Ụka nke Mbụ N’oge Olileanya Onye Nzọpụta
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Is. 2:1-5
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 121:1-2. 4-5. 6-9 Az. 11
-
Ihe ọgụgụ nke abụọ
Rom. 13:11-14
- OziọmaMatt. 24:37-44
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Is. 2:1-5
Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Aịzaya
Ọhụ nke Aịzaya nwa Emọz, banyere Juda na Jerusalem. N’oge na-abịanụ, ugwu Ụlọ Nsọ nke Onyenweanyị ga-eto karịchaa ugwu ndị ọzọ nile. A ga ebulite ya elu karịchaa mkpumkpu ala nile. Mba nile ga-enubata n’ime ya. Ndị mmadụ a na-enweghi ike ịgụta ọnụ ga-abata n’ime ya. Ha ga-ekwu si: “Ngwanụ! Bịanụ ka anyị rịgoro n’ugwu nke Onyenweanyị; ka anyị rịgoro n’Ụlọ Nsọ Chineke nke Jekọp; ka Ọ kuziere anyị ụzọ Ya, ka anyị wee nwee ike ịga n’okporo ụzọ Ya. Ebe ọ bụ na iwu nile ga-esi na Zayọn na-apụta; atụmatụ nile nke Onyenweanyị esikwa na Jerusalem na-abịa. Ọ ga-etiri mba niile iwu. Ya onwe Ya ga-abụ Ọ kaa, O bie, n’etiti mba niile. Ndi a nile ga-eji mma agha ha kpụọ ihe e ji akọ ugbo. Ha ga-eji ube ha mere ihe e ji egbu ahịhịa. O nweghịkwa mba ga-eweliri ibe ya mma agha. A gaghị enwekwa ọzụzụ maka ibu agha. Gị bụ ụlọ Jekop, ngwa bịa ka anyị gawa ije n’lhè nke Onyenweanyị.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA –Ps. 121:1-2. 4-5. 6-9 Az. 11
Azịza: Aňurịrị m ọñụ, mgbe m nụrụ ha kwuru: ‘Ka anyị gaa n’ụlọ Chineke!’
1. Añụrịrị m ọñụ, mgbe m nụrụ ha kwuru:
‘Ka anyị gaa n’ụlọ Chineke!
Gị bụ Jerusalem, ugbu a,
ụkwụ anyi guzoro n’ọnụ ụzọ ama gị.
Azịza: Aňurịrị m ọñụ, mgbe m nụrụ ha kwuru: ‘Ka anyị gaa n’ụlọ Chineke!’
2. E wuru Jerusalem dịka oke obodo kwụsiri ike.
Ebe ahụ ka mba nile na-aga;
mba nile nke Onyenweanyị.
Azịza: Aňurịrị m ọñụ, mgbe m nụrụ ha kwuru: ‘Ka anyị gaa n’ụlọ Chineke!’
3. N’ihi ịhụnanya nke ụmụnne m na ndị enyi m,
ana m ekwu sị: ‘Udo dịrị gị!
N’ihi ịhụnanya m nwere maka Ụlọ nke Onyenweanyị,
aga m arịọ arịrịọ maka ọdịmma gị.
Azịza: Aňurịrị m ọñụ, mgbe m nụrụ ha kwuru: ‘Ka anyị gaa n’ụlọ Chineke!’
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ –Rom. 13:11-14
Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndi Rom
Ụmụnna m ụnụ ma nke ọma na ‘oge ahụ’ eruole. Tetanụ n’ụra, n’ihi na nzọpụta anyị dị nso ugbu a karịa mgbe mbụ a tọghatara anyị n’okwukwe. Ọ fọdụrụ ntakịrị ka abalị gafee. Chi ọbụbọ dị nso.
Ka anyị wụfuonụ ejiji e jiri mara abalị! Ka anyị yirinụ ejiji e ji agagharị n’ehihie! Ka anyị biwenụ ndụ mara mma; ụdị ndụ ahụ mmadụ na-ebi n’oge ehihie: ọ bụghị ndụ añụrụma mmanya; ọ bụghị ndụ ịkwa iko na nke ikpa oke aghara; ọ bụghị nke oke ekwurekwu na inwe anya ukwu. Ka ngwa ọgụ ụnụ bụrụ Onyenweanyị Jesu Kristi. Wepụnụ uche n’igbo mkpa anụ ahụ, na inye anụ ahụ ihe niile na-agụ ya.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
MBEKU:
Aleluya, aleluya!
Onyenweanyị, mee ka anyị hụ ebere Gị.
Nyekwa anyị enyemaka nzọpụta Gị.
Aleluya.
OZIỌMA –Matt. 24:37-44
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jesu gwara Ụmụazụ Ya, sị: “Ọbịbịa Nwa nke Mmadụ ga-adị ka ihe mere n’oge Noa. N’Oge ahụ, tupu uju mmiri ahụ abịa, ndị mmadụ nọ na-eri, na-aňụ; ụfọdụ nọ n’ịlụ nwanyị, ụfọdụ nọ n’ịlụ di, ruo ụbọchị ahụ Noa banyere n’ụgbọ mmiri. Ha atụghị anya ihe ọ bụla ruo mgbe mmiri riri ha niile. Otu ahụ ka ọ ga-adịkwa mgbe Nwa nke Mmadụ ga-abịa. Mgbe ahụ, ụmụ nwoke abụọ ga-anọ n’ụbi; e were otu, hapụ otu. Ụmụ nwanyị abụọ ga-anọ ebe a na-akwọ ọka: e were otu, hapụ otu. N’ihi ya, mụrụnụ anya maka na ụnụ amaghị mgbe Onyenwe ụnụ ga-abịa. O were anya nke ọma, na ọ bụrụ na onye nwe ụlọ ma mgbe onye ohi ji abịa n’abalị, ọ gaara amụrụ anya, ghara ikwe ka mmadụ ọ bụla gbukaa ụlọ ya. N’ihi ya, ụnụ onwe ụnụ ga-amụrụ anya, dịkwa njikere, maka na Nwa nke Mmadụ ga-abịa mgbe ụnụ na-atụghị anya Ya.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu