Tuzde Izuụka nke Mbụ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Is: 11:1-10
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 72:1.7-8. 12-13.17.
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk: 10:21-24
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Is: 11:1-10
Ihe Ọgụgụ ewetara n’akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya
Ome ga-esi n’ukwu osisi nke Jesse pụta, alaka ga-etopụta na mgbọrọgwụ ya. Mmụọ nke Osebụrụwa ga-adakwasa ya, mmụọ nke amamihe na nghọta, mmụọ nke ndụmọdụ na ike, mmụọ nke ọmụma na iwu nke chukwu. Ịtụ egwu nke Chukwu ga-abụ ihe na-atọ ya ụtọ. Ọ gaghị eji naanị ihe anya na-ahụ kpee ikpe, nke aga-eji naanị ihe ọ nụrụ na ntị wee kpebie okwu. Kama eziomume ka ọ ga-eji kpeere ndị ogbenye ikpe; o ga-enye ndị dị umeala n’ụwa ikpe nkwụmọtọ. Okwu ya ga-abụ mkpara igwe ga-akụtu ụwa, ikpe ya ga-ewetara ndị ajọ mmadụ ọnwụ. Eziomume ga-abụ akwa ọ ma n‘ukwu ya, ịkwụdosike ga-abụ ajị o kere n‘ukwu ya. Nkịta ọhịa na ụmụ atụrụ ga-ebi otu ebe, agụ na ụmụ ewu ga edina. Nwa ehi na ọdụm na nwa ọdụm ga-anọkwa otu ebe; Obere nwa ga na edu ha; Ehi na edi ga na-edina otu ebe; ọdụm ga na-ata ahịhịa ka ehi. Nwa na-añụ ara ga-egwu egwu n‘ọnụ agwọ, nwa na-eto eto ga-amanye aka n‘ọnụ agwọ ajụaja. Ha agaghị emebi ma ọ bụ merụọ mmadụ ahụ n’elù ugwu m dị nsọ, n’ihi na ụwa ga-ejùpụta n’amamihe nke Yahweh dịka otu mmiri si jupụta n’osimiri. N’ụbọchị ahụ, mgbọrọgwụ nke Jesse, ga akwụrụ dịka ihe akara n’ihu mmadụ niile. Mba niile ga-achọba ya, ebe obibi ya ga adị ebube.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 72:1.7-8. 12-13.17.
Azịza: N’oge ya eziomume ga-achawapụta, udo ga-adịkwa ruo na njedebe ụwa.
1. Nye eze ikpe nkwụmọtọ gị, O Chineke,
nyekwa nwa eze eziomume nke gị,
Ka o were nwee ike ịchị ndị nke gị n’ụzọ ziri ezi,
nyekwa ndị ogbenye ikpe ziri ezi.
Azịza: N’oge ya eziomume ga-achawapụta, udo ga-adịkwa ruo na njedebe ụwa.
2. N’oge ya eziomume ga-achawapụta,
udo ga-adịkwa ruo na njedebe ụwa,
Alaeze ya ga-esi n’osirniri ruo n’osimiri,
bido na mmiri ruo n’isi ngwụcha nke ụwa.
Azịza: N’oge ya eziomume ga-achawapụta, udo ga-adịkwa ruo na njedebe ụwa.
3. Ọ ga-atọhapụ onye ogbenye kpọkuru ya,
na ndịọ niile chọrọ enyemaka ya.
Ọ ga-emere ndị ogbenye na ndị esighị ike ebere,
na azọpụta ndụ ha.
Azịza: N’oge ya eziomume ga-achawapụta, udo ga-adịkwa ruo na njedebe ụwa.
4. Ngọzi dịrị aha ya ebeebe,
ka ọ dịgide dịka anyanwụ
ka agbụrụ niile dị n’ụwa nweta ngọzi na ya
ka mba niile kpọọya onye dị ngọzi.
Azịza: N’oge ya eziomume ga-achawapụta, udo ga-adịkwa ruo na njedebe ụwa.
ALLELUỊA:
ALLELUỊA ALLELUỊA:
Lee, Onyenweanyị ga-abịa n’ebube, Ọ ga-emepe anya ndị nke ya.
ALLELUỊA.
OZIỌMA –Lk: 10:21-24
Ihe Ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
N’otu oge ahụ, obi tọrọ Jesu ụtọ site na Mmụọ Nsọ, o wee sị, Ekelee m gị Nna, Dinwenụ nke eluigwe na ụwa, n’ihi na I zobere ihe ndị a n’ebe ndị amamihe na oke mmụta nọ, ma kpugheere ha ụmụntakịrị. Ee Nna, otu a ka o si masị uche gị dị nsọ. Nna m enyefeela m ihe niile na-aka. Ọ dịghịkwa onye ọ bụla maara onye Nwa ahụ bụ ma ọ bụghị Nna, ma ọ bụ onye Nna ahụ bụ ma ọ bụghị Nwa ahụ, na onye ọ bụla nke Nwa ahụ chọrọ ikpughere ya. Jesu tụgharịrị gwa ndị na-eso ụzọ ya na nzuzo sị, “Ngọzi dịrị anya hụrụ ihe ụnụ hụrụ! Ana m agwa ụnụ na ọtụtụ ndị amụma na ndị eze mgbe ochie chọsiri ike ịhụ ihe ụnụ na-ahụ, ma ha ahụghị ha, na ịnụ ihe ụnụ na-anụ, ma ha anụghị ha.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu