Fraịde Izuụka nke Mbụ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Is: 29:17-24
-
Abụọma na azịza ya
Ps: 27:1.4.13-14
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMatt: 9:27-31
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Is: 29:17-24
Ihe Ọgụgụ ewetara n’akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya
Yahweh wee kwuo sị: ọ bụ na ọ fọghị nwantịtị oge, mgbe Lebanọn ga-agbanwe bụrụ ezigbo ala ubi na-amịta mkpụrụ, ma ala ubi na-amịta ọtụtụ mkpụrụ aghọọ oke ọhịa? N’ụbọchị ahụ ndị ntị chiri ga-anụ okwu si n’akwụkwọ ahụ, ndịisi, ndị ahụ naara ejegharị n’ọchịchịrị ga-emeghe anya ha, hụkwa ụzọ ọzọ.
Ndị umeala ga-enwekwa añụri ọhụrụ n’ime Chineke ndị ogbenye n’etiti ha ga-enwe añụrị n’ime onye Nsọ nke Isrel. Maka na ndị obi ọjọọ agaghị adịkwa adị; ndị na-akwa Chineke emo agaghịkwa asị. A ga-ekpochapụ ndị echiche ọjọọ niile; ndị ahụ na-ebo ndị aka ha dị ọcha ebubo na-esiri ndị na-adọ ha aka na ntị ọnya n’ọnụ ụzọama, na site n’ịrịọ arịrịọ na enweghị isi ka ikpe nkwụmọtọ ghara irute onye eziomume aka. Ya mere, Osebụrụwa, Chineke nke ụlọ Jekọb na onye mgbapụta nke Abraham jiri kwuo sị, “Ihere agaghị emekwa Jekọb ọzọ, ọ agaghị enwekwa ihu mgbarụ ọzọ; Maka na mgbe ọ hụrụ ụmụaka ya nke bụ aka ọrụ m, n’etiti ha, ha ga-edo aha m nsọ, ha ga-edo onye Nsọ nke Jekọb asọ. Ha ga na-atụrụ Chineke nke Izrel egwu. Ndị niile mejọrọ n’ime mmụọ ga-amata ihe ma ndị niile na-atamu ntamu ga-anabata ndụmọdụ.”
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 27:1.4.13-14
Azịza: Dinwenu bu ihe m na nzoputa m.
1. Dinwenụ bụ ìhè na nzọpụta m,
onye ka m ga-atụ egwu?
Dinwenụ bụ ide nke ndụ m
onye ga-eyi m egwu!
Azịza: Dinwenu bu ihe m na nzoputa m.
2. Otu ihe ka m na-arịọ Dinwenụ,
otu ihe ka m na-achọ.
Ka m biri n’ụlọ nke Dinwenụ
ụbọchị niile nke ndụ m.
Ka m nweta ịdị ụtọ nke Dinwenụ,
ka m na-ahụ ya n’ụlọnsọ ya.
Azịza: Dinwenu bu ihe m na nzoputa m.
3. Ekwere m na m ga-ahụ ịdị mma nke
Chineke, n’ala ndị dị ndụ.
Chekwube na Dinwenụ.
Obi sie gị ike,
Tụkwasị ya obi, chekwube na ya.
Azịza: Dinwenu bu ihe m na nzoputa m.
MBEKU
ALLELUIA ALLELUIA:
Ka urukpu zoo eziomume dịka mmiri,
ka ala meghee, ka nzọpụta topụta, ka o mee ka ikpe nkwụmọtọ topụtakwa.
ALLELUIA.
OZIỌMA –Matt: 9:27-31
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.
Mgbe Jesu si Kapanaum pụọ, mmadụ abụọ kpuru isi sooro ya, ha na-eti mkpu sị, “Nwa Devid, meere anyị ebere.” Mgbe Jesu batara n’ime ụlọ, ndị isi ahụ bịakwutere ya. Ọ jụọ ha sị, ụnụ kwere na m nwere ike ime ka ụnụ hụ ụzọ?” Ha azaa ya sị, “Ee Onyenweanyị!” Jesu emetu ha aka n’anya sị, “Ya meere ụnụ ka okwukwe ụnụ si dị. Anya ha wee meghee. Jesu dọsiri ha aka na ntị ike sị, “Ụnụ agwakwala onye ọbụla nke a.” Mana ha si ebe ahụ pụọ, na-agbasa ude Jesu n’akụkụ ala ahụ niile
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu