Wenezde Izu Abụọ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Is: 40:25-31
-
Abụọma na azịza ya
Ps: 103, 1-2. 3-4, 8.10
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMatt: 11: 28-30
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Is: 40:25-31
Ihe Ọgụgụ ewetara n’akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya
Onye nsọ na-ajụ sị, “Onye ka ụnụ ga-eji tunyere m, nke na mụ ga-adị ka ya? Lee anya n’elu ka ịhụ onye kere ihe ndị a niile? Ọ bụ onye ahụ na edupụta ha n’igwe na akpọ nke ọbụla aha ya. Site n’ike aka ya na ike ya dị egwu o nweghị nke furu efu. O! Jekọb gịnị mere iji na-ekwu, o! Izrel gịnị mere i ji na-atamu sị, “Yahweh amaghị nsogbu m, ọ na-elegha oke ruuru m anya?” Ọ bụ na ụnụ amaghị? ọ bụ na ụnụ anụbeghị? Chineke bụ Chukwu dị ebeebe, onye kere nsọtụ ụwa niile. Ọ naghị ada mba, nke ike na-agwụ ya, nghọta ya dị omimi. Ọ na-enye ndị dara mba ike, na-emekwa ka ndị na enweghị ume nwee ume. Ọbụladị ndị ụmụokorobịa ga-ada mba, ike ga-agwụkwa ha. Ike ga-agwụkwa ndị na eto eto. Ma ndị niile chekwubere na Chukwu ga-enweta ike ọzọ. Ha ga-efe n’elu dịka ugo. Ha ga-agba ọsọ, ma ike agaghị agwụ ha. Ha ga-aga ije ma ha agaghị ada mba.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 103, 1-2. 3-4, 8.10
Azịza: Gozie Onyenweanyị, Mkpụrụobi m.
1. Gozie Onyenweanyị mkpụrụobi m,
gozie aha ya dị nsọ, ihe niile dị n’ime m!
Gozie Onyenweanyị mpkụrụobi m,
echezọkwala obi ebere ya niile.
Azịza: Gozie Onyenweanyị, Mkpụrụobi m.
2. Nke o ji gbaghara njị gị niile,
ma gwọọ ọrịa gị niile,
nke o ji si n’olulu zọpụta ndụ gị,
nke o ji were ịhụnaanya na obi ebere kpube gị okpueze.
Azịza: Gozie Onyenweanyị, Mkpụrụobi m.
3. Osebụrụwa dị ebere na ịhụnaanya
ọ naghị ewe iwe ngwa ngwa, ịhụnaanya ya dị ukwuu
Ọ naghị emeso anyị, ọ naghị ata anyị ahụhụ,
dịka amamikpe anyị na njọ anyị si dị.
Azịza: Gozie Onyenweanyị, Mkpụrụobi m.
MBEKU:
ALLELUỊA ALLELUỊA:
Onyenweanyị na-abịa ịzọpụta anyị,
añụrị ga-adịrị ndị dị nkwadobe izute ya.
ALLELUỊA.
OZIỌMA – Matt: 11: 28-30
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.
Jesu kwuru sị: “Bịakwutenụ m ụnụ niile ndị na adọgbu onwe ụnụ n’ọrụ na ndị e boro ibu dị arọ, aga m enye ụnụ ezumike. Nyaranụ ịnyagba nke m n’olu ụnụ; mụtakwanụ ihe n’omume m, n’ihina adị m nwayọọ dịkwa obi umeala. Ụnụ mee otu a, obi ụnụ ga-enweta ezumike. N’ihi na ịnyagba m dị mfe, ibu m adịghịkwa arọ.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu