Nnukwu Emume nke Ndị Nsọ Niile
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Rev. 7:2-4, 9-14
-
Abụọma na azịza ya
Ps 24: 1-2, 3-4, 5-6.
-
Ihe ọgụgụ nke abụọ
Gen. 3:1-3
- OziọmaMatt. 5:1-12.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Rev. 7:2-4, 9-14
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọ Mkpughe
Ahụkwara m Mmụọọma ọzọ ka o si n’ọwụwa anyanwụ rịgoro. O bukwa akara Chineke dị ndụ. O ji olu ike tikuo ndị mmụọọma anọ ahụ, ndị Chineke nyere ike ka ha mebie ụwa na oke osimiri niile, na-asị, “Ụnụ emebila ụwa na oke osimiri niile mọbụ osisi ọbụla ruo mgbe anyị kachara ụmụodibo Chineke akara n’egedege ihu.” Anụrụ m ọnụ ọgụgụ ndị a karala akara ahụ. Ha dị otu narị puku, puku iri anọ na anọ sitere n’agbụrụ niile nke Izrel. Mgbe nke a gafechara, ahụrụ m oke igwe mmadụ ahụ nke na-enweghị onye nwere ike ịgụta ọnụ. Ha si mba niile, agbụrụ niile na asụsụ niile. Ha guzo n’ihu ocheeze ahụ na n’ihu Nwaatụrụ ahụ, yirikwa uwe mwụda ọcha. Ha ji ọmụ nkwụ n’aka ha, jirikwa oke olu na-eti mkpu sị, “Nzọpụta bụ nke Chineke anyị, onye nọ n’ocheeze, bụrụkwa nke Nwaatụrụ ahụ. Ndị mmụọọma niile ahụ gbara ocheeze ahụ, ndị okenye na anụ anọ ahụ dị ndụ gburugburu. Ha dara kpudo ihu n’ala n’ihu ocheeze ahụ, kpọọrọ Chineke isiala na-asị: “Amen, Ngọzi, na otitio, amamihe, ekele, nsọpụrụ, ọchịchị na ike niile dịrị Chineke anyị ebeebe ebeebe! Amen.” Otu n’ime ndị okenye ahụ jụrụ m sị, “Olee ndị bụ ndị a yi uwe mwụda ọcha?” Azaghachiri m ya sị, “Nna m ukwu, amaghị m, Gị onwe gị maara.” O wee gwa m sị, “Ndị a bụ ndị sitere n’oke mkpagbu ahụ pụta. Ha sachara uwe mwụda ha, mee ka ha dị ọcha n’ọbara Nwaatụrụ ahụ.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 24: 1-2, 3-4, 5-6.
Azịza: Ọ bụ ụdị ndị dị otu a na-achọ Onyenweanyị.
1. Chineke nwe ụwa na ihe niile dị na ya,
Ụwa na ndị niile bi n’ime ya;
Ọ bụ ya wụkwasara ya n’elu mmiri,
Ọ bụ ya wuru ya n’elu osimiri.
Azịza: Ọ bụ ụdị ndị dị otu a na-achọ Onyenweanyị.
2. Onye nwere ike ịrịgoro n’ugwu nke Onyenweanyị?
Onye nwere ike ịnọ n’ebe ya dị nsọ?
Onye aka ya na obi ya dị ọcha,
Onye anaghị etinye obi ya n’ihe efu,
onye anaghị añụ iyi asị.
Azịza: Ọ bụ ụdị ndị dị otu a na-achọ Onyenweanyị.
3. Onye dị otu a ga-anata ngọzi n’aka Onyenweanyị,
Ọ ga-anatakwa eziomume n’aka Chineke onye nzọpụta ya.
Ọ bụ ụdị ndị dị otu a na-achọ Onyenwenyị.
Ndị na-achọ ihu Chineke nke Jekọb!
Azịza: Ọ bụ ụdị ndị dị otu a na-achọ Onyenweanyị.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ –Gen. 3:1-3
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi Jọn nke mbụ
Lee ụdị ịhụnaanya Nna gosiri anyị, na a ga-akpọ anyị ụmụ nke Chukwu. Ọ bụ ihe anyị bụ. Ihe mere na ụwa amaghị anyị, bụ n’ihina ọ maghị Nna ahụ. Ma ugbu a, ndị m hụrụ n’anya, anyị bụ ụmụ Chineke. Ihe anyị ga-abụ na ọdịniihu apụtabeghị ihe. Kama, anyị maara na mgbe ọ ga-apụta ihe, anyị ga-adị ka ya, n’ihina anyị ga-ahụ ya otu ọdị. Onye ọbụla nwere nchekwube dị otu a ga-edobe ndụ ya ọcha dịka Kristi si dị ọcha.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
MBEKU
ALLELUIA, ALLELUIA:
Bịakwutenụ m ụnụ niile ndị na-adọgbu
onwe ụnụ n’ọrụ na ndị e boro ibu dị arọ, aga m enye ụnụ ezumike.
ALLELUIA.
OZIỌMA –Matt. 5:1-12.
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Ka Jesu hụrụ igwe mmadụ ahụ, Ọ rịgooro n’elu ugwu. Mgbe ọ nọdụrụ ala, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya. Ọ malitere ịkuziri ha sị, “Ngọzi na-adịrị ndị dara ogbenye n’ime mmụọ, n’ihina alaeze eluigwe bụ nke ha, Ngọzi na-adịrị ndị na-eru ụjụ, n’ihina a ga-akasị ha obi, Ngọzi na-adịrị ndị dị nwaayọ n’obi, n’ihina ha ga-eketa ụwa, Ngọzi na-adịrị ndị agụụ eziomume na-agụ n’ihina a ga-enyeju ha afọ. Ngọzi na-adịrị ndị obi ebere n’ihina a ga-emere ha ebere, Ngọzi na-adịrị ndị dị ọcha n’obi, n’ihina ha ga-ahụ Chineke anya, Ngọzi na-adịrị ndị na-achọ udo n’ihina a ga-akpọ ha ụmụ Chineke, Ngọzi na-adịrị ndị niile a na-emegbu n’ihi eziomume, n’ihina alaeze eluigwe bụ nke ha, Ngọzi na-adịrị ụnụ mgbe ndị mmadụ na-akọcha ụnụ, na-emegbu ụnụ, na-ekwukwa okwu asị ọjọọ niile dị icheiche megide ụnụ n’ihi m. Ñụrịanụ ọñụ, nwekwaanụ obi ụtọ, n’ihina ụgwọ ọrụ ụnụ buru ibu n’eluigwe maka na otu a ka ha siri megide ndị amụma buru ụnụ ụzọ bịa.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu