Tuezde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Wis. 2:23-3:9
-
Abụọma na azịza ya
Ps 34: 2-3, 16-17, 18-19
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk. 17:7-10
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Wis. 2:23-3:9
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Amamihe
Mana Chineke ekeela mmadụ ka ọ dị anwụ anwụ, o kere ya n’oyiyi nke ya. Ọ bụ anya ụfụ nke ekwensu wetara ọnwụ n’elu ụwa, ndị otu ya bụkwa ndị ga-ahụ ya. Ma mkpụrụobi ndị eziomume dị n’aka Chineke, o nweghị ahụhụ ọbụla ga-emetụ ha. N’anya ndị nzuzu, ha dịka ndị nwụrụ anwụ, ngafe nke ha dịka ahụhụ n’onwe ya. Nhapụ ha hapụrụ anyị dịka ịla n’iyi, mana ha nọ n’udo. N’ezie, a bịa n’anya mmadụ, ha tara ahụhụ, ma olileanya ha jupụtara n’uju nke anwụ anwụ. A tara ha obere ahụhụ ma ha ga-anata nnukwu ụgwọ. Chineke n’onwe ya anwaleela ha, were chọpụta na ha tosịrị ibinyere ya. Ọ ñụchaala ha dịka e si añụcha ọlaedo n’ọkụ, bịa nara ha dịka aja nsureọkụ. Mgbe oge nleta ha bịara, ha ga-achawapụta ka ihe, dịka ikerike ọkụ si adapụta n’ukwu ọkụ. Ha ga-achị mba niile na mmadụ niile, Yahweh ga-abụ eze ha ebighịebi. Ndị ahụ chekwubere na ya, ga-aghọta eziokwu, ndị kwụdosiri ike ga-ebinyere ya n’ịhụnaanya, n’ihina amara na ebere na-eche ndị ahụ ọ họọrọ, ọ na-echekwa ndị nke ya niile.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 34: 2-3, 16-17, 18-19
Azịza: Aga m eto Onyenweanyị oge niile.
1. Aga m eto Onyenweanyị oge niile
Otito ya ga-adị n’egbugbere ọnụ m mgbe ọbụla
Mkpụrụobi m na-egori n’Onyenweanyị
ka ndị umeala nụrụ ma ñụrịa.
Azịza: Aga m eto Onyenweanyị oge niile.
2. Onyenweanyị na-elekọta ndị eziomume anya
Ọ na-egekwa mkpu akwa ha ntị
Mana Onyenweanyị na-agbarụ ihu n’ebe ndị ajọomume nọ
Ọ na-eme ka aghara ichetakwa ha n’ụwa.
Azịza: Aga m eto Onyenweanyị oge niile.
3. Ndị eziomume kpọkuru Onyenweanyị,
Ọ za ha, wee zọpụta ha na nsogbu ha niile
Onyenweanyị na-anọ ndị obi loghara elogha nso,
Na-enyere ndị dara mba na mmụọ aka.
Azịza: Aga m eto Onyenweanyị oge niile.
MBEKU:
Alleluịa, Alleluịa:
Were eziokwu gị doo anyị nsọ n’ihina okwu gị bụ eziokwu.
Alleluịa.
OZIỌMA –Lk. 17:7-10
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “O nwere onye n’ime ụnụ nke nwere nwodibo na-arụrụ ya ọrụ n’ubi, mọbụ na-azụrụ ya atụrụ, ga-agwa nwodibo ya mgbe o siri n’ugbo bata sị, ‘Bịa rie nri ozigbo?’ Ọ bụ na ọ gaghị agwa ya sị, ‘Kwadoro m nri anyasị, jikekwara onwe gị nke ọma ịgbara m odibo ruo mgbe m ga-ericha, ñụchaa. E mechaa, ị ga-eri ma ñụkwaa nke gị.’ Ọ ga-ekele nwodibo ahụ n’ihina o mere ihe a gwara ya? Otu a ka ọ dị ebe ụnụ nọ. Mgbe ọbụla ụnụ mechara ihe a gwara ụnụ, ụnụ ga-ekwu sị, ‘Anyị bụ ụmụodibo etosịghị etosị, ọ bụ ọrụ dịịrị anyị ka anyị rụrụ.”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu