Fraịde Izuụka nke Iri Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Rom: 9:1-5
-
Abụọma na azịza ya
Ps 147:12-13, 14-15, 19-20
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk: 14:1-6.
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Rom: 9:1-5
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Rom
Ana m ekwu eziokwu n’ime Kristi, ọ bụghị okwu asị ka m na-ekwu. Mmụọ m, nke Mmụọ Nsọ na-achị na-agbara m akaebe maka nke a: na enwere m oke ihe mwute na ihe mgbu n’obi m. Ọ dịkwa m ka m bụrụ onye a bụrụ ọnụ, na onye e wepụrụ n’ebe Kristi nọ, n’ihi ndị nke m Izrel, ndị mụ na ha bụ otu ahụ na ọbara. Ha bụ ndị Izrel, ndị Chineke họọrọ ka ha bụrụ ndị nke ya, wee nyetụ ha ebube ya. Ya na ha gbara ndụ. O nyekwara ha iwu, kuziere ha ụzọ ziri ezi e si efe ya ofufe. O kwekwara ha nkwa dị icheiche. Ha si n’agbụrụ nnanna anyị ochie ha. Kristi n’onwe ya, n’ụdị mmadụ, sikwa n’agbụrụ ha pụta, onye bụ Chineke nke ihe niile ebeebe. Amen.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 147:12-13, 14-15, 19-20
Azịza: Jerusalem, Toonụ Dinwenụ
1. Jerusalem too Onyenweanyị,
Zayọn too Chineke gị
n’ihina ọ bụ ya mere ọnụụzọ ama gị niile ka ha sie ike
ọ na-agọzi ụmụ gị niile.
Azịza: Jerusalem, Toonụ Dinwenụ
2. Ọ na-enye gị udo n’oke ala gị niile
ọ na-eji ọka nke kacha mma azụ gị nri.
Ọ na-etiri ụwa iwu,
okwu ya agazuo ụwa niile ọsọọsọ.
Azịza: Jerusalem, Toonụ Dinwenụ
3. Ọ na-ekpughere ụmụ Jekọb okwu ya,
na-egosikwa ụmụ Izrel iwu ya na ikpe ya.
Ọ naghị emere mba ndịọzọ otu a,
ọ naghị akụziri ha iwu ya, Alleluia.
Azịza: Jerusalem, Toonụ Dinwenụ
MBEKU:
Alleluịa, Alleluịa:
Meghee anya m Onyenweanyị ka m wee hụ ihe ịtụnaanya dị n’iwu gị.
Alleluịa.
OZIỌMA –Lk: 14:1-6.
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
N’otu ụbọchị Sabat, ka Jesu gara oriri n’ụlọ otu onye ọchịchị onye so n’otu ndị Farisii, ndị mmadụ nọ na-ele ya anya. Ma lee o nwere otu nwoke nọ n’ihu ya, onye nwere ọzịza. Jesu jụrụ ndị ọkaiwu na ndị Farisii nọ ebe ahụ sị, “O ziri ezi n’iwu ịgwọ ọrịa n’ụbọchị Sabat ka ọ bụ na o zịghị?” Ha gbara nkịtị. Jesu wee kpọrọ onye ahụ nwere ọzịza, gwọọ ya, hụ ya ka ọ laba. Ọ were sị ha, Olee onye n’ime ụnụ ga-enwe ịnyịnyaibu mọbụ ehi, na-agaghị agụpụta ya ngwa ngwa ma ọ daba n’olulu mmiri n’ụbọchị Sabat?” Ha enweghị ike ịza ajụjụ a.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu