Tuezde Izuụka nke Iri Atọ na Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
1Mac. 6:18-31
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 3: 2-3, 4-5, 6-8
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk. 19:1-10.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –1Mac. 6:18-31
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Makabii nke Abụọ
Elieza otu okenye nwere nnukwu ugwu bụrụkwa onye nkuzi iwu, ka a gbabara ọnụ ka o rie anụ ezi. Mana ọ chọrọ iji ugwu were nwụọ kama ịdị ndụ ihere. Maka ihi nke a, ọ gbụpụsịrị anụ ezi ahụ n’ọnụ ya, ma were aka ya jebe ebe a na-ata mmadụ ahụhụ; dịka ndị nwere obi siri ike ịhapụ iri ihe ọbụla iwu na-akwadoghị, ọ bụladị na ha ga-anwụ. Ndị na-elekọta ịchụaja ahụ rụrụ arụ anya kpọọrọ Elieza jebe n’otu akụkụ, maka na o teela aka o jiri bụrụ enyi ha, wee nọrọ na nzuzo tụnyere ya alo, ka o weta anụ nke aka ya, nke o kwesịrị na ọ ga-eri, wee bịa; ka ọ ga-abụ ọ na-eri ya, o mee ka a ga-asị na ọ na-eri anụ ahụ rụrụ arụ, e jiri chụọ aja, nke eze mara n’iwu na a ga-eri, ka o wee site n’ime otu a zọpụta onwe ya n’ọnwụ. Ha gwara ya nke a iji gosi ya afọọma maka enyi ha bụ kamgbe gboo. Mana Elieza kpebiri n’onwe ya ihe kwesịrị na okenye dị ka ya ga-eme. Na ndụ ya niile, bido na nwata, o biri nke ọma n’idobe iwu dị nsọ nke Chineke. Ọ bụ ya mere o jiri kwuo ọsọọsọ ihe bụ uche ya, na-agwa ha ka ha gbuo ya. O kwuru sị, “Ụdị aghụghọ a ekwesịghị ekwesị n’ebe okenye dịka m nọ, ka ọtụtụ ụmụokorobịa ghara iche na m ajụla okwukwe m ugbu a m rurula afọ iri itoolu. Ọ bụrụ na m ejiri ụgha gosi na m na-eri anụ a, naanị ka m were nwee ike ibikwu ndụ ntakịrị oge, ọ ga-ewetara m ihere na enweghị ugwu, ma mekwaa ka imirikiti ụmụokorobịa jehie ụzọ. Asị na m nwere ike ịgbanahụ ntaramahụhụ nke ndị mmadụ, ma m dị ndụ ma m nwụrụ anwụ, enweghị m ike ịgbanahụ ntaramahụhụ nke Chineke pụrụ ime ihe niile. Ọ bụrụ na m ewere ugwu nwụọ ka dike ugbu a, ọ ga-egosi na ogologo ndụ m biri kwesịrị m. Ọ ga-abụkwa ịtọ ezigbo ụkpụrụ n’ebe ndị na-etolite etolite nọ, ka ha wee nwee ike iji añụrị na afọ ojuju nwụọ ọnwụ maka iwu anyị dị asọ kwesịrị nsọpụrụ. Ka o kwuchaara ihe ndị a, o kulie gaba ebe a ga-ata ya ahụhụ. Ndị ahụ weere ya ka enyi na ntakịrị oge gara aga, weziiri ya ugbu a ka onyeiro maka na ha na-eche na ọ zaghachiri ha ka onye ara. Ma mgbe ha tiruru ya ihe n’agbata ọnwụ na ndụ, ọ sụrụ ude, bee sị: “O doro Onyenweanyị anya n’amamihe ya dị nsọ na n’agbanyeghị na e nwere ike ịzọpụta m n’ọnwụ, ana m edi ihe niile a na-akụ m nke na-ebutere m oke mgbu, ma n’ime obi m enwere m añụrị ịta ya bụ ahụhụ n’ihina ana m atụrụ ya egwu.” Elieza were si otu a nwụọ. Ọ nwụrụ ọnwụ ka dike, nke mere ọnwụ ya jiri bụrụ nnukwu ihe nñomi na mgbamume, ọ bụghị naanị ebe ndị na etolite etolite nọ, kama ọ bụkwa n’ebe ọtụtụ ndị obodo Izrel nọ.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 3: 2-3, 4-5, 6-8
Azịza: Onyenweanyị bụ nkwụdosiike m.
1. Onyenweanyị ọnụọgụgụ ndị na-emegide m na-abawanye;
Ọtụtụ mmadụ na-ebuso m agha
Ọtụtụ na-ekwu maka m sị,
ọ dịghị enyemaka o si n’aka Chineke enweta.
Azịza: Onyenweanyị bụ nkwụdosiike m.
2. Mana Onyenweanyị, gịnwa bụ onye nche m
Otito m, Ị na-enyere m aka ịkwụdosịike
Eji m olu ike kpọkuo Onyenweanyị
O wee si n’ugwu nke ya dị nsọ za m.
Azịza: Onyenweanyị bụ nkwụdosiike m.
3. Ugbu a enwere m ike idina ala rahụ ụra ma tetakwa
Maka na Onyenweanyị na-echekwaba m.
Ugbu a enweghị m egwu ọbụla
N’ebe iri nnụ kwuru nnụ ndịiro m gbara m gburugburu.
Azịza: Onyenweanyị bụ nkwụdosiike m.
MBEKU :
Alleluịa, Alleluịa:
Site n’oziọma, Chineke kpọrọ anyị ka
anyị wee nweta otito nke Dinwenụ anyị Jesu Kristi.
Alleluịa.
OZIỌMA –Lk. 19:1-10.
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Jesu banyere na Jeriko, na-achọ isi na ya gaa ebe ọzọ. Ma o nwere otu nwoke a na-akpọ Zacchaeus; nwoke a bụkwa onyeisi ọnaụtụ na nnukwu ọgaranya. Ọ chọrọ ịhụ ma mata onye Jesu bụ. Mana o nweghị ike ime nke a n’ihi igwe mmadụ, maka na ọ dị mkpụmkpụ. Nke a mere o jig baa ọsọ gaa n’ihu, rịgoro otu osisi a na-akpọ Sikamọ, ka o wee nwee ike ịhụ Jesu, maka na ọ ga-esi n’ụzọ ahụ gafee. Mgbe Jesu bịaruru n’ebe ahụ, o leliri anya elu, hụ Zacchaeus sị ya, “Zacchaeus! Mee ngwa rịdata, n’ihi na aga m anọ n’ụlọ gị taa!” O mekwara ngwangwa rịdata, were ọñụ nabata Jesu. Mgbe ndị mmadụ hụrụ nke a, ha niile tamuru ntamu sị: “Ọ banyela ịbụ onye ọbịa n’ụlọ onye omenjọ. Zacchaeus guzooro, gwa Onyenweanyị sị: “Lee Onyenwe m, Aga m enye ndị ogbenye ọkara ihe niile n nwere. Ọ bụrụkwa na o nweela onye m naara ihe ya n’ụzọ aghụghọ, aga m akwụghachị ya ugboro anọ.” Jesu gwara ya sị, ‘Nzọpụta abịaruola n’ụlọ a taa, n’ihina ọ bụkwazi nwa nke Abraham. N’ihina Nwa nke Mmadụ ahụ bịara ịchọpụta ma zọpụtakwa ndị furu efu.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu