Tọọzde Izuụka nke Mbụ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Is: 26:1-6
-
Abụọma na azịza ya
Ps: 118:1. 8-9.19-21.25-27.
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMatt. 7:21.24-27
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Is: 26:1-6
Ihe ọgụgụ ewetara n’akwụkwọ onye Amụma Aịzaya:
N’ụbọchị ahụ, a ga-ekwe ukwe nke a na Juda: “Anyị nwere obodo e wusiri ike; Ọ na-akwụwa nzọpụta na ya dịka mgbidi siri ike. Meghee ọnụ ụzọama, ka mba eziomume, mba nwere okwukwe bata. Ị na-eme ka o nwee udo zuru oke bụ onye ahụ nke obi ya dị n’ebe Ị nọ, n’ihi na ọ tụkwasịrị obi na gị. Tụkwasanụ obi na Yahweh mgbe niile, n’ihina Yahweh Chineke bụ nkume mgbe ebighi ebi. N’ihina o butuola ndị bi n’ebe dị elu, n’ obodo dị elu. O wedaala ya, tọgbọ ya n’ala, tụrụọ ya n’aja. Ụkwụ ga-azọpịa ya, ụkwụ ndị ogbenye na nzọ ụkwụ ndị a na emegbu emegbu.”
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 118:1. 8-9.19-21.25-27.
Azịza: Ngọzi dịrị onye ahụ na-abịa na-aha Onyenweanyị.
1. Nye Onyenweanyị ekele n’ihi na ọdị mma,
ebere ya enweghị njedebe.
Ọ ga-akara m mma, ịgbaba n’Onyenweanyị,
karịa ịtụkwasịobi m na ndị mmadụ
Ọ ga akara m mma ịgbaba na Chineke,
karịa ịtụkwasịobi n’ụmụ ndị eze.
Azịza: Ngọzi dịrị onye ahụ na-abịa na-aha Onyenweanyị.
2. Megheere m ụzọ nke eziomume
ka m bata bịa nye Onyenweanyị ekele.
Nke a bụ ọnụụzọ nke Onyenweanyị,
ebe ndị eziomume ga-esi bata
Ana m ekele gị n’ihi na Ị nụla olu m
Ị bụkwa onye nzọpụta m.
Azịza: Ngọzi dịrị onye ahụ na-abịa na-aha Onyenweanyị.
3. Biko Onyenweanyị, biko zọpụta anyị,
biko Onyenweanyị, biko nye anyị ọganihu
Ngọzi dịrị onye ahụ na-abịa n’aha Onyenweanyị,
anyị na-eto gị site n’ụlọ Onyenweanyị
Osebụrụwa bụ Chineke, o ji ihu ọchị ele anyị.
Azịza: Ngọzi dịrị onye ahụ na-abịa na-aha Onyenweanyị.
MBEKU:
ALLELUỊA ALLELUỊA:
Chọọ Chineke mgbe ọ ga-ekwe nchọta,
kpọkuo ya oge ọ nọ nso.
ALLELUIA.
OZIỌMA –Matt. 7:21.24-27
Ihe ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị: “Ọ bụghị onye ọbụla nke na-akpọ m ‘Dinwenụ, Dinwenụ ga-aba n’alaeze eluigwe, kama ọ bụ onye na eme uche nke Nna m bi n’igwe.“Onye ọbụla nke na-anụ okwu m ndị a, na emekwa ha, dịka nwoke maara ihe, nke rụrụ ụlọ ya n’elu okwute; mmiri wee zoo, ide mmiri tojuo, ifufe bukwara ya ma ọ daghị, n’ihi na a tọrọ ntọala ya n’elu okwute; Onye ọbụla nke na-anụ okwu ndị a, ma ọ naghị eme ha, dịka onye nzuzu nke rụrụ ụlọ ya n’elu aja, mmiri zoro, ide mmiri tojuo, ifufe bukwara ya, o wee daa. Ọdịda nke ụlọ ahụ buru ibu nke ukwuu”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu