Satọde Izuụka nke Iri Atọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Dan. 7:15-27
-
Abụọma na azịza ya
Dan 3: 82, 83, 84, 85, 86, 87
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk. 21:34-36.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Dan. 7:15-27
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Daniel
Maka ọhụ nke a m hụrụ, mụ bụ Daniel anọghịzi otu ebe, ụjọ na-atụkwa m. Ejekwuru m otu onye n’ime ndị kwụ ebe ahụ wee jụọ ya ihe ndị a pụtara. Ọ kọwaara m ha sị, “Anụọhịa anọ ndị a ị hụrụ nọchiri anya ndịeze anọ ga-achị ụwa n’oge dị n’ihu. Ma n’oge ikpeazụ ọ bụ ndị nsọ nke onye kachasị elu ga-achị ụwa niile ruo mgbe ebighịebi.”Mgbe ahụ ọ masịrị m ịmata ihe gbasaara anụọhịa nke anọ ahụ, nke pụrụ iche n’ebe ndịọzọ nọ, na-eyi egwu, nweekwa eze igwe na mbọ yiri nke e ji ọlaọkụ kpụọ, nke ahụ na-adọgbu, na-eri ma na azọpịachakwa ndị fọdụrụ afọdụ. Agwakwara m ya ka ọ kọwaara m ihe mpi iri ahụ dị ya n’isi pụtara, na ihe mere otu obere mpi ahụ jiri pụta nyakapụ mpi atọ n’ime ndị dịbu mbụ, na ihe mere o jiri nwee anya na ọnụ jupụtara na nganga ma dịkwa ka ọ dị ike karịa ndịọzọ. Ka m na-ele anya, mpi a lụsoro ndị nsọ ọgụ, meriekwa ha, ruo mgbe onye ahụ dị site na mbụ jiri ikpe nkwụmọtọ bịa zọpụta ndị nsọ nke onye kachasị elu, wee nyefee ha alaeze n’aka. Onye ahụ zara m sị, “Gbasaara anụọhịa nke anọ ahụ, a ga-enwe alaeze nke anọ n’ụwa. Ọ ga-adị iche na alaeze ndịọzọ. Ọ ga alụso ihe niile dị n’ụwa agha, si otu ahụ mebie ihe ọbụla o jiri anya ya hụ. Mpi iri ahụ nọchiri anya ndịeze iri ga-esi n’alaeze ahụ wee pụta. Mgbe ndịeze iri ahụ ga na-achị, eze ọzọ nke ga-adị iche n’etiti ndịọzọ ga-apụta, ọ ga-akwatukwa eze atọ wee pụta. Ọ ga-ekwu okwu ọjọọ kwugide Onyekachasielu. Ọ ga-emekpa ndị nsọ nke Onyekachasielu ahụ. Ọ ga-achọ ịgbanwe iwu niile na omenala niile. Ọ ga-eji ndị nke Chineke niile mee ihe ọbụla ọ chọrọ afọ atọ na ọkara. Ma n’ikpeazụ a ga-ekpe ya ikpe, napụ ya ọchịchị ya, weta ya na njedebe ma laakwa ya n’iyi ebeebe. Mgbe ahụ, a ga-enyefe ọchịchị niile, na ịdị ike niile nke alaeze niile dị n’okpuru eluigwe n’aka ndị nsọ nke Onyeka-chasielu. Alaeze ha agaghị enwe njedebe. Ọchịchị niile ga-agbara ha odibo rubekwara ha isi.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Dan 3: 82, 83, 84, 85, 86, 87
Azịza: Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe.
1. Ụmụ mmadụ niile gọzienụ Yahweh,
Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe.
Azịza: Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe.
2. Izrel gọzie Yahweh
Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe.
Azịza: Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe.
3. Ndị ụkọchukwu gọzienụ Yahweh
Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe.
Azịza: Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe.
4. Ụmụodibo niile nke Yahweh gọzienụ Yahweh
Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe.
Azịza: Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe.
5. Mmụọ na mkpụrụobi ndị eziomume niile gọzienụ Yahweh.
Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe.
Azịza: Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe.
6. Ndị niile dị umeala dịkwa ọcha n’obi gọzienụ Yahweh.
Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe.
Azịza: Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe.
MBEKU
Alleluịa, Alleluịa:
Nọdụnụ na nche; na-ekpekwanụ ekpere mgbe niile
ka ụnụ nwee ike iguzo n’ihu nwa nke mmadụ ahụ.
Alleluịa.
OZIỌMA –Lk. 21:34-36.
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ma kpachaaranụ onwe ụnụ anya, ụnụ ekwela ka obi ụnụ daa mba site n’ịla akụ n’iyi na oke añụmañụ na nchegbu nke ndụ a, ụbọchị ahụ ewee bịakwasa ụnụ mgbe ụnụ na-atụghị anya. N’ihina ụbọchị ahụhụ ahụ ga-abịakwasa mmadụ niile bi n’elu ụwa. Ma nọdụnụ na nche; na-ekpekwanụ ekpere mgbe niile ka ụnụ nwee ike ịgbalahụ ihe ndị a niile gaje imezu, nwekwaa ike iguzo n’ihu nwa nke mmadụ ahụ.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu