Nnukwu Emume Ịtụ Ime Marịa dị Ngọzi N’Ejighị Njọ.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Gn: 3:9-15, 20
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 98: 1, 2-3, 3-4.
-
Ihe ọgụgụ nke abụọ
Ephesus: 1:3-6, 11-22
- OziọmaLk: 1:26-38
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Gn: 3:9-15, 20
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Mbido (Jenesis)
Ma Yahweh Chineke kpọrọ nwoke ahụ jụọ ya sị, “Olee ebe ị nọ?” Ọ zara ya sị, “Anụrụ m ụda ụkwụ gị n’ime ogige, ụjọ jidere m n’ihina agba m ọtọ, m wee zoo onwe m.” Ọ jụrụ ya sị, “Onye gwara gị na ị gba ọtọ? Ị taala mkpụrụ osisi ahụ m nyere gị iwu ka ị ghara ịta?” Nwoke ahụ azaa ya, “Ọ bụ nwaanyị a ị kpọnyere m ka mụ na ya biri, o nyere m mkpụrụ osisi ahụ m taa.” N”oge a ka Yahweh Chineke jụrụ nwaanyị ahụ, “Gịnị bụ ihe nke a i mere?” Nwaanyị ahụ zara ya, “Agwọ ahụ rafuru m, mụ ataa ya.” Mgbe ahụ ka Yahweh Chineke sịrị agwọ ahụ, “N’ihina i mere ihe nke a, a bụọla gị ọnụ karịa ụmụ anụmaanụ niile dị n’ọhịa na nke dị n’ụlọ; Ị ga-eji afọ gị na-aga ije bịa na-ata aja ụbọchị niile nke ndụ gị. Aga m eme ka iro dịrị n’etiti gị na nwaanyị a, na n’etiti ụmụ gị na nke ya; ọ ga-azọpịa gị isi ma ị ga-ata ya n’ụkwụ. Nwoke ahụ gụrụ nwunye ya Eve n’ihina ọ bụ nne ndị niile dị ndụ.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 98: 1, 2-3, 3-4.
Azịza: Kweere Onyenweanyị ukwe ọhụrụ, n’ihina ọ rụrụ ọrụ ebube
1. Kweere Onyenweanyị ukwe ọhụrụ,
n’ihina ọ rụrụ ọrụ ebube,
aka nri ya na aka ya dị nsọ e weterela ya mmeri.
Azịza: Kweere Onyenweanyị ukwe ọhụrụ, n’ihina ọ rụrụ ọrụ ebube
2. Onyenweanyị egosila ike nzọpụta ya,
O meela ka mba niile mata eziomume ya.
O chetala ịhụnaanya ya na ịkwụdosiike ya,
n’ebe ezinụụlọ Izrel nọ.
Azịza: Kweere Onyenweanyị ukwe ọhụrụ, n’ihina ọ rụrụ ọrụ ebube
3. Akụkụ ụwa niile ahụla nzọpụta nke Chineke anyị.
Ụwa niile tijerenụ Onyenwanyị mkpu ọñụ,
werenụ ukwe na mkpu ọñụ too ya.
Azịza: Kweere Onyenweanyị ukwe ọhụrụ, n’ihina ọ rụrụ ọrụ ebube
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ –Ephesus: 1:3-6, 11-22
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi Pọl degaara ndị Efesus
Ngọzi dịrị Chineke na Nna nke Dinwenụ anyị Jesu Kristi, onye sitere n’eluigwe were ngọzi niile nke mmụọ gọzie anyị n’ime Kristi. Ọ họọrọ anyị, n’ime Kristi tupu a tọọ ntọala ụwa, ka anyị dịrị ya nsọ n’enweghị ntụpọ ọbụla n’ihu ya. O jiri ihụnaanya nye anyị ọnọdụ; ka anyị bụrụ ụmụ ya site na Jesu Kristi dịka ọchịchọ nke uche ya siri dị. Ọ bụ maka mbuli elu nke ngọzi ya dị otito, nke o nyere anyị n’efu n’ime Nwa ya ọ hụrụ n’anya.
N’ime ya, dịka nzube nke ya bụ onye ahụ na-emejupụta ihe niile si dị, nakwa ka ntụpụta nke obi ya siri dị, anyịnwa bụ ndị buru ụzọ chekwube na Kristi. Ndị e merela, họpụtakwa ka ha bie ndụ maka otito nke ebube ya.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
MBEKU:
ALLELUIA, ALLELUIA:
“Ekele, I jupụtara na grasịa, Osebụrụwa nọnyeere gị.
Ị dị ngọzi n’etiti ikporo niile.
ALLELUIA.
OZIỌMA –Lk: 1:26-38
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
N’ọnwa nke isii, Chineke zigara Mmụọọma Gebrel ka ọ gaa n’obodo Galili a na-akpọ Nazaret; ka ọ gakwuru otu nwaagbọghọ na amaghị nwoke, onye ikwunibe ya kwekọrịtara na otu nwoke aha ya bụ Josef, nke si n’agbụrụ Devid ga-alụ. Aha nwaagbọgbọ ahụ bụ Marịa. Mmụọọma ahụ bịakwute Marịa sị ya, “Ekele, I jupụtara na grasịa, Osebụrụwa nọnyere gị!” Obi lọrọ ya mmiri nke ukwuu n’ụdị ekele a, nke mere na ọ malitere ịtụle n’uche ya ihe ụdị ekele a pụtara. Mmụọọma ahụ sịrị ya, “Atụla egwu, Marịa, n’ihina Ị natala ngọzi n’aka Chineke. Lee Ị ga-adị ime, mụta nwa nwoke; aha Ị ga-akpọ ya bụ Jesu. Ọ ga-adị ukwuu, a ga-akpọkwa ya nwa onye kacha elu. Dinwenụ Chineke ga-enye ya ocheeze nna ya Devid. Ọ ga-achị ezinụụlọ Jekọb ebeebe; alaeze ya agaghị enwe ọgwụgwụ.” Marịa jụrụ Mmụọọma ahụ sị, “Olee otu nke a ga-esi mee ebe ọ bụ amaghị m nwoke.” Ma Mmụọọma ahụ zara ya sị, “Mmụọ Nsọ ga-abịakwasa gị; ike nke onye kacha elu ga-ekpuchi gị. N’ihi nke a, a ga-akpọ nwa ahụ Ị ga-amụ, Onye nsọ, nwa Chineke. Lee, Elizabet onye ikwu gị, onye ndị mmadụ na-akpọ nwaanyị aga, atụrụla ime n’agadị ya; ugbu a ọ dị ime ọnwa isii. N’ihina ebe Chineke nọ, o nweghị ihe nyịrị omume.” Marịa kwuru sị, “Lee, abụ m odibo nwaanyị nke Osebụrụwa, ka o reere m ka i siri kwu.” Mmụọọma ahụ wee si n’ebe ọ nọ pụọ.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu