Mọnde Izuụka nke Mbụ n’oge Olileanya Onye Nzọpụta anyị.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Is. 4:2-6
-
Abụọma na azịza ya
Ps 122, 1-2. 3-4. (4-5.6-7) 8-9
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMtt. 8:5-11
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Is. 4:2-6
Ihe ọgụgụ ewetara n’akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya
N’ụbọchị ahụ, ngalaba nke Yahweh ga-amachasị mma jupụtakwa n’ebube; mkpụrụ nke ala ahụ ga abụkwa ihe nganga na ihe ịchọ mma nye ndị ga-afọdụ n’ala Izrel. Onye ọbụla ga-afọ na Zayọn na Jerusalem ka a ga-akpọ onye dị nsọ, bụrụkwa ndị a họpụtara ka ha dị ndụ na Jerusalem. Nke a ga-eme mgbe Yahweh jirila mmụọ nke ikpe nkwụmọtọ na mmụọ nke mmebi sachapụ iru inyi nke ụmụada Zayọn nakwa ọbara nke metọchara Jerusalem. Mgbe ahụ, Yahweh ga-abịa kpuchie elu ugwu Zayọn na ndị niile gbakọrọ na ya; ọ ga ezite urukpu n’ehihie, zitekwa anwụrụ ọkụ na enwu enwu n’abalị; ebube ya ga-ekpuchi obodo ahụ niile. N’ehihie, ọ ga-egbochiri ha ekpomọkụ; ọ ga-abụkwara ha ebe mgbaba mgbe oke mmiri na-ezo.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 122, 1-2. 3-4. (4-5.6-7) 8-9
Azịza: Añụrị juru m obi mgbe m nụrụ ha kwuru sị, “Ka anyị gaa n’ụlọ nke Chineke.
1. Añụrịrịm ọñụ mgbe ha kwuru sị
ka anyị gaa n’ ụlọ nke chineke.
Ugbu a, anyị kwụzi
n’ọnụzọ ama gị, O Jerusalem.
Azịza: Añụrị juru m obi mgbe m nụrụ ha kwuru sị, “Ka anyị gaa n’ụlọ nke Chineke.
2. A rụrụ Jerusalem dịka obodo
ejikọtara ọnụ nke ọma.
Ọ bụ na ya ka agbụrụ niile na-aga,
agbụrụ nke Israel.
Azịza: Añụrị juru m obi mgbe m nụrụ ha kwuru sị, “Ka anyị gaa n’ụlọ nke Chineke.
3. Inye Onyenweanyị ekele
dịka o siri nye n’iwu,
Ebe ahụ ka e dobere oche ikpe eze,
ocheeze nke ụlọ Devid.
Azịza: Añụrị juru m obi mgbe m nụrụ ha kwuru sị, “Ka anyị gaa n’ụlọ nke Chineke.
4. Kpeenụ ekpere maka udo nke Jerusalem sị:
“Ka ndị niile hụrụ gị n’anya nwee ọganihu,
udo dịrị n’ime gi,
dịrịkwa n’ime obi ndi eze gị.”
Azịza: Añụrị juru m obi mgbe m nụrụ ha kwuru sị, “Ka anyị gaa n’ụlọ nke Chineke.
5. N’ihi ụmụnna m na ndi enyi m,
ana m asị: “Udo dịrị gị,”
N’ihi ụlọ nke Onyenweanyị na Chineke anyị
aga m achọ maka ọdịmma nke gị.
Azịza: Añụrị juru m obi mgbe m nụrụ ha kwuru sị, “Ka anyị gaa n’ụlọ nke Chineke.
MBEKU:
ALLELUIA ALLELUIA:
Bịa zọpụta anyị Onyenweanyị na Chineke anyị; ka anyị hụ ihu gị, ka anyị wee nwe nzọpụta.
ALLELUIA.
OZIỌMA –Mtt. 8:5-11
Ihe ọgụgụ ewetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere.
Ka Jesu batara Kapanaum, otu onye ọchịagha bịakwutere ya rịọ ya sị, “Onyenwe m, nwodibo m tọgbọrọ n’ụlọ n’oke ahụ mgbu, akụkụ ahụ ya nwụrụ anwụ.” Jesu asị ya: “Aga m abịa ịgwọ ya.’ Ma onye ọchịagha ahụ zara ya sị, “Onyenwe m, ma kwuo sọ okwu gị, nwodibo m ga-adị mma. N’ihi na mụ onwe m bụ onye nọ n’okpuru ike ọchịchị, enwekwara m ndị agha nọ n’okpuru m; ana m enye otu onye iwu ‘gaa’, ọ gaa, sị onye nke ọzọ ‘bịa’ ọ bịa, m nyekwa nwodibo m iwu ‘mee otu a’ o mee ya.” Nke a tụrụ Jesu n’anya mgbe ọ nụrụ ya. O wee sị ndị na eso ya: “N’ezie agwa m ụnụ, ahụbeghị m ụdị okwukwe dị otu a ọbụladị n’Izrael. Agwa m ụnụ, ọtụtụ ga-esi n’ ọwụwa anyanwụ na n’ọdịda anyanwụ bịa nọnyere Abraham, Aịzik na Jekọb”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu