Mọnde Izuụka nke Iri Atọ na Otu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Rom. 11:29-36
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 69:30-31, 33-34, 36-37
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk. 14:12-14
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Rom. 11:29-36
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Rom
Enye anarakwa adịghị n’onyinye na n’ọkpụkpọ Chineke. Ụnụ onwe ụnụ, ndị mba ọzọ, ndị na-enupụrụ Chineke isi na mbụ anatala ebere Chineke ugbu a n’ihi nnupụisi nke ndị Juu. Otu aka ahụ, ndị Juu na enupụrụ Chineke isi ugbu a, ka Chineke wee site n’ebere Ọ na-emere ụnụ, meere ha ebere ugbu a. N’ihina Chineke emeela mmadụ niile ndị nnupụisi ka o wee mere ha niile ebere. Onye maara ụdị akụ dị n’ime Chineke? Onye pụrụ igwupụta ntọala amamihe ya na nke ike ọmụma ya? Onye pụrụ ịchọpụta otu o si kpebie na ihe niile ga-adị? Onye pụrụ ịmatazu ụzọ ya niile? Dịka Akwụkwọ Nsọ si kwuo, “Onye ma ihe nọ Onyenweanyị n’uche? Onye pụrụ inye ya ndụmọdụ? Onye nyerela ya ihe onyinye mbụ nke na Ọ ga-akwụghachi onye ahụ? Chineke kere ihe niile. Ihe niile sitekwara n’aka ya; ha niile dịkwaara ya; ka otito niile dịrị Chineke, ruo ebeebe! Amen.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 69:30-31, 33-34, 36-37
Azịza: Onyenweanyị, za m n’oke ịhụnaanya gị
1. Ma, n’ebe m nọ, nwa ogbenye a na-emegbu emegbu
Site n’ike nke nzọpụta gị. Chineke, kulite m elu!
Aga m eji ukwe too aha nke Chineke
Aga m eji ekele m bulie aha ya.
Azịza: Onyenweanyị, za m n’oke ịhụnaanya gị
2. Mgbe ahụ ndị umeala hụ nke a ha ga-añụrị
Ka ụnụ nwee ogologo ndụ, ụnụ ndị na-achọ Chineke!
Onyenweanyị na-ege ndị niile nọ na mkpa ntị mgbe niile
Ọ naghị echezọ ndị nke ya e ji eji.
Azịza: Onyenweanyị, za m n’oke ịhụnaanya gị
3. Maka Chineke ga-azọpụta Zayọn,
Wugharịa obodo Juda ọzọ
Ụmụụmụ odibo ya ga-eketakwa ha
Ndị niile hụrụ aha ya n’anya ga-ebikwa na ya.
Azịza: Onyenweanyị, za m n’oke ịhụnaanya gị
MBEKU:
Alleluia, Alleluia:
Okwu gị bụ mpanaka na-edu m bụrụkwa ihe n’ụzọ m.
Alleluia
OZIỌMA –Lk. 14:12-14
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Jesu gwakwuru onye kpọrọ ya oriri sị, “Mgbe ọbụla ị kpọrọ oriri anyasị mọbụ nnukwu oriri ọbụla, akpọla sọ ndị enyi gị mọbụ ụmụnne gị, mọbụ ụmụnna, mọbụ ndị agbataobi gị bara ọgaranya, n’ihina ha ga-akpọkwa gị oriri n’ụlọ ha; wee si n’ụzọ dị otu a kwụghachi gị ụgwọ ihe ha riri n’ụlọ gị. Kama, mgbe ọbụla ị kpọrọ oriri, kpọọ ndị ogbenye, ndị ọlụsị, ndị ngwọrọ na ndị isi. Ngọzi ga-adịrị gị, n’ihina i meere ndị na-agaghị akwụghachili gị iheọma. A ga-akwụghachi gị na mbilite n’ọnwụ ndị eziomume.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu