Tọọzde Izuụka nke Iri Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Rom: 8:31-39
-
Abụọma na azịza ya
Ps 109:21-22, 26-27, 30-31
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk: 13:31-35
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Rom: 8:31-39
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Rom
Gịnị ọzọ ka anyị ga-ekwusa! Ọ bụrụ na Chineke nọnyeere anyị, onye ga-emegide anyị? Ọ bụrụ na Chineke ahapụghị otu Nwa ya, kama nyefee ya n’ọnwụ n’ihi anyị, ọ bụ na Ọ gaghị enye anyị ihe ndị nke na-akpa anyị? Onye ga-ebo ndị Chineke họpụtara ebubo? Ọ bụrụ na Chineke atọpụla ha, onye pụrụ ịma ha ikpe? Ọ bụ Jesu Kristi? Mba! Ọ bụghị naanị na ọ nwụrụ n’ihi anyị ma O si n’ọnwụ bilie nọrọ n’aka nri Chineke na-arịọtara anyị arịrịọ. Onye ga-ekewapụ anyị n’ịhụnaanya nke Kristi? Ọ bụ mkpagbu ka ọ bụ oke ntaramahụhụ? Ọ bụ nsogbu ka ọ bụ oke ụnwụ? Ọ bụ ịgba ọtọ ka ọ bụ ihe ize ndụ, ka ọ bụ ụjọ mmaagha? Dịka Akwụkwọ Nsọ si kwuo: “Anyị nọ n’ihe ize ndụ nke ọnwụ n’ihi gị ogologo ụbọchị niile, ndị mmadụ na-agụkwa anyị dịka atụrụ a ga-egbu egbu. Ee, kama n’ihe ndị a niile anyị kariri dike ọgụ site n’aka onye ahụ hụrụ anyị n’anya. N’ihina o weela m anya na, ma ọnwụ mọbụ ndụ, mọbụ ndị mmụọọma mọbụ ụmụ mmụọ dị icheiche ndị na-achị n’elu na ụwa, mọbụ ike ọchịchị dị icheiche, mọbụ ihe dị ugbu a mọbụ ihe ga-abịa, mọbụ ihe dị elu, mọbụ ihe dị omimi, mọbụ ihe ọbụla ọzọ e kere eke apụghị ikewapụ anyị n’ịhụnaanya Chineke nke dị n’ime Jesu Kristi Onyenweanyị.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 109:21-22, 26-27, 30-31
Azịza: Onyenweanyị, zọpụta m n’ihi ịhụnaanya gị.
1. Onyenweanyị chekwaba m n’ihi aha gị
zọpụta m ebe ịhụnaanya gị dị ukwuu!
Ebe m bụzi onye ogbenye na onye ike gwụrụ,
Obi m nọ na nnukwu ihe mgbu;
Azịza: Onyenweanyị, zọpụta m n’ihi ịhụnaanya gị.
2. Nyere m aka Onyenweanyị Chineke m,
zọpụta m ebe ị hụrụ m n’anya;
ma mee ka ha mata na gịnwa mere ya,
na ọ bụ gị Onyenweanyị mere ya.
Azịza: Onyenweanyị, zọpụta m n’ihi ịhụnaanya gị.
3. Aga m eji oke olu nye Onyenweanyị ekele
ma tookwa ya n’ọgbakọ
n’ihi ị haziri nchekwaba nke onye ogbenye ahụ
n’ebe ndị ahụ gaara ama ya ikpe ọnwụ nọ.
Azịza: Onyenweanyị, zọpụta m n’ihi ịhụnaanya gị.
MBEKU:
Alleluịa, Alleluịa
Onye nzọpụta anyị Jesu Kristi emebiela ọnwụ,
wetara anyị ndụ site n’oziọma ya.
Alleluịa.
OZIỌMA – Lk: 13:31-35
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
N’otu oge ahụ ụfọdụ ndị Farisii bịakwutere Jesu sị ya, “Si n’ebe a pụọ n’ihina Herod na-achọ igbu gị.” Ọ gwara ha, “Gaanụ gwa nkịta ọhịa ahụ, lee ana m achụpụ ndị mmụọ ọjọọ, na-agwọkwa nrịanrịa dị icheiche taa na echi, ma ụbọchị nke atọ aga m arụzu ọrụ m. Otu o si na-adi, aghaghị m ịga ebe m na-aga taa na echi na ụbọchị na-esota ya, n’ihina o kwesịghị ka e gbuo onye amụma ebe ọzọ na-abụghị na Jerusalem.” O Jerusalem, Jerusalem ndị na-egbu ndị amụma, na-ejikwa okwute atụgbusi ndị Chineke ziteere ya! Ugboro ole ka m chọrọ ịchịkọta ụmụ gị dịka nnekwu ọkụkọ si achịkọta ụmụ ya n’okpuru nku ya abụọ ma ụnụ ekwegị! Lee a na-ahapụ ụlọ ụnụ! ma agwa m ụnụ, ụnụ agaghị ahụ m anya ọzọ ruo mgbe ụnụ ga-asị, “Ngọzi na-adịrị onye bịara n’aha Dinwenụ.”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu