Ncheta Jesu bụ Eze Ụwa Niile (Ụka nke Iri Atọ na anọ n’Oge Na-Adanyeghị N’Emume)
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
2 Sam. 5:1-3
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 121:1-5 Az. 1
-
Ihe ọgụgụ nke abụọ
Col. 1:12-20
- OziọmaLk. 23:35-43
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –2 Sam. 5:1-3
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Abụọ nke Samuel
Agbụrụ niile nke Izrel bịakwutere Devid na Hebrọn sị ya: “Lee, anyị na gị bụ otu ahụ na otu ọbara. N’ụbọchị ndị gara aga, mgbe Sọl bụụrụ eze anyị, ọ bụ gị duru ndị Izrel n’agha mmeri niile ha lụrụ. Dinwenụ gwakwara gị sị: “Gị ga-abụ onye nche ndị nke M bụ Izrel; Ị ga-abụ onye ndu ndị Izrel.” Ya mere ndị okenye Izrel ji bịakwute Devid na Hebrọn, ha na eze Devid wee gbaa ndụ na Hebrọn n’ihu nke Dinwenụ. Ha wee chie Devid eze Izrel site n’ite ya ude.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA –Ps. 121:1-5 Az. 1
Azịza: Añụrịrị m ọñụ mgbe m nụrụ ha kwuru sị: Ka anyị gaa n’ụlọ Chineke.
1. Añụrịrị m ọñụ mgbe m nụrụ ha kwuru sị:
“Ka anyị gaa n’ụlọ Chineke.”
Jerusalem, ugbu a ụkwụ anyị guzo n’ọnụ ụzọ gị.
Azịza: Añụrịrị m ọñụ mgbe m nụrụ ha kwuru sị: Ka anyị gaa n’ụlọ Chineke.
2. E wuru Jerusalem ka nnukwu obodo e wukọtara ọnụ mee ka o sie ike.
N’ebe ahụ ka agbụrụ niile na-ezukọta.
Agbụrụ nke Dinwenụ.
Azịza: Añụrịrị m ọñụ mgbe m nụrụ ha kwuru sị: Ka anyị gaa n’ụlọ Chineke.
3. N’ihi na nke a bụ iwu Izrel,
ito aha Dinwenụ n’ebe ahụ.
E doziri oche-eze ikpe nke ezi na ụlọ Devid.
Azịza: Añụrịrị m ọñụ mgbe m nụrụ ha kwuru sị: Ka anyị gaa n’ụlọ Chineke.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ –Col. 1:12-20
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Kolosi
Werenụ ọñụ na-ekele Nna anyị, Onye mere ka ụnụ kwesị isoro keta otu oke ahụ a kwadebeere ndị nsọ n’alaeze nke ìhè. Ọ dọpụtara anyị n’ike nke ọchịchịrị, wee kpọbata anyị n’alaeze nke Nwa Ya Ọ hụrụ n’anya, Onye anyị si n’aka Ya nweta mgbapụta, nke pụtara na a gbagharala anyị njọ anyị. Kristi bụ oyiyi nke Chineke ahụ a na-adịghị ahụ anya, bụrụkwa onye mbụ a mụrụ n’ihe niile e kere eke. N’ihi na n’ime Ya ka e kere ihe niile, ma nke dị n’eluigwe ma nke dị n’elu ụwa; ma ihe a pụrụ ịhụ anya ma nke a na-apụghị ịhụ anya. Ma ike dị n’Oche-eze ma nke dị n’ọchịchị; ma ike mmụọ na nke mmadụ; ma ike e ji atụ ihe a ga-eme eme ma nke e ji atụ ihe a na-aghaghị eme eme; ma ike ukwu ma nke nta. E sitere na Ya kee ihe niile. Ọ bụkwa Ya ka e keere ihe niile. Ọ dị adị tupu e kee ihe ọ bụla. Ọ bụkwa na Ya ka ihe niile jikọtara ọnụ bụrụ otu. Nzukọ bụ ahụ Ya. Ya Onwe ya bụkwa isi nke Nzukọ ahụ. Ebe Ọ bụ Isi-Mbido, Ya onwe Ya bụ Onye mbụ e siri na ndị nwụrụ anwụ wee mụọ; ka O wee bụrụ onye bụ ụzọ n’ụzọ ọ bụla. Maka na Chineke chọrọ ka izuoke niile zuo oke n’ime Ya, chọkwaa ka ọ bụrụ site na Ya na maka Ya ka e jiri kpee udo dị n’agbata Ya bụ Chineke na ihe niile e kere eke. Ọ bụ ọnwụ Ọ nwụrụ n’elu obe ka O jiri mee udo n’agbata ihe niile dị n’eluigwe na ihe niile dị n’ụwa.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
MBEKU:
Aleluya, aleluya!
Ngọzi dịrị onye na-abịa n’aha Dinwenụ!
Ngọzi dịrị alaeze na-abịanụ bụ nke nna anyị Devid.
Aleluya!
OZIỌMA –Lk. 23:35-43
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Igwe mmadụ guzoro ebe ahụ, na-ekiri ihe na-aga. Ma ndị isialaji Jesu na-eme ihe ọchị na-asị: “Ọ zọpụtara ndị ọzọ; Ya bụrụ Mesaya, Onye ahụ Chineke họpụtara chie echichi, Ya zọpụtanụ onwe Ya!” Ndị agha sokwa were Jesu na-eme ihe ọchị: Ha gụrụ, ha abịa chee mmanya vaịnị gbara ụka n’ihu Ya, sị: “Ọ bụrụ na Ị bụ Eze ndị Juu, zọpụta onwe Gị!” Ma ihe ndekwasị e dere n’elu obe, n’isi Jesu, na-akọwa sị: “ONYE A BỤ EZE NDỊ JUU.” Otu n’ime ndị abalịdịegwu abụọ ahụ, akpọgidere Ya na ha, sokwa na-ekwulu Jesu, sị: “Ọ bụ Gị bụ Kristi ahụ, ka ọ bụ na Ị bụghị Ya? Zọpụtanụ onwe Gị na anyị!” Ma onye nke ọzọ baara ya mba, sị: “Gịnị mere ị dịghị atụ ọ bụna Chineke egwu? Ị hụghị na a makọtara anyị na Ya ikpe ọnwụ? N’eziokwu ikpe a mara anyị ziri ezi, n’ihi na anyị na-anata ụgwọ kwesịrị ihe anyị mere, ma Nwoke a emeghị ihe ọjọọ ọ bụla”. Mgbe ahụ ka ọ sịrị: “Jesu, chetakwa m mgbe Ị ga-abanye n’alaeze Gị.” Jesu wee sị ya: “Ana M agwa gị n’eziokwu, taa ị ga-eso M anọ n’Ogige-Añụrị ahụ.”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu