Wenezde Izuụka nke Mbu n’Oge Olileanya Onye Nzọpụta Anyị.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Is: 25:6-10
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 23:1-3. 3-4. 5. 6.
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMatt: 15:29-37
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Is: 25:6-10
Ihe Ọgụgụ ewetara n’akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya
N’elu ugwu nke a, Yahweh nke igwe ndị agha ga akwadoro mba niile oke oriri nke nri kacha mma na mmanya kacha ụtọ. N’elu ugwu a, ọ ga-eyipu mmadụ niile akwa mkpe ha yi n’ahụ, wepụkwa akwaozu e kpuchigidere mba niile. Ọ ga-emebi ọnwụ kpam kpam; Osebụrụwa Chineke ga-ehichapụ anya mmiri n’ihu ọ bụla, ọ na-ewepu ihere ndị nke ya n’ebe ọ bụla n’ụwa, n’ihi na Chineke ekwuola ya. A ga-ekwu n’ụbọchị ahụ sị “Lee nke a bụ Chineke anyị; onye anyị chekwubere ịzọpụta anyị. Ya bụ Osebụrụwa, onye anyị chekwubere na ya; ka anyị ñurịanụ; ka anyị gorienụ n’ihi na Ọ zọpụtala anyị.” N’ihi na aka nke Yahweh ga-echekwaba ugwu a, n’ebe a ka a ga-azọpịa Moab n’ụkwụ, dịka e si azọpịa ahịhịa n’ebe a na-ekpofu ahịhịa.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA: Ps. 23:1-3. 3-4. 5. 6.
Azịza: Aga m ebi n’ụlọ nke Chineke ebeebe ebeebe!
1.Chineke bu onye nche m O nweghi ihe m ga-acho
O na -eme ka m zuru ike ebe ahihia ndu di
O na -eduga m na mmiri
Ebe ahụ ka Ọ na-enye m ike.
Azịza: Aga m ebi n’ụlọ nke Chineke ebeebe ebeebe!
2. Ọ na edu m na ụzọ eziomume;
n’ihi aha ya
Ọ bụrụ godu m na-aga na ndagwurugwu ọnwụ,
egwu ọ bụla agaghị atụ m;
Iji mkpara na ngu gị nọdebe m,
Ọ bụ ha na enye m agba m ume.
Azịza: Aga m ebi n’ụlọ nke Chineke ebeebe ebeebe!
3. Ị na-akwadoro m nri.
N’ihu ndị iro m.
lteela isi m mmanụ,
iko m ejula n’ọnụ na-agbọfu.
Azịza: Aga m ebi n’ụlọ nke Chineke ebeebe ebeebe!
4. N’ezie obiọma na ebere ga na eso m,
ụbọchị ndụ m niile.
Aga m ebi n’ụlọ nke Chineke
Ebeebe ebeebe!
Azịza: Aga m ebi n’ụlọ nke Chineke ebeebe ebeebe!
MBEKU:
ALLELUỊA ALLELUỊA:
Onyenweanyị na abịa ịzọpụta ndị nke ya,
añụrị ga-adịrị ndị dị nkwadobe izute ya.
ALLELUỊA.
OZIỌMA –Matt: 15:29-37
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.
Jesu siri ebe ahụ pụọ gafee akụkụ osimiri Galili. Ọ rịgooro n’elu ugwu, nọdụ ala n’ebe ahụ. Ọtụtụ igwe mmadụ bịakwutere ya, kpọtara ya ndị ngwọrọ, ndị ọlụsị, ndị isi, ndị ogbi na ọtụtụ ndi ọzọ. Ha tọgbọrọ ha n’ụkwụ Jesu, o wee gwọọ ha niile.Ọ bụ ihe ịtụnaanya nye igwe mmadụ ahụ mgbe ha hụrụ ndị ogbi ka ha na ekwu okwu, ndị ọlụsị ka ahụ zuru ha oke, ndị ngwọrọ ka ha na aga ije na ndị isi ka ha na-ahụ ụzọ. Ha wee too Chineke nke Izrel. Jesu kpọkọtara ndị na eso ụzọ ya wee sị ha, “Ebere igwe mmadụ a na-eme m n’ihi na mụ na ha anọọla ụbọchị atọ ugbu a ma ha enweghịkwa ihe ha ga eri, achọghị m ka ha buru ọnụ laa, ka ike ghara ịgwụ ha n’ụzọ” Ndị na-eso ụzọ ya wee jụọ ya sị, “Olee ebe anyị ga-esi nweta ogbe achịcha n’ozara ebe a, nke ga-ezu inyeju igwe mmadụ a afọ? Jesu jụrụ ha sị, “Ogbe achịcha ole ka ụnụ nwere?” Ha azaa ya sị, “Ogbe asaa na mkpụrụ azụ olemaole.” Jesu gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala. Ọ naara ogbe achịcha asaa na azụ ndị ahụ, mgbe o nyechara ekele, ọ nyawara ha, nye ndị na-eso ụzọ ya. Ha kesaara ha igwe mmadụ ahụ. Ha niile rijuru afọ; ndị na-eso ụzọ ya wee tụtụkọta irighịri ndị fọdụrụnụ nke juru nkata asaa.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu