Odido Nsọ Ụlọ Ụka Jọn Lateran
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Ez. 47:1-2, 8-9, 12.
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 45:1-2, 5-6, 8-9.
-
Ihe ọgụgụ nke abụọ
1Cor. 3:9-11, 16-17
- OziọmaJn. 2:13-22
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Ez. 47:1-2, 8-9, 12.
Ihe ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Izikel
Nwoke ahụ wee kpọghachikwa m azụ n’ọnụụzọ ụlọnsọ; ma lee, mmiri si n’okpuru ụlọnsọ ahụ agbapụta na-asọda ụzọ ọwụwa anyanwụ ụlọ ahụ (maka na ụlọ nsọ ahụ chere ọwụwa anyanwụ ihu). Mmiri si okpuru aka nri ụlọnsọ ahụ asọda na ndịda ebe nchụaja. O sikwa n’ọnụzọama nke dị na mgbago ugwu dupụta m, dugharịa m okirikiri n’ezi ruo n’ọnụụzọama nke mpụta nke chere ihu n’ọwụwa anyanwụ ebe mmiri ahụ sin a ndịda ugwu na-asọpụta. Ọ gwa m sị, “Mmiri a si n’ọwụwa anyanwụ asọda na-agbada na Araba; mana mgbe ọ banyere na mmiri ahụ anaghị asọ asọ mmiri ahụ ga-agbanwe dị mma ọñụñụ. Ebe ọbụla mmiri ahụ gara, ihe ọbụla e kere eke na-egwu mmiri dị na ya ga-adị ndụ, a ga-enwe ọtụtụ azụ maka na mmiri a na-abanye ebe ahụ ka mmiri osimiri dịkwa ọhụrụ, ya bụ na ihe ọbụla dị nay a ga-adị ndụ ebe ọbụla mmiri ahụ sọgara. N’akụkụ abụọ nke ikpere mmiri ahụ, ọtụtụ osisi dị iche iche a na-eri eri ga-eto. Akwụkwọ ha agaghị akpọnwụ akpọnwụ, nke mkpụrụ ga-akọ ha n’elu; ma ha ga na-amị mkpụrụ ọhụrụ ọnwa ọbụla maka na mmiri ha ji eto si n’ebe dị nsọ agbapụta. A ga-eji mkpụrụ ha eme ihe oriri werekwa akwụkwọ ha agwọ ọrịa.”
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 45:1-2, 5-6, 8-9.
Azịza: Lee ka ụlọ obibi gị siri makarichaa mma, Osebụrụwa pụrụ ime ihe niile.
1. Ọ na-agụ m nnukwu agụụ,
ka m bata n’ogige Osebụrụwa,
ka mkpụrụobi m na anụahụ m
na-ekwere Chineke dị ndụ ukwe ọñụ.
Azịza: Lee ka ụlọ obibi gị siri makarichaa mma, Osebụrụwa pụrụ ime ihe niile.
2. Ka o si dị, nnụnụ ebelebe na-achọtara onwe ya ụlọ obibi,
nnụnụ eleke achọtara onwe ya akwụ,
ebe ọ ga-edote ụmụ ya n’akụkụ ebe nchụaja gị,
Onyenweanyị onye pụrụ ime ihe niile,
onye bụ eze m na Chineke m.
Azịza: Lee ka ụlọ obibi gị siri makarichaa mma, Osebụrụwa pụrụ ime ihe niile.
3. Ha bụ ndị agọziri agọzi, ndị bi n’ụlọ gị
na-ekwere gị ukwe otito oge niile.
Ndị ike ha si na gị bụ ndị agọziri agọzi,
ndị bụ n’obi ha ụzọ a na-esi eru Zayọn.
Azịza: Lee ka ụlọ obibi gị siri makarichaa mma, Osebụrụwa pụrụ ime ihe niile.
4. N’ihina otu ụbọchị n’ebe gị ka mma
karịa nnụkwuru nnụ afọ ebe ọzọ,
Ọ kaara m mma ịbụ onye nche ụzọ n’ụlọ nke Onyenweanyị,
karịa ibi n’ebe obibi ndị ajọ mmadụ.
Azịza: Lee ka ụlọ obibi gị siri makarichaa mma, Osebụrụwa pụrụ ime ihe niile.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ –1Cor. 3:9-11, 16-17
Ihe ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Ozi Mbụ Pọl dị asọ degaara Ndị Kọrịnt
N’ihina anyị bụ ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ; ụnụ bụ ala ubi nke Chineke, na ụlọ ya. Dịka amara nke Chineke nyere m si dị, na dịka ọkacha mara n’iwu ụlọ, atọrọ m ntọala, onyeọzọ na-ewukwasịkwa n’elu ya. Ma onye ọrụ ọbụla ga-elezi anya otu o si ewukwasị n’elu ntọala ahụ. N’ihina ọ dịghị onye pụrụ ịtọ ntọala ọzọ, ma ọ bụghị nke ahụ Chineke tọrọla bụ Jesu Kristi. Ọ bụ na ụnụ amaghị na ụnụ bụ ụlọ nsọ nke Chineke, na Mmụọ nke Chineke bikwa n’ime ụnụ? Ọ bụrụ na onye ọbụla emebie ụlọnsọ Chineke, Chineke ga-emebikwa onye ahụ. N’ihina ụlọ Chineke bụ ụlọ dị nsọ.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
MBEKU:
Alleluịa, Alleluịa:
N’ihina ugbu a, ahọrọla m ụlọ nsọ a ma
dobekwa ya nsọ, ka aha m nọrọ ebe ahụ ebeebe,
anya m na obi m ga-adịgide n’ebe ahụ.
Alleluịa.
OZIỌMA –Jn. 2:13-22
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
Mgbe oge Emume Ngabiga nke ndị Juu na-eru nso, Jesu gbagoro na Jerusalem. N’ime ụlọnsọ, ọ hụrụ ndị na-ere ehi, atụrụ na nduru, nakwa ndị na agbanwe ego ka ha nọ na-azụ ahịa. Jesu weere ụdọ meee ụtalị, si n’ụlọnsọ chụpụ ha niile, ma atụrụ, ma ehi. O kpudokwara oche ndị na-agbanwe ego ihu n’ala, fesachaa ego ha. Ọ gwara ndị na-ere nduru sị, “Chịpụnụ ihe ndị a n’ebe a! Ụnụ emela ụlọ Nna m ka ọ bụrụ ụlọ ahịa!” Ndị na-eso ụzọ ya chetara na e dere sị, ‘Mmasị nke ụlọ gị na-anụ m ọkụ n’obi.” Ndị Juu jụrụ ya sị, “Olee akara Ị ga-egosị anyị banyere ime ihe ndị a?” Jesu zara ha sị, “Mebienụ ụlọnsọ nke a, aga m arụghachikwa ya na mkpụrụ ụbọchị atọ.” Ndị Juu zaghachiri ya sị, “O were iri afọ anọ na isii iji rụọ ụlọnsọ a. Ị ga-arụchi ya na mkpụrụ ụbọchị atọ?” Ma Jesu na-ekwu banyere ụlọnsọ nke bụ ahụ ya. Mgbe o siri n’ọnwụ bilie, ndị na-eso ụzọ ya chetara na o kwuru okwu a. Ha wee kwere n’Akwụkwọ Nsọ na n’okwu Jesu kwuru
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu