abụọma na azịza ya
Ps: 1, 1-2, 3.4.6.
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMatt: 11: 16-19
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Is: 48:17-19
Ihe Ọgụgụ ewetara n’akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya
Nke a ka Chineke, onye nzọpụta ụnụ na onye Nsọ nke Izrel kwuru: “Abụ m Osebụrụwa Chineke ụnụ, onye na-akụziri ụnụ ihe maka ọdị mma nke ụnụ, onye na-edu ụnụ n’ụzọ ụnụ kwesịrị isi na-aga. N’ezie, a sị na ụnụ gere ntị n’iwu m, udo gaara na-ehuru ụnụ dịka mmiri iyi, eziomume ụnụ dịka ebili oke osimiri. Ụmụ ụnụ gaara adị ka aja dị n’ala, ụmụụmụ ụnụ dịka mkpụrụ aja. A gaghị ehichapụ aha ha ehichapụ ma ọ bụ kpochapụ ha n’ebe m nọ.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 1, 1-2, 3.4.6.
Azịza: Ndị na-eso gị Onyenweanyị ga-enwe ìhè nke ndụ.
1. Añụrị ga-adịrị nwoke ahụ nke anaghị eso ndụmọdụ onye ajọomume
ma ọ bụ na-akwụgharị n’ụzọ ndị ome njọ,
ma ọ bụ n’otu ndị na-ekwutọ Chineke;
Kama ọ na-enwe añụrị n’ebe iwu Onyenweanyị dị
ma na-achịgharị iwu ya n’obi ya ehihie na abalị.
Azịza: Ndị na-eso gị Onyenweanyị ga-enwe ìhè nke ndụ.
2. Ọ dị ka osisi a kụrụ n’akụkụ iyi,
nke na-amịpụta mkpụrụ ya n’oge ya,
nke akwụkwọ ya anaghị akpọnwụ akpọnwụ,
ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma.
Azịza: Ndị na-eso gị Onyenweanyị ga-enwe ìhè nke ndụ.
3. Ọ dịghị otu a n’ebe ndị ajọ mmadụ nọ,
Mba, n’ihi na ha dịka afụrụ ọka nke ikuku na-ebugharị
N’ihi na Onyenweanyị na-echekwaba ụzọ ndị eziomume,
mana ụzọ ndị ajọ mmadụ na-eduba n’ịla n’iyi.
Azịza: Ndị na-eso gị Onyenweanyị ga-enwe ìhè nke ndụ.
MBEKU:
ALLELUỊA ALLELUỊA:
Onyenweanyị na-abịa, ganụ zute ya ọ bụ eze nke udo.
ALLELUỊA.
OZIỌMA –Matt: 11: 16-19
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.
Jesu gwara igwe mmadụ ahụ sị: “Ma gịnị ka m ga-eji atụnyere ọgbọ a? Ọ dị ka ụmụntakịrị ndị nọ n’ọma ahịa na-akpọ ibe ha oku; ‘Anyị gbuuru ụnụ ọja, ma ụnụ agbaghị egwu; anyị tiri mkpu akwa, ma ụnụ erughị ụjụ’. Jọn bịara na-ebu ọnụ na-asọkwa mmanya, ha sị na ajọ mmụọ bi n’ime ya. Nwa nke mmadụ abịa, na-eri na-añụ, ha sị, ‘Lee onye oke oriri na onye añụmañụ, enyi ndị ọnaụtụ na ndị omenjọ!’ ma amamiihe egosipụtala onwe ya site n’ezi ọrụ ya.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu