Tọọzde Izuụka nke Iri Atọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Dan. 6:12-28
-
Abụọma na azịza ya
Dan 3: 68, 69, 70, 71, 72, 73, 74
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk. 21:20-28
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Dan. 6:12-28
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Daniel
Mgbe ahụ ndịiro Daniel gbakọtara n’ụlọ ya dịka ha siri kwekọrịta. Ha hụrụ Daniel ka ọ na-ekpe ekpere na-arịọkwa Chineke arịrịọ. Ha jiri ọsọ gbaruo n’obieze jụọ ya sị, “I chetara iwu ahụ i nyere, nke sị na onye ọbụla agaghị arịọ chi ọzọ mọbụ mmadụ arịrịọ ọbụla karịa gị, wee ruo na iri ụbọchị atọ agafee? I chetakwara na i nyere iwu na a ga-atụba onye ọbụla nupụrụ isi n’iwu a n’ọgba agụ?” Eze zara ha sị, “Ya bụ iwu ka dịkwa, dịka iwu ndị Mede na ndị Peshịa nke e nweghị ike ịkagbu akagbu.” Mgbe ahụ ha gwara eze sị, “Nwoke ahụ a na-akpọ Daniel, otu n’ime ndị Juu a dọtara n’agha, kpachaara anya jụ ige gị ntị na ime ihe i nyere n’iwu. Ọ na-arịọ Chineke ya arịrịọ ugboro atọ n’ụbọchị.” Mgbe eze nụrụ ihe ndị a o wutere ya n’obi nke ukwuu. Ọ bụ uche ya ịzọpụta Daniel n’ahụhụ ahụ. Bido n’ụtụtụ ruo n’abalị ọ na-eche n’obi ya ụzọ ọ ga-esi mee nke a. Ma ndịiro Daniel ahụ bịakwutere ya sị ya, “Eze matakwa na ọ bụ iwu nke ndị Mede na ndị Peshịa na iwu ọbụla eze mebere enweghị mgbanwe. Nke a mere ka eze nye iwu ka a kpọta Daniel tụba ya n’ọgba agụ.” Ma eze gwara Daniel sị, “Ka Chineke gị onye ị na-efe oge niile zọpụta gị.” E butere nnukwu okwute were ya mechie ọnụ ọgba agụ ahụ. Eze werekwara mgba aka ya na nke ndịisi alaeze ya wee kaa akara e ji nyachie ọnụ ọgba agụ ahụ. E mere nke a ka a ghara inwe ihe ọbụla a gbanwere gbasaara ahụhụ nke Daniel ga-ata. Mgbe ahụ, eze laghachiri azụ n’ụlọ ya, buo ọnụ abalị ahụ niile, ọ jụkwara ihe obi ụtọ niile. N’abalị ahụkwa, o nweghị ike rahụ ụra. N’isi ụtụtụ ụbọchị nke ọzọ, eze mere ngwangwa si n’ụlọ ya pụta were ọsọ gaba n’ọgba agụ ahụ. Mgbe ọ bịara nso n’ọgba agụ ahụ a tụnyere Daniel, o tiri mkpu n’olu mwute sị, “Daniel odibo nke Chineke dị ndụ, Chineke gị nke ị na-efe oge niile ọ zọpụtala gị n’aka ụmụ agụ?” Mgbe ahụ Daniel gwara eze sị, “Eze ị ga-adị ndụ ruo mgbe ebighịebi! Chineke m zitere mmụọozi ya, ha emechie ọnụ ụmụ agụ ahụ, nke na ha enweghị ike merụọ m ahụ, n’ihina Chineke maara na aka m dị ọcha n’ihu ya.” Ọñụ jupụtara eze obi, o wee nye iwu ka e meghee ọgba agụ ahụ ka Daniel pụta. A kpọpụtara Daniel n’ọgba agụ ahụ, o nweghịkwa mmerụ ahụ ọbụla a hụrụ n’ahụ ya, n’ihina ọ tụkwasara obi na Chineke ya. Mgbe ahụ, eze nyere iwu ka e jide ndị ahụ boro Daniel ebubo tinye ha n’ọgba agụ ahụ, ha na ndị nwunye ha, na ụmụ ha. Ma tupu ha adaruo ala n’ime ọgba ahụ, ụmụ agụ jidere ha dọrichaa ọbụladị ma ọkpụkpụ ha. Ka e mechara eze degaara mmadụ niile, mba niile na asụsụ niile dị n’elu ụwa akwụkwọozi sị, “Udo bawanyere ụnụ! Ana m enye iwu n’ebe niile m na-achị na ọ bụ sọọsọ Chineke nke Daniel ka mmadụ niile ga na-esekpuru na-atụkwara egwu, n’ihina ọ bụ ya bụ Chineke dị ndụ, Chineke nke dị ebeebe, alaeze ya agaghị enwe mmebi, ọchịchị ya agaghị enwe njedebe. Ọ na-agbapụta ndị nke ya, chebe ha ka ihe ọbụla ghara imerụ ha ahụ. Ọ na-arụ ọrụ ebube n’eluigwe na n’ụwa. Ọ bụ ya zọpụtara Daniel mee ka ụmụ agụ ghara iri ya.”
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Dan 3: 68, 69, 70, 71, 72, 73, 74
Azịza: Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe
1. Igirigi na akụmmiriigwe gọzienụ Yahweh.
Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe.
Azịza: Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe
2. Oke oyi na ụgụrụ gọzienụ Yahweh
Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe.
Azịza: Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe
3. Mkpụrụ mmiri niile gọzienụ Yahweh,
Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe.
Azịza: Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe
4. Abalị niile na ehihie niile ọozienụ Yahweh
Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe.
Azịza: Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe
5. Ihe na ọchịchịrị gọzienụ Yahweh
Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe.
Azịza: Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe
6. Amụma mmiri na urukpu niile gọzienụ Yahweh
Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe.
Azịza: Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe
7. Ka ụwa niile gọzie Yahweh
Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe.
Azịza: Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe
MBEKU:
Alleluịa, Alleluịa:
Welitenụ isi ụnụ, lelie anya elu,
n’ihina oge mgbapụta ụnụ abịala nso.
Alleluịa.
OZIỌMA –Lk. 21:20-28
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ma mgbe ọbụla ụnụ ga-ahụ Jerusalem ka usuu ndịagha gbara ya gburugburu, maranụ na oge ntikpọ na ịtọgbọrọ n’efu ya dị nso. Mgbe ahụ, ka ndị nọ n’ala Judia gbaa ọsọ ndụ gaa n’ugwu. Ka ndị nọ n’ime obodo gbalaga. Ka ndị pụrụla n’ime obodo hapụkwa ịbata n’ime ya. N’ihina ndị a ga-abụ ụbọchị ọbọ, ka ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ mezuo. Ahụhụ ga-adịrị ndị dị ime na ndị na-enye nwa ara n’oge ahụ! N’ihina oke mkpagbu ga-adịkwa n’ala nke a. Iwe nke Chineke ga-adị n’ahụ ụmụ mmadụ. Ha ga-anwụ site na mma agha; a kpụrụkwa ha ka ohu nye mba niile. Ndị mba ọzọ ga-etikpọ Jerusalem ruo mgbe ọchịchị ndị mba ahụ ga-ezu. Ihe nrịbaama dị iche iche ga-adị n’anyanwụ na ọnwa na kpakpando. N’elu ụwa, mba dị iche iche ga-anọ na mkpagbu na mgbagwoju anya, n’ihi mbigbọ nke oke osimiri na nnugharị nke ebili mmiri. Ọtụtụ mmadụ ga-enwe ume nkoropu n’ihi oke egwu na ile anya maka ihe ga-adakwasa ụwa, n’ihina a ga-enugharị ike niile nke eluigwe. Mgbe ahụ ka a ga-ahụ Nwa nke Mmadụ ka O si n’urukpu na-abịa n’ike na oke ebube. Ma mgbe ihe ndị a malitere ime, welitenụ isi ụnụ lelie anya elu, n’ihina oge mgbapụta ụnụ abịala nso.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu