Tuezde Izuụka nke Iri Atọ na Anọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Dan. 2:31-45
-
Abụọma na azịza ya
Dan 3: 57, 58, 59, 60, 61
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk. 21:5-11
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Dan. 2:31-45
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Daniel
Daniel gwara eze Nebukadneza sị, “Nke a bụ ihe ị hụrụ n’ọhụ: otu mmadụ a kpụrụ akpụ nke buru oke ibu na-amụke amụke, na-atụkwa ụjọ ile anya, bịara guzoro gị n’ihu. E ji ọlaedo kpụọ isi ya, jiri ọlaọcha kpụọ obi ya na aka ya; afọ ya na apata ụkwụ ya bụ ọlaọkụ ka e jiri kpụọ ha, ma jirikwa igwe na aja ụrọ kpụọ ụkwụ ya. Ka ị nọ na-ele anya, otu okwute si n’elu daa, n’enweghị aka ọbụla dụrụ ya, wee dasa mmadụ a akpụrụ akpụ, ọ dasara n’ụkwụ ya abụọ ndị ahụ e jiri igwe na ụrọ kpụọ, wee kụrie ha. Mgbe ahụ, ma igwe, ma ụrọ, ma ọlaọkụ, ma ọlaọcha, ma ọlaedo kụrichara akụri, dị irighiri ka ahịhịa ọka a yọrọ ayọ. Ikuku busakwara ha, o nweghị otu ibe fọdụrụnụ. Okwute ahụ kụrụ mmadụ akpụrụ akpụ wee bịa buo ibu, ha ka nnukwu ugwu nke nọchiri ala niile. Nke a bụ nrọ ahụ ị rọrọ. Ugbu anyị ga-akọwara onyeeze ihe ọ pụtara: gị onwe gị bụ eze, eze nke ọtụtụ eze ndịọzọ nọ n’okpuru ya, onye Chineke nke eluigwe nyere ike ọchịchị n’oche eze niile na ike na otito, nyefeekwa gị ụmụ mmadụ niile na ụmụ anụmaanụ niile bi n’ime ọhịa, na nnụnụ niile nke igwe, e mere ka ị bụrụ eze ihe niile ndị a, gị bụ isi ahụ e jiri ọlaedo kpụọ. Mgbe ị chịchara, alaeze ọzọ ga-ebili mana ọ gaghị adị ukwu dịka nke gị, mgbe nke a gachara, alaeze nke atọ, nke ga-esi ike dịka ọlaọkụ ga-ebilikwa, ọ ga-achị ụwa niile. A ga-enwekwa alaeze nke anọ, nke ga-esi ike ka igwe. Dịka igwe nke na-akụri ihe niile, ọ ga-egweri ma kụrikwaa alaeze ndị nke ahụ bu ya ụzọ. Ọbọụkwụ ahụ ị hụrụ, nke e ji ụrọ na igwe kpụọ bụ alaeze nke ga-ekewa abụọ, mana ọ ga-esitụ ike dịka igwe. Dịka ụkwụ ahụ e ji aja na ụrọ kpụọ, alaeze a ga-esitụ ike ma ọ gaghị esicha dịka igwe na ụrọ. Dịka otu ahụ ị hụrụ e siri gwakọta igwe na ụrọ ọnụ, otu a ka akụkụ abụọ nke alaeze a kewaranụ ga-esi chọọ ijikọta onwe ha ọnụ, site n’ịlụrịkọta nwaanyị, mana nke a agaghị ekwe mee, dịka ọ gaghị ekwe mee ịgwakọta igwe na ụrọ. N’oge ndịeze ndị a na-achị, Chineke nke eluigwe ga-ewelite otu alaeze nke agaghị enwe mmebi, mba ndịọzọ ahụ bu ya ụzọ agaghị enwe ike imeri ya, ọ ga-emebicha alaeze ndịọzọ bu ya ụzọ mana ọ ga-anọgide ruo mgbe ebighịebi, dịka i siri hụ nkume ahụ siri n’elu ugwu bịa kụrie ma igwe ma ọlaọcha, ma ọlaọkụ ma ụrọ, ma ọlaedo. Chineke egosila gị ihe ga-eme eme. Nrọ ị rọrọ bụ eziokwu, nkọwa nke m nyere bụkwa otu o siri diị.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Dan 3: 57, 58, 59, 60, 61
Azịza: Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe
1. Ihe niile Yahweh mere gọzienụ Yahweh,
Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe.
Azịza: Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe
2. Ndị mmụọozi nke Yahweh, gọzienụ Yahweh,
Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe.
Azịza: Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe
3. Eluigwe niile gọzienụ Yahweh,
Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe.
Azịza: Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe
4. Mmiri dị n’eluigwe gọzie Yahweh,
Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe.
Azịza: Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe
5. Ike niile nke Yahweh gọzie Yahweh
Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe.
Azịza: Nyenụ ya otito na ngọzi dị ebeebe
MBEKU :
Alleluịa, Alleluịa:
Na-echenụ nche, dịrịkwanụ njikere;
n’ihina ụnụ amaghị oge nwa nke mmadụ ga-abịa.
Alleluịa.
OZIỌMA –Lk. 21:5-11.
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Ka ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu banyere ụlọnsọ nke Jerusalem, otu e si were nkume mara mma na ihe ndị mmadụ nyere Chineke chọọ ya mma. Jesu gwara ha sị, “Banyere ihe ndị a niile ụnụ na-ahụ, ụbọchị na-abịa mgbe a gaghị ahapụ otu nkume n’elu ibe ya nke a gaghị akwatu.” Ha jụrụ ya sị, “Onye nkuzi, olee mgbe ihe ndị a ga-emezu? Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịbaama mgbe ihe ndị a ga-emezu? Ma Ọ zara ha sị; “Kpacharanụ anya ka onye ọbụla ghara iduhie ụnụ ụzọ, n’ihina ọtụtụ ga-abịa n’aha m sị, “Ọ bụ m bụ onye ahụ, mọbụ, oge adịla nso!’ Ụnụ esokwala ha. Mgbe ọbụla ụnụ ga-anụ maka agha na kepukepu maka agha na-abịanụ, obi efela ụnụ; n’ihina ihe ndị a niile ga-emezu, ma na ọgwụgwụ oge erubeghị!” Mgbe ahụ Jesu gwakwara ha sị, “Otu mba ga-ebilite megide mba nke ọzọ, otu alaeze ga-ebilitekwa megide alaeze nke ọzọ. Oke ala ọmajijiji ga-adị; oke ụnwụ na ajọ ọrịa na-efe efe ga-adịkwa ebe dị iche iche. Ihe dị egwu na ihe ịrịbaama ukwu ga-apụta site n’eluigwe.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu