Wednezde Izuụka nke Iri Atọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Rom. 13:8-10
-
Abụọma na azịza ya
Ps 112: 1-2, 4-5, 9
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk. 14: 25-33.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Rom. 13:8-10
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Rom
Ụnụ ejila onye ọbụla ụgwọ ọbụla, ma ọ bụghị ịhụrịta ibe ụnụ n’anya. N’ihina onye na-ahụ mmadụ ibe ya n’anya edebezuola iwu. Ihe niile e nyere n’iwu: Akwala iko; Egbula mmadụ; Ezula ohi; Enwela anya ukwu n’ebe ọkụ mmadụ ibe gị nọ; iwu ndị a niile na ndịọzọ e jikọtara ha n’otu iwu a: ‘Hụ mmadụ ibe gị n’anya dịka onwe gị.’ Onye hụrụ mmadụ ibe ya n’anya adịghị eme ya ihe ọjọọ. Ya bụ, ịhụnaanya bụ idebezu iwu.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 112: 1-2, 4-5, 9
Aziza: Añụrị na-adịrị ndị nwere ebere na-ebinyekwa ndị nọ na mkpa ihe.
1. Añụrị na-adịrị onye na-atụrụ Onyenweanyị egwu,
Onye ji ọñụ na-edebe iwu ya!
Ụmụ onye dị otu a ga-abụ ndị nwere ike n’ụwa
Agbụrụ onye ezigbo omume ga-enweta ngọzi.
Aziza: Añụrị na-adịrị ndị nwere ebere na-ebinyekwa ndị nọ na mkpa ihe.
2. N’ihina onye ezigbo omume ga-achawapụta
dịka ihe n’etiti ọchịchịrị,
Ọ dị ebere, ịhụnaanya, na-akwụba aka ọtọ
Ya bụ ezigbo mmadụ anaghị ana ọmụrụnwa ma o binye ego.
Aziza: Añụrị na-adịrị ndị nwere ebere na-ebinyekwa ndị nọ na mkpa ihe.
3. Ọ naghị atụfu oge inyere ndị ogbenye aka,
eziomume ya anaghị agbanwe agbanwe,
ndị dị otu a na-enweta nsọpụrụ mgbe niile.
Aziza: Añụrị na-adịrị ndị nwere ebere na-ebinyekwa ndị nọ na mkpa ihe.
MBEKU:
Alleluịa, Alleluịa:
Dinwenụ, meghee obi anyị, k’anyị gee ntị n’okwu nke nwa gị.
Alleluịa.
OZIỌMA –Lk. 14: 25-33.
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Ugbu a ọtụtụ igwe mmadụ so Jesu, O wee tụgharịa sị ha, “Onye ọbụla nke na-abịakwute m, ma ọ kpọghị nna ya na nne ya asị, na nwunye ya na ụmụ ya na nwanne ya nwoke na nwanne ya nwaanyị, ee, ọ bụladị ndụ ya, ọ pụghị ịbụ onye na-eso ụzọ m. Onye ọbụla na-agaghị eburu obe ya sobe m n’azụ, Ọ pụghị ịhụ onye na-eso ụzọ m. Onye n’ime ụnụ chọrọ iwu ụlọ elu, na-agaghị ebu ụzọ nọdụ ala gbakọọ ego ole ọ ga-ewe ka o wee mara ma o nwere ego ga-ezu ịrụ ụlọ elu? O meghị otu a, mgbe ọ tọsịrị ntọala ma o nweghị ike ịrụcha ya, ndị niile hụrụ ya ga-ebido were ya mebe ihe ọchị na-asị, “Nwoke a bidoro ịrụ ụlọ ma o nweghị ike ịrụchapụ ya.” Mọbụ, olee eze ga-achịrị naanị iri puku ndịagha gaa ibuso eze ibe ya nke nwere puku iri abụọ ndịagha, nke na-agaghị ebu ụzọ nọdụ ala, tụlee ma o nwere ike ibusoli ya agha? Ọ bụrụ na o nweghị ike, mgbe onye na-ebuso ya agha ka nọ n’ebe dị anya, ọ na-ezipụ onyeozi ma rịọkwa maka ihe ga-eweta udo. Ya bụ, onye ọbụla n’ime ụnụ na-ajụghị ihe niile o nwere, apụghị ịbụ onye na-eso ụzọ m.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu