Mọnde Izuụka nke Iri Atọ na Abụọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Wis. 1:1-7
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 139: 1-3, 4-6, 7-8, 9-10
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk. 17:1-6
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Wis. 1:1-7
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Amamihe
Hụnụ eziomume n’anya, ụnụ bụ ndị na-achịachị n’elu ụwa, jirinụ ịkwụba aka ọtọ na-eche maka Yahweh. Werenụ obi dị ọcha chọba ya. N’ihina ndị na-adịghị anwale ya, na-achọta ya, ọ na-egosi ndị niile na-enweghị obi abụọ n’ebe ọ nọ onwe ya. N’ihina echiche na-ezighị ezi na-ekewapụ mmadụ n’ebe Chineke nọ, ịnwale onye pụrụ ime ihe niile na-egosi na nzuzu nke mmadụ buru ibu nke ukwuu. Mba, amamihe agaghị abata n’obi onye ọjọọ, mọbụ onye ahụ jupụtara na njọ. Mmụọ nke amamihe na-asọ aghụghọ, ọ na-agbara atụmaatụ ezighị ezi ọsọ, ọ na-achara ihe ọjọọ mgbe niile. Amamihe bụ ezi mmụọ, ọ gaghị agbaghara ihe ọjọọ nke onye na-ekwutọ Chineke, ebe ọ bụ na Chineke n’onwe ya na-ahụ ime obi onye ahụ, na-ahụkwa ime mmụọ ya nke ọma, na-anụkwa okwu niile sikwa n’ọnụ ya. N’ihina mmụọ nke Yahweh ejupụtala ụwa niile, onye jikọtara ihe niile ọnụ maara okwu ọbụla onye kwuru.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 139: 1-3, 4-6, 7-8, 9-10
Azịza: Dinwenụ, Dube m n’ụzọ nke ndụ ebeebe
1. Onyenweanyị, I nyochala m, marakwa m
Ị ma mgbe m nọdụrụ ala ma mgbe m kwụ ọtọ
Ị na-anọ ebe dị anya mara ihe m bu n’uche
Ị mazuru omume m niile
mgbe m na-arụ ọrụ mọbụ mgbe m na-ezu ike.
Azịza: Dinwenụ, Dube m n’ụzọ nke ndụ ebeebe
2. Tupu emeghee m ọnụ m,
Ị maralaarịị ihe m chọrọ ikwu
Ị nọ n’ihu, nọrọkwa m n’azụ;
I ji aka gị na-echekwaba m.
Ụdị amamihe a kariri m nghọta,
Ọ dị oke elu karịa akọnuuche m.
Azịza: Dinwenụ, Dube m n’ụzọ nke ndụ ebeebe
3. Olee ebe m nwere ike ịga iji gbalahụ gị
Ebee ka m ga-agbaga wee pụọ n’ihu gị?
Ọ bụrụ na m agbagoo n’eluigwe, ị nọ ebe ahụ!
Ọ bụrụ na m agaa n’ala mmụọ, ị nọkwa ebe ahụ.
Azịza: Dinwenụ, Dube m n’ụzọ nke ndụ ebeebe
4. Ọ bụrụ na m efegaa n’ọwụwa anyanwụ;
Mọbụ biri n’ọdịda ya na ngafe osimiri,
Aka gị nọkwa ebe ahụ na-edu m;
Aka nri gị na-ejidesi m ike.
Azịza: Dinwenụ, Dube m n’ụzọ nke ndụ ebeebe
MBEKU:
Alleluia, Alleluia:
Naranụ ozi nke anyị wetaara ụnụ,
ọ bụghị dịka okwu mmadụ kama dịka ihe
ọ bụ n’onwe ya, okwu nke Chineke.
Alleluia
OZIỌMA –Lk. 17:1-6
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ọnwụnwa dị icheiche nke ga-eduba mmadụ na njọ ga-abịarịrị, ma ahụhụ ga-adịrị onye ahụ nke ha ga-esi n’aka ya bịa. Ọ ga-akara ya mma ma a sị na a nyanyere ya nkume e ji akwọ ihe nri n’olu, tụba ya n’ime oke osimiri, karịa na ọ ga-eduba otu n’ime ụmụaka ndị a na njọ. Kpacharanụ anya ụnụ. Ọ bụrụ na nwanne gị mee ihe ọjọọ, dụọ ya ọdụ. Ọ bụrụ na o chegharịa, gbaghara ya. Ọ bụrụ na o mehie gị ugboro asaa sị, ‘Echegharịala m,’ ị ga-agbaghara ya.” Ndị ụmụazụ Jesu gwara ya sị, “Mee ka okwukwe anyị bawanye.” Onyenweanyị azaa ha, “Ọ bụrụ na ụnụ nwere okwukwe buru ibu ka mkpụrụ osisi dịkarịchara nta a na-akpọ mọstad, ụnụ nwere ike inye osisi ọjị iwu sị, ‘ka e fopụ gị, kụkwaa gị n’ime osimiri!’ Ọ ga-erubekwara ụnụ isi.”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu