Fraịde Izuụka nke Iri Atọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Dan. 7:2-14
-
Abụọma na azịza ya
Dan. 3:75, 76, 77, 78, 79, 80, 81
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk. 21:29-33.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Dan. 7:2-14
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Daniel
Daniel hụrụ ọhụ n’abalị wee hụ ka oke ikuku anọ nke eluigwe na-ebugharị nnukwu osimmiri. Mgbe ahụ, ahụrụ m anụọhịa anọ buru ibu dịkwa icheiche ka ha si n’ime osimiri ahụ wee pụta. Nke mbụ dị ka ọdụm, nweekwa nku ugo. Mgbe m nọ na-ele anya, a nyakapụrụ nku ya, kwụwa ya n’elu ala, mee ka ọ kwụrụ n’ụkwụ abụọ ka mmadụ. E nyekwara ya mmụọ nke mmadụ. Anụ ọhịa nke abụọ dị ka nkịta ọhịa. E welitere ya elu n’otu akụkụ, ọ kpụ mkpịsị ngụgụ atọ n’ọnụ ya n’etiti eze ya. A gwara ya sị, ‘Kulie rie ọtụtụ anụ. Ka nke a gachara, elere m anya hụkwa anụọhịa ọzọ yiri agụ. O nwere nku anọ n’azụ ya, nweekwa isi anọ. E nyekwara ya ike ọchịchị. Ka nke a gachara, ahụkwara m, ime nrọ ahụ, anụọhịa nke anọ ka o si n’ime oke osimiri ahụ na apụta. Anụọhịa nke a na-eyi egwu, na-emenyekwa ụjọ; o sikwara nnukwu ike, nweekwa nnukwu eze igwe. Ọ dọriri ihe ọbụla o jidere, rie ya ma zọpịachaakwa nke fọdụrụ.Ọ bụ anụọhị a pụrụ iche n’ebe anụ ndịọzọ nọ. O nwekwara mpi iri. Mgbe m nọ na-ele mpi iri a dị n’isi ya anya, na mberede mpi ntakịrị ọzọ sikwara n’etiti ha pupụta. Mgbe mpi a na-apụta, ahụrụ m ka o fopụrụ mpi atọ n’ime mpi iri ahụ buru ụzọ dịrị, iji mee ka mpi ntakịrị a nweta ohere ebe ọ ga-esi pụta. Mpi a nwere anya dịka anya mmadụ, na ọnụ jupụtara na nganga. Ka m na-ele anya, ahụrụ m ka e doziri ocheeze, onye ahụ dịnụ site na mbụ weere oche ya, uwe ya na-acha ka akụmmiriigwe, ntụtụisi ya na-achakwa ka owu ọcha. Ocheeze ya bụ ire ọkụ, ụkwụ ya bụkwa ọkụ na-enwu enwu. Nnukwu ire ọkụ si n’ebe ọ nọ wee na-apụta, puku kwuru puku ndị mmụọozi nọ ya gburugburu imere ya ihe ọbụla ọ chọrọ. Otu a kwa ka nde kwuru nde mmadụ siri kwụrụ ya n’ihu, na-eche ka o kpee ha ikpe. Ọ dịghị anya, e bido ikpe ikpe, wee meghee akwụkwọ ikpe. Elegharịrị m anya n’ihi mkpọtụ nke mpi ahụ na-eme ngala na-eme. Ka m na-ele anya, ahụrụ m ka e gburu anụọhịa ahụ, gburichaa ahụ ya, were ya nye ka a kpọọ ya ọkụ. Gbasaara ụmụ anụọhịa atọ ndịọzọ, a napụrụ ha ọchịchị ha, ma a hapụrụ ha ka ha dịrị ndụ gaa n’ihu nwa ntakịrị oge. Ahụkwara m na nrọ ahụ, onye dịka nwa nke mmadụ ka ọ na-abịa n’urukpu ojii. Ọ bịara n’ebe onye ahụ dị na mbụ nọ, e duga ya n’ihu ya. E nyere ya ike ọchịchị na otito na alaeze, ka mmadụ niile, mba niile na asụsụ niile wee gbaara ya odibo. Ọchịchị ya enweghị njedebe, ọ gaghị agafe agafe nke a ga-emebi ya emebi.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Dan. 3:75, 76, 77, 78, 79, 80, 81
Azịza: Nyenụ ya otito na Ngọzi dị ebeebe.
1. Ugwu ukwu na ugwu nta niile gọzienụ Yahweh,
Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe.
Azịza: Nyenụ ya otito na Ngọzi dị ebeebe.
2. Ihe niile na-eto eto n’ụwa gọzienụ Yahweh
Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe.
Azịza: Nyenụ ya otito na Ngọzi dị ebeebe.
3. Mmiri niile si n’okwute agbapụta gọzienụ Yahweh.
Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe.
Azịza: Nyenụ ya otito na Ngọzi dị ebeebe.
4. Mmiri ukwu na mmiri nta niile gọzienụ Yahweh
Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe.
Azịza: Nyenụ ya otito na Ngọzi dị ebeebe.
5. Anụ mmiri na ihe niile bi na mmiri gọzienụ Yahweh.
Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe.
Azịza: Nyenụ ya otito na Ngọzi dị ebeebe.
6. Nnụnụ niile bi n’igwe gọzienụ Yahweh
Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe.
Azịza: Nyenụ ya otito na Ngọzi dị ebeebe.
7. Anụ niile bi n’ọhịa na ndị bi n’ụlọ gọzienụ Yahweh
Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe.
Azịza: Nyenụ ya otito na Ngọzi dị ebeebe.
MBEKU:
Alleluịa, Alleluịa:
Na-echenụ nche, dịrị kwanụ njikere n’ihina
ụnụ amaghị oge nwa nke mmadụ ga-abịa.
Alleluịa.
OZIỌMA –Lk. 21:29-33.
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Jesu tụkwaara ha ilu a: “Leenụ osisi fiig na osisi ndịọzọ, mgbe ọbụla ụnụ hụrụ ka ha na-epupụta akwụkwọ ndụ ọhụrụ maranụ na udummiri adịla nso. Otu aka ahụ, mgbe ọbụla ụnụ hụrụ ka ihe ndị a na-emezu maranụ na Alaeze Chineke dị nso. N’eziokwu agwa m ụnụ, ọgbọ a agaghị agabiga maọlị, ruo mgbe ihe ndị a ga-emezu. Eluigwe na ụwa ga-agabigakwa, ma okwu m niile agaghị agabiga ma ọlị.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu