Tọọzde Izuụka nke Abụọ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Is: 41:13-20
-
Abụọma na azịza ya
Ps: 145:1. 9. 10-11. 12-13.
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMatt: 11: 11-15
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Is: 41:13-20
Ihe Ọgụgụ ewetara n’akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya
Mụ onwe m bụ Osebụrụwa Chineke gị sekpụ gị n’aka nri, na-asị gị, “Ụjọ atụla gị. Aga m enyere gị aka. Atụla egwu, gị bụ Jekọb dị nta dịka ahụhụ. Ụnụ atụla egwu ụmụ Izrel. Lee, aga m enyere ụnụ aka, ọ bụ Yahweh na-ekwu, onye nzọpụta ụnụ bụ onye Nsọ nke Izrel. Lee, aga m eme ka ụnụ bụrụ igwe na-akwọ ọka dị ọhụrụ, nke eze ya dị nkọ. Ụnụ ga-egwutu ugwu niile, mekwaa ka ugwu nta niile ghọọ uzuzu aja. Ụnụ ga-ayọcha ha; ikuku ga-ebufu ha; oke ikuku ga-ekposacha ha. Mana ụnụ ga-enweta oke ọñụ n’ime Chineke, n’ime onye Nsọ nke Izrel ka ụnụ ga-enweta otito. Mgbe ndị ogbenye na ndị nọ na mkpagbu chọrọ mmiri ma ọdịghị nke dị, mgbe akpịrị na-akpọ ha nkụ, mụ bụ Yahweh ga-aza ha. Mụ bụ Chineke nke Izrel agaghị agbahapụ ha.Aga m eme ka mmiri si n’ala ugwu kpọrọ nkụ na-erudata. Aga m eme ka isiiyi na-asọpụta n’etiti ndagwurugwu niile. Aga m eme ka mmiri jupụta n’ịkpa, mekwaa ka isi mmiri site n’ala kpọrọ nkụ na-asọpụta. Aga m akụ osisi sida, ụgba, achị na oliv n’ọzara. Aga m akụkọta osisi nkwụ, junipe na pine ọnụ n’ọzara. Nke a ka mmadụ niile ga-ahụ, wee matakwa, ha ga-aghọta, tulekwa na ọ bụ Chineke rụrụ ha, na ọ bụ aka ọrụ onye nsọ nke Izrel.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 145:1. 9. 10-11. 12-13.
Azịza: Onyenweanyị bụ Onye amara na onye obi ebere, ọ naghị ewe iwe ọsọọsọ, o jupụtara na ịhụnaanya.
1. Aga m enye gị otito, Chineke bụ eze m,
aga m eto aha gị ruo mgbe ebighị ebi.
Onyenweanyị na-egosị mmadụ niile obiọma ya
ebere nke Onyenweanyị na-erute ihe niile o kere.
Azịza: Onyenweanyị bụ Onye amara na onye obi ebere, ọ naghị ewe iwe ọsọọsọ, o jupụtara na ịhụnaanya.
2. Onyenweanyị, ihe niile I kere ga-ekele gị,
ndị kwere na gị ga-agọzi gị.
Ha ga-ekwupụta ebube nke alaeze gị
ma kwupụtakwa ịdị ike gị.
Azịza: Onyenweanyị bụ Onye amara na onye obi ebere, ọ naghị ewe iwe ọsọọsọ, o jupụtara na ịhụnaanya.
3. Ka mmadụ niile mata ọrụ ịtụnaanya gị niile,
na ebube dị elu nke alaeze gị.
Alaeze gị ga-adị ebeebe,
ọchịchị gị ga-adị na ndụdụgandụ niile.
Azịza: Onyenweanyị bụ Onye amara na onye obi ebere, ọ naghị ewe iwe ọsọọsọ, o jupụtara na ịhụnaanya.
MBEKU:
ALLELUỊA ALLELUỊA:
Ka eluigwe zodata mmiri dịka igirigi,
ka urukpu zoo eziomume dịka mmiri,
ka ala meghee, ka nzọpụta topụta.
ALLELUỊA.
OZIỌMA –Matt: 11: 11-15
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.
Jesu gwara igwe mmadụ sị: “N’ezie agwa m ụnụ, n’etiti ndị niile nwaanyị mụrụ, O nweghị onye ọbụla dị ukwuu karịa Jọn onye na-eme mmirichukwu; ma onye ahụ nke dịkarịchara nta n’alaeze eluigwe ka ya ukwu. Site n’oge Jọn onye na-eme mmirichukwu ruo ugbu a, ndị mmadụ ji anyaike na izọ ụzọ abanye n’alaeze eluigwe. Ndị na-emesi ihe ike na-abanye na ya. Tupu Jọn abịa, iwu Mosis na ndịamụma niile buru amụma banyere alaeze ahụ; ọ bụrụ na ụnụ dị nkwadebe ịnabata ya, ọ bụ ya bụ Elaịja ahụ nke ga-abịanụ. Onye nwere nti ya nụrụ.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu