Satọde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
1 Mac. 6:1-13
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 9:2-3, 4, 6, 16, 19
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk. 20:27-40
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –1 Mac. 6:1-13
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Makabii nke Mbụ
Ka eze Antiokus na-agafe na mba ndị bi n’ugwu, ọ nụrụ na Elimaịs dị n’obodo Peshịa, bụ mba a ma ama n’inwe akụnụụba nke ọlaọcha na ọlaedo. Ụlọnsọ ya jupụtara n’akụnụụba. Ọta ndị e jiri ọlaedo mee dị ya, ngwaagha e ji ekpuchi eze obi na ngwaagha ndịọzọ bụ nke Elegzanda, nwa Filip eze Masedonia, onye bụ onye izizi chịrị n’ala Grik hapụrụ. ọ bịara chọọ ka ya weghara ya bụ obodo ma bukọrọkwa ihe dị n’ime ya. Mana o kweghị ya omume maka ndị obodo ahụ matara atụmaatụ ya, wee kwụsie ike lụso ya agha, nke a mere ọsọ jiri pụọ ya n’ukwu o jiri nnukwu obi mwute si ebe ahụ pụọ laghachi na Babịlọn. Ka ọ nọ n’obodo Peshịa, otu onye bịakwutere ya, kọọrọ ya na e meriela ndịagha ya jere ọgụ n’obodo Juda, na Lisịas buru ụzọ chịrị ndịagha aka siri ike gaa, mana ọ tụgharịrị gbaa ọsọ oge o kwudoro ndị Juu, ghọta na ike ha ka nke ya. O mekwara ka ọ ghọta na ndị Juu e nweela ike dị egwu site na ngwaagha, erimeri na ngwongwo ihe ndịọzọ ha napụtara ndịagha ha. Ọ kọwaara ya na ndị Juu akụtuola arụ ahụ ọ kpara na Jerusalem bụ ihe o wuru n’ebe nchụaja, bịa jiri mgbidi dị elu gaa ụlọ nsọ ahụ okirikiri dịka ọ dị na mbụ, wusikwaa Betzọ, otu n’ime obodo nke ya ike. Mgbe eze nụchara akụkọ ndị a, o riri ya ọnụ, ahụ ya niile na-ama jijiji. Nnukwu obi mwute mere ya ọ gaba n’akwa ya ebe ọ nọ daa ọrịa maka na ihe agaghị n’anya ya dịka o si kwadoo. O dinara ebe ahụ ọtụtụ ụbọchị na nnukwu obi mwute nke jidere ya, jidesie ya ike, ọ ghọtara na oge ọnwụ ya eruola. Nke a mere o ji kpọkọọ ndị enyị ya niile gwa ha sị: “Ụra anaghị agakwa m n’anya, uru na nchekasị etirichaala m obi. Ajụrụ m onwe m otu m si bata n’ime oke mmekpa ahụ a na otu m si danye n’ime oke osimiri a na-achọ iri m, ebe m bụ nwoke nwere obiọma, bụrụkwa onye a hụrụ n’anya nke ukwu n’oge ike ọchịchị nọ m n’aka. Ma ugbu a, echetala m arụ m kpara n’obodo Jerusalem ka m si bukọrọ ngwongwo ọlaọcha na ọlaedo ya, bịa zipụkwa ndịagha ka ha jee gbuchapụ ndị obodo Juda n’enweghị ihe ha mere. Ama m na ọ bụ n’ihi nke a ka ihe ọjọọ niile a ji dakwasa m. Lee ka m na-anwụ n’ime obi mwute n’ala mba ọzọ.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 9:2-3, 4, 6, 16, 19
Azịza: Onyenweanyị, Aga m enwe añụrị na ị zọpụtara m
1. Eji m obi niile ekele gị Onyenweanyị
Ana m echeta ọrụ ọma gị niile, n’otu n’otu
Ana m enwe añụrị na gị
Ana m ekwegara aha gị ukwe otito, onye kasị elu.
Azịza: Onyenweanyị, Aga m enwe añụrị na ị zọpụtara m
2. Ndịiro m na-alaghachi azụ
Ha dara n’ala n’ihu gị, nwụchaa.
I nyochaala mba niile, ị laala ndị ajọomume n’iyi,
I kpochapụla aha ha n’ụwa ebeebe.
Azịza: Onyenweanyị, Aga m enwe añụrị na ị zọpụtara m
3. Mba ndị a adakpuola n’olulu ha ji aka ha gwuo
ọnya ha kwere amadola ha.
Onyenweanyị anaghị echezọ ndị nọ na mkpa,
Nchekwube ha nwere n’Onyenweanyị anaghị ala n’iyi.
Azịza: Onyenweanyị, Aga m enwe añụrị na ị zọpụtara m
MBEKU:
Alleluia, Alleluia:
Okwu nke Onyenweanyị ga-adịgide ruo mgbe ebighịebi.
Okwu a bụkwa oziọma ahụ nke a gbasaara ụnụ.
Alleluia
OZIỌMA –Lk. 20:27-40
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Ụfọdụ ndị Sadusii, ndị ekweghị na mbilite n’ọnwụ dị bịakwutere Jesu. Ha jụrụ ya otu ajụjụ sị: “Onye nkuzi, Mosis deere anyị iwu, na ọ bụrụ na mmadụ anwụọ hapụ nwunye ya na-amụtaghị nwa, na nwanne ya nwoke ga-ekuchi nwunye ya ahụ were mụta ụmụ n’aha nwanne ya ahụ. O nwere ụmụnne asaa dịnụ, onye nke mbụ n’ime ha lụrụ nwaanyị, nwụọ n’amụtaghị nwa. Onye nke abụọ, na onye nke atọ lụkwara ya. N’otu aka ahụ, ha asaa lụchakwara ya ma nwụọ n’amụtaghị nwa. N’ikpeazụ, nwaanyị ahụ n’onwe ya nwụkwara. Na mbilite n’ọnwụ, nwunye onyezi ka ọ ga-abụ, ebe ụmụnne asaa ndị a lụchara ya?” Jesu zara ha sị, “Ụmụ nke agbụrụ a na-alụ nwaanyị, na-enwekwa di; ma ndị a họtara, tozuru etozu inweta ọnọdụ n’ụwa ọzọ, anaghị alụ di na nwunye na mbilite n’ọnwụ. N’ihina ha agaghị anwụkwa ọzọ, maka ha na ndị mmụọozi aharala. Ebe ha bụ ụmụ nke mbilite n’ọnwụ, ha bụkwa ụmụ nke Chineke. Ọ bụladị Mosis n’onwe ya kuzikwara na mbilite n’ọnwụ dị. N’ime Akwụkwọ Nsọ, ebe e dere maka ọhịa na-agba ọkụ, Mosis kpọrọ Onyenweanyị, Chineke nke Abraham na Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb. Nke a na-egosị na ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, ndị na-agaghị ebili ọzọ, kama ọ bụ nke ndị dị ndụ, n’ihina mmadụ niile na-adị ndụ ha n’ebe Chineke nọ.” Ụfọdụ n’ime ndị odeakwụkwọ zara ya sị, “Onye nkuzi, Ị zara nke ọma.” Ha anwakwaghị anwa ịjụ ya ajụjụ ọzọ
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu