Fraịde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Wis. 13: 1-9
-
Abụọma na azịza ya
Ps 19:2-3, 4-5
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk. 17:26-37
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Wis. 13: 1-9
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Amamihe
N’ezie, ndị niile amataghị Chineke dị nzuzu n’ụdị ndụ ha, nke na ha enweghị ike site n’ezigbo ihe niile a na-ahụ anya were mara onye ahụ dịnụ, nke ha na-esite n’aka ọrụ ya achọpụta onye ọrụ ahụ n’onwe ya. Kama, ha na-eche na ọ ga-abụ ọkụ, mọbụ ikuku, mọbụ ifufe, mọbụ ọtụtụ kpakpando, mọbụ mmiri na-ekwo ekwo, mọbụ ihe ndịọzọ na enye ihe n’igwe, bụ chi ndị na-achị ụwa. Ọ bụrụ na ọ bụ maka mma ihe ndị a ka mmadụ ji were ha dịka chi, ka ha ghọta nke ọma otu Yahweh siri karịa ihe ndị a niile, n’ihina onye kere mma mere ha. Ọ bụrụ na ike ha na usoro ọrụ ha tụrụ ndị mmadụ n’anya nke ukwuu, ha sitekwa na ha chọpụta otu onye ahụ kere ha siri dị ike. Maka na anyị nwere ike site n’ebube na mma nke ihe e kere eke, ghọta otu onye kere ha dị. Otu o sina dị, a ga-ata ndị ahụ obere ụta, o nwere ike ịbụ na ha jehiere ụzọ ebe ha na-achọ Chineke, na-enwe nnukwu agụụ ịchọta ya. Ka ha bi n’etiti aka ọrụ ya, ha na-achọ ịghọta ya, ma nwee ntụkwasịobi n’ihe ha hụrụ, n’ihina ha mara mma nke ọma. Otu o sina dị, ụta dịịrị ha. Ọ bụrụ na ha maara ihe nke ịtụgharị uche n’ihe nke ụwa a, olee ihe mere na ha enweghị ike ịchọpụta Yahweh nke ihe niile?
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 19:2-3, 4-5
Azịza: Eluigwe na-ekwupụta ebube Chineke.
1. Eluigwe na-ekwupụta ebube Chineke
Ihe niile dị na mbara eluigwe na-ekwupụta ọrụ aka ya
Ụbọchị niile na-ekwupụta ya,
Abalị ọbụla na-egosịpụta amamihe nke Chineke.
Azịza: Eluigwe na-ekwupụta ebube Chineke.
2. Ha anaghị ekwu okwu
nke ha na-eme ụzụ nke mmadụ ga-anụ
Mana olu ha na-agazu ụwa niile,
Ozi ha na-eru nsọtụ ụwa niile.
Azịza: Eluigwe na-ekwupụta ebube Chineke.
MBEKU:
Alleluịa, Alleluịa:
Tụgharịa obi m n’ụzọ iwu gị; kụziere m ụzọ gị Onyenweanyị.
Alleluịa.
OZIỌMA –Lk. 17:26-37
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Otu ọ dị n’oge nke Noa, otu ahụ ka ọ ga-adịkwa n’ụbọchị Nwa nke mmadụ ahụ. Ndị mmadụ nọ na-eri, na-añụ na-alụkọrịtakwa di na nwunye, ruo n’ụbọchị Noa banyere n’ụgbọ, oke mmiri wee bịa laa ha niile n’iyi. Otu ahụ ka ọ dịkwa n’oge nke Lọt, ha na-eri, na-añụ, na-azụrịtakwa ahịa, na-akụ mkpụrụ, na-arụkwa ụlọ. ma ụbọchị Lọt siri Sodọm gbapụ, ọkụ na nkume dị ọkụ siri n’eluigwe zoo ka mmiri rechapụ ha niile. Otu ahụ ka ọ ga-adị n’ụbọchị a ga-egosịpụta Nwa nke mmadụ. N’ụbọchị ahụ, onye ọbụla nọ n’elu ụlọ arịtukwala ịbịa kwapụ ngwa ụlọ ya dị n’ime ụlọ. Otu aka ahụ, onye nọ n’ubi, ya alaghachikwala n’ụlọ. Chetanụ nwunye Lọt. Onye ọbụla nke na-achọ irita ndụ ya, ga-atụfu ya; ma onye ọbụla nke tụfuru ndụ ya ga-echekwa ya. Agwa m ụnụ, n’abalị ahụ, mmadụ abụọ ga-edina n’elu akwa. A ga-akpọrọ otu onye hapụ nke ọzọ. Ụmụnwaanyị abụọ ga-anọ na-akwọ ihe, a kpọrọ otu, hapụ nke ọzọ. Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya sị, “Ebee ka ihe ndị a ga-eme Onyenweanyị?” Jesu zara ha sị: “N’ebe ozu dị, n’ebe ahụ ka udele ga-ezukọkwa.”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu