Tuezde Izuụka nke Iri Atọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Rom. 12:5-16
-
Abụọma na azịza ya
Ps 131: 1, 2, 3
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk. 14:15-24.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Rom. 12:5-16
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Rom
Otu aka ahụkwa, anyị ndị kwere ekwe, ọ bụ ezie na anyị dị ọtụtụ, ma anyị bụ otu ahụ n’ime Kristi. Anyị bụkwa, n’otu n’otu, ihe dị n’ahụ ibe anyị. Anyị niile n’otu n’otu nwere onyinye amara pụrụ iche, onye ọbụla n’ime anyị dịka amara Chineke nyere ya siri dị. Ka anyị werenụ onyinye amara ndị a mee ihe: Onye Chineke nyere amara ibu amụma, ya buo amụma ka okwukwe ya ha. Ọ bụrụ na anyị nwere amara ije ozi, ka anyị nọgide n’ije ozi. Ọ bụrụ na onye ọbụla nwere amara ikuzi ihe, ya nọgide na nkuzi. Ọ bụrụkwa na onye ọbụla nwere amara ịgba ndịọzọ ume, ya nọgide n’ime nke a. Onye ọbụla na-enyetụ ndịọzọ ihe o nwere, ya were mgbasapụ aka mee ya. Onye ọbụla na-enye aka, ya were obi ịnụ ọkụ na-eme nke a. Onye na-arụ ọrụ ebere, ya were mgbasapụ ihu mee ya. Ka ịhụnaanya ụnụ bụrụ nke eziokwu. Kpọnụ ihe ọjọọ asị. Jidesienụ ezi ihe aka ike. Dịka ụmụnna n’ime Kristi, werenụ ịnụ ọkụ n’obi hụrịtanụ onwe ụnụ n’anya. Na-egosinụ ibe ụnụ nsọpụrụ karịa otu ha si egosi ụnụ. Ụnụ adala mba n’ọrụ; ka mmụọ nke Chineke na-enwu ka ọkụ n’ime ụnụ. Feenụ Dinwenụ ofufe. Ñụrịanụ ọñụ n’ihi olileanya ahụ ụnụ nwere. Nwekwaanụ ndidi n’ime mkpagbu niile. Nọgidesiekwanụ ike n’ekpere. Na-enyetụnụ ụfọdụ n’ihe ụnụ nwere iji gboo mkpa ndị ọzọ. Dịkwanụ uchu n’ọrụ ile ndị ọbịa anya nke ọma. Na-ekperenụ ndị na-esogbu ụnụ ekpere. Gọzienụ ha, ụnụ abụkwala ha ọnụ. Soronụ ndị na-añụrị ọñụ ñụrịa ọñụ. Sorokwanụ ndị na-akwa akwa n’ịkwa akwa. Na-ebinụ n’udo, ụnụ na mmadụ ibe ụnụ. Ụnụ abụla ndị okomoko. Kama ka ụnụ na ndị ọnọdụ ha dị ala na-enwekwa mmekọrịta. Ụnụ abụkwala ndị maara ihe n’anya onwe ụnụ!
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 131: 1, 2, 3
Azịza: Onyenweanyị na gị ka m chọtara udo na ndụ m.
1. Onyenweanyị ngala na mpako ọbụla anọghi m n’obi,
anya m adịghị na nnukwu ihe
Oke ọchịchọ adịghị m n’obi
Nke m na-etinye aka n’ihe kariri m ike.
Azịza: Onyenweanyị na gị ka m chọtara udo na ndụ m.
2. Mana e dobela m mmụọ m jụụ,
dịka nwa ọhụrụ si anọ nwayọọ
n’ara nne ya,
mkpụrụobi m dịka nwa ọhụrụ nọ nwayọọ.
Azịza: Onyenweanyị na gị ka m chọtara udo na ndụ m.
3. O Izrel nwee nchekwube n’Onyenweanyị,
bido ugbu a ruo mgbe ebighịebi.
Azịza: Onyenweanyị na gị ka m chọtara udo na ndụ m.
MBEKU :
Alleluịa, Alleluịa:
Ka Chineke nke Dinwenụ anyị
Jesu Kristi meghee anya nke obi ụnụ,
ka ụnụ wee mata ihe bụ nchekwube
nke ọkpụkpọ ọ kpọrọ ụnụ.
Alleluịa.
OZIỌMA –Lk. 14:15-24.
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Mgbe otu onye n’ime ndị ha na Jesu nọ na nri nụrụ ihe o kwuru, ọ sịrị Jesu, “Ngọzi na-adịrị onye ga-eso n’oriri nke alaeze Chineke!” Ma Jesu sịrị ya, “O nwere otu nwoke kpọrọ nnukwu oriri, kpọkwa ọtụtụ mmadụ. Mgbe oge oriri ruru, nwoke a wee zipụ nwodibo ya, ka ọ sị ndị a kpọrọ oriri, “Bịanụ, n’ihina a kwadoola ihe niile.” Ma ha niile bidoro n’otu n’otu inye ụsa. Onye mbụ gwara ya sị, “Azụrụ m ala ubi, aga m agarịrị hụ ya taa. Biko ewela iwe na agaghị abịalị.” Onye ọzọ wee sị, “Azụrụ m ehi iri na-arụ ọrụ n’ubi, aga m eje ile ha, biko ewela iwe na agaghị m abịalị.” Onye ọzọ wee sị, Alụrụ m nwaanyị ọhụrụ, n’ihi ya agaghị m ahapụ ya abịa.” Nwodibo ahụ lara kọọrọ nna ya ukwu ihe a. N’iwe nna nwe ụlọ wee sị nwodibo ya, “Gaa ọsịsọ n’ama niile, na ụzọ niile nke obodo, kpọrọ m ndị ogbenye, ndị ọlụsị, ndị isi na ndị ngwọrọ.” Na nwa oge, nwodibo ahụ asị, “Nna anyị e meela ihe I kwuru ma ọnọdụ fọdụrụ.” Nna ukwu ahụ sịrị nwodibo ahụ, “Gaa na nnukwu okporo ụzọ niile, na ụzọ ubi niile, manye ndị mmadụ ka ha bata ka ụlọ m wee ju. N’ihina agwa m ụnụ, ọ dịghị otu n’ime ndị ahụ a kpọrọ ha jụ ga-edetụ nri m ọnụ.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu