Ncheta Mkpụrụobi ndị Niile Kwerenụ gara aga.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Wis. 3:1-9
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 63: 2-3, 3-4, 5-6, 8-9
-
Ihe ọgụgụ nke abụọ
Rom. 6:3-9
- OziọmaJn. 6:37-40
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Wis. 3:1-9
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Amamihe
Ma mkpụrụ obi ndị eziomume dị n’aka nke Chineke, o nweghị ahụhụ ọbụla ga-emetụ ha. N’anya ndị nzuzu, ha dịka ndị nwụrụ anwụ, ngafe nke ha dịka ahụhụ n’onwe ya. Nhapụ ha hapụrụ anyị dịka ịla n’iyi, mana ha nọ n’udo. N’ezie, a bịa n’anya mmadụ, ha tara ahụhụ, ma olileanya ha jupụtara n’uju nke anwụ anwụ. A tara ha obere ahụhụ ma ha ga-anata nnukwu ụgwọ. Chineke n’onwe ya anwaleela ha, were chọpụta na ha tosịrị ibinyere ya. Ọ ñụchaala ha dịka e si añụcha ọlaedo n’ọkụ, bịa nara ha dịka aja nsureọkụ. Mgbe oge nleta ha bịara, ha ga-achawapụta ka ihe, dịka ikerike ọkụ si adapụta n’ukwu ọkụ. Ha ga-achị mba niile na mmadụ niile, Yahweh ga-abụ eze ha ebighịebi. Ndị ahụ chekwubere na ya, ga-agọta eziokwu, ndị kwụdosiri ike ga-ebinyere ya n’ịhụnaanya, n’ihina amara na ebere na-eche ndị ahụ ọ họọrọ, ọ na-echekwa ndị nke ya niile.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 63: 2-3, 3-4, 5-6, 8-9
Azịza (V. 2): Onyenweanyị Chineke m, akpịrị na-akpọ mkpụrụ obi m nkụ maka gị
1. O Chineke, ị bụ Chineke m, ana m achọ gị
akpịrị na-akpọ mkpụrụ obi m nkụ maka gị,
anụahụ m na-achọ gị
dịka ala kpọrọ nkụ na-enweghị mmiri.
Azịza (V. 2): Onyenweanyị Chineke m, akpịrị na-akpọ mkpụrụ obi m nkụ maka gị
2. Ọ na-agụ m agụụ ikiri gị n’ebensọ gị
Na ịhụ ike na otito gị
Ịhụnaanya gị ka mma karịa ndụ n’onwe ya
Ọnụ m ga-ekwupụta otito gị.
Azịza (V. 2): Onyenweanyị Chineke m, akpịrị na-akpọ mkpụrụ obi m nkụ maka gị
3. Aga m eto gị na ndụ m niile
Aga m achili aka m elu, wee kpọkuo aha gị
Mkpụrụobi m ga-enwe afọ ojuju dịka n’oge oriri
Egwu ọñụ ga-adị n’egbugbere ọnụ m, iji too gị.
Azịza (V. 2): Onyenweanyị Chineke m, akpịrị na-akpọ mkpụrụ obi m nkụ maka gị
4. N’ihi Ị na-enyere m aka oge niile
Ana m ekwe ukwe ọñụ n’okpuru nku gị
Mkpụrụobi m na-atapara na gị
Aka nri gị na-akwado m.
Azịza (V. 2): Onyenweanyị Chineke m, akpịrị na-akpọ mkpụrụ obi m nkụ maka gị
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ –Rom. 6:3-9
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl Degaara Ndị Rom
Ọ bụ na ụnụ amaghị na anyị niile bụ ndị e mere mmirichukwu n’ime Kristi eketala oke n’ọnwụ ya? Mgbe e mere anyị mmirichukwu, e likọtara anyị na ya ka anyị wee sonye n’ọnwụ ya, ka ọ ga-abụ otu ahụ Chineke Nna ji si n’ike ya dị ebube mee ka Kristi si n’ọnwụ bilie, anyị onwe anyị ga-esi otu ahụ malite ibi ndụ ọhụrụ n’ime Kristi. Ọ bụrụ na anyị na Kristi abụrụla otu site n’ịnwụ ụdị ọnwụ ọ nwụrụ, anyị na ya ga-abụkwa otu site n’ibili n’ọnwụ otu o si bilie. Anyị makwaara na a kpọgidekọtara ndụ ochie anyị na Kristi n’elu obe ka e wee mebie ahụ anyị nke jupụtara na njọ, ka anyị gharakwa ịbụ ohu nke njọ ọzọ. N’ihina onye nwụrụ anwụ apụghị ime njọ ọzọ. Ọ bụrụ na anyị soro Kristi nwụọ n’ọnwụ ya, anyị nwere okwukwe na anyị na ya ga-adịkọ ndụ ọzọ, ebe Chineke mere ka Kristi si n’ọnwụ bilie, Ọ gaghị anwụkwa ọzọ, ọnwụ enweghịkwa ike ọzọ n’ebe ọ nọ.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
MBEKU
ALLELUIA, ALLELUIA:
Bịanụ ụnụ ndị dị ngọzi nke Nna m,
bịanụ ka ụnụ were alaeze nke a kwadobere ụnụ
site na mbido nke ụwa.
ALLELUIA.
OZIỌMA –Jn. 6:37-40
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
Jesu gwara igwe mmadụ ahụ okwu sị, “Onye ọbụla Nna m na-enye m, ga-abịakwute m. Agaghị m achụpụkwa onye ọbụla nke na-abịakwute m. N’ihina esighị m n’eluigwe bịa ime uche m, kama ọ bụ ime uche onye zitere m. Nke a bụ uche nke onye zitere m, ka m ghara ịtụfu ihe ọbụla n’ime ihe niile o nyere m, kama ka m mee ka ha si n’ọnwụ bilie n’ụbọchị ikpeazụ. Nke a bụ uche nke Nna m: ka onye ọbụla hụrụ Nwa ahụ ma kwerekwa na ya, nwee ndụ ebeebe. Aga m akpọlitekwa ya n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu