Wednezde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
2 Mac. 7:1, 20-31
-
Abụọma na azịza ya
Ps 17: 1,5-6, 8, 15
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk. 19:11-28
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –2 Mac. 7:1, 20-31
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Makabii nke Abụọ
N’oge ọzọ, e jidere ụmụnne asaa na nne ha. Eze manyere ha ka ha rie anụ ezi, site n’ịpịa ha ụtalị na ntaramahụhụ ndịọzọ. Nne ụmụaka a bụ onye mere ihe tụkarịchara mmadụ n’anya, nke na o kwesịrị ka a na echeta ya n’ụzọ pụrụ iche. Ọ bụ ezie na ọ nọ, were anya ya hụ ka ụmụ ya asaa siri nwụọ n’otu ụbọchị, o jiri obi siri ike were die ihe ndị a niile maka na ọ tụkwasara obi na Chineke. O jiri ntachiobi nwoke were gbanworo obi mmiri nwaanyị o nwere, were si otu ahụ nwee ike ịgwa nwa ya ọbụla okwu agbamume n’asụsụ nnanna ha. “Amaghị m ka ụnụ siri bata m n’afọ. Ọ bụghị m nyere ụnụ ndụ na ụfụrụ nke ndụ, mọbụ njikọta akụkụ ahụ ụnụ niile. Ya mere, onye okike nke ụwa niile, onye kere mmadụ na ihe niile dị adị, ga-esi n’ebere ya enyeghachi ụnụ ndụ na ume, maka na ụnụ hụrụ iwu ya n’anya karịa otu ụnụ siri hụ onwe ụnụ n’anya.” O doro Antiokus anya na nwaanyị a na-eme ya akaja site n’okwu ọnụ ya. Ya kpatara o jiri mee ihe niile o nwere ike ime iji hụ na nwa ya nke obere hapụrụ omenaala nnanna ha. Ọ ñụrụ iyi, kwe nwata a nkwa ime ya ọgaranya na nnukwu mmadụ, nakwa idobe ya n’ọkwa dị elu nke na a ga na-akpọ ya ‘Enyi Eze.’ Ebe ọ bụ na o geghị eze ntị ma otu, eze kpọrọ nne ya, gwa ya ka ọ dụọ nwa ya ọdụ, ka ọ zọpụta ndụ ya. Ka ọ gwakatara nwaanyị a okwu, o kwetara ime otu o siri kwuo. Mana mgbe ọ dabeere nwa ya n’akụkụ, o bidoro ime onyeeze ọjọ a ihe ọchị site n’ịgwa nwa ya n’asụsụ ala ha sị, “Nwa m meerenụ m ebere. Chetakwa na eburu m afọ ime gị ọnwa itoolu, mụọ gị, kuo gị afọ atọ. Ana m akpachaapụrụ gị anya, na-egboro gị mkpa gị niile were ruo taa. Ya bụ ana m arịọsị gị ike nwa m, ka ị lee anya n’eluigwe na n’ụwa, chịgharịa ihe niile ị hụrụ na ha n’ime obi gị, ka ị ghọta nke ọma na ọ bụ Chineke kere ha niile n’ejighị ihe ọbụla. Otuakwa ka o siri kee mmadụ niile. Egwu atụla gị n’ebe onye ogbu ọchụ a nọ. Were mmụọ gị niile nabata ọnwụ, ka ọ ga-abụ site n’ebere nke Chineke, ka m nweghachita gị na ụmụnne gị ọzọ.” Mgbe nne ya ka na-ekwu ihe ndị a, nwatakịrị ahụ kwuru sị, “Ọ bụ gịnị ka ị na-eche? Ajụla m ihe eze tiri n’iwu. Iwu m ga-erubere isi bụ nke ahụ e nyere nnanna anyị ha site n’aka Mosis. Mana gị onwe gị, si n’ụzọ ọjọọ dị icheiche were na-emegide ndị Hibru, ghọta nke ọma na ị gaghị agbanahụ ahụhụ niile Chineke na-akwadoro gị.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 17: 1,5-6, 8, 15
Azịza: Onyenweanyị, mgbe ugwu gị chawapụtara, ọñụ ga-ezuoke.
1. Onyenweanyị, nụrụ arịrịọ m na-arịọ maka ikpe ziri ezi,
Gee ntị n’arịrịọ m
Chee ntị nụrụ ekpere m
N’ihina o nweghị asị ọbụla dị n’ọnụ m.
Azịza: Onyenweanyị, mgbe ugwu gị chawapụtara, ọñụ ga-ezuoke.
2. Ana m eso ụzọ gị mgbe niile
Ka m ghara ịda.
Ana m akpọku gị, Chineke, ma ị na-azakwa m
Chee ntị nụrụ ihe m na-ekwu.
Azịza: Onyenweanyị, mgbe ugwu gị chawapụtara, ọñụ ga-ezuoke.
3. Chekwa m dịka ọkụkọ si echekwa ụmụ ya
Ma mụ onwe m ụgwọ ọrụ eziomume m ga-abụ ịhụ ihu gị
Aga m ejupụta n’añụrị ị hụ ihu gị.
Azịza: Onyenweanyị, mgbe ugwu gị chawapụtara, ọñụ ga-ezuoke.
MBEKU:
Alleluịa, Alleluịa:
Añụrị na-adịrị ndị were ikwesị ntụkwasịobi
na obi dị mma jidesie okwu Chineke ike werekwa ndidi mịpụta mkpụrụ.
Alleluịa.
OZIỌMA –Lk. 19:11-28
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Ka ha na-anụ ihe ndị a, Jesu gara n’ihu jiri ụkabụilu gwa ha okwu, n’ihina Ọ bịaruwela Jerusalem nso, ya na maka ha chere na alaeze Chineke ga-abịa ozigbo. Ọ gwara ha sị, “Otu nnukwu ọgaranya gara n’ala dị anya ka e chie ya eze; e mechaa ka ọ lọghachitakwa. Ọ kpọrọ ụmụodibo ya iri, nye ha ego pam iri, gwa ha sị: ‘Werenụ nke a na-azụ ahịa tupu mgbe m ga-alọta.’ Ma ndị obodo ya, bụ ndị ọ ga-achị kpọrọ ya asị. Ha zipụkwara ndị ụkwụọzi ka ha sochie ya azụ sị ha: ‘Anyị achọkwaghị ka nwoke a chịa anyị.’ Mgbe ọ lọtara dịka onye e chirila eze, o nyere iwu ka a kpọọrọ ya ụmụodibo ya ndị o nyere ego, ka ọ mata uru ha ritere site n’azụmahịa. Onye nke mbụ bịakwutere ya sị: ‘Otu pam gị amụtala pam iri ọzọkwa.’ Ọ gwara ya sị: ‘Ezigbo odibo, i mere nke ọma! N’ihina i gosịrị onwe gị onye kwesịrị ntụkwasịobi n’ihe dịkarịsịrị nta, ị ga-achị mba iri n’alaeze m.’ Onye nke abụọ bịakwutere ya sị: ‘Nna anyị ukwu, otu pam gị amụtala pam ise.’ Ọ gwara ya sị: ‘Ị ga-achịkwa mba ise n’alaeze m.’ Nwodibo ọzọ bịakwara sị ya, ‘Nna anyị ukwu lekwa otu pam gị, eji m akwa kechie ya, zokwaara gị ya nke ọma, n’ihina egwu gị na-atụ m, maka na ị bụ ajọ mmadụ.Ị na-ewere ihe i dobeghị na-aghọrọkwa mkpụrụ ị na-akụghị.’ Nna ya ukwu gwara ya sị, ‘Gị bụ ajọ nwodibo, aga m ama gị ikpe site n’okwu ọnụ gị. Ị maara na m bụ ajọ mmadụ na-ewere ihe m na-edobeghị, n’aghọrọkwa mkpụrụ m na-akụghị. Gịnị mere i tinyeghị ego m n’ụlọakụ nke ọ ga-abụ mgbe m lọtara, m nara ya na ọmụrụnwa ya? Ọ gwara ndị kwụ n’ebe ahụ sị, ‘Naranụ ya pam ahụ, nyenụ ya onye nke nwere pam iri.’ Ha gwara ya sị: ‘Nna anyị ukwu, o nwerenụ pam iri.’ A gwa m ụnụ, onye ọbụla nwerenụ, a ga-enyekwa ya, ma onye ọbụla na-enweghị, ọ bụladị nke o nwere a ga-anapụ ya. Gbasara ndị iro m niile ndị a, ndị na-achọghị ka m bụrụ eze ha, kpụtanụ ha ebe a, gbukwaa ha n’ihu m.” Mgbe Jesu ji ụkabụilu gwachaa ha okwu a, ọ gara n’ihu ịgbago Jerusalem
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu