Wednezde Izuụka nke Iri Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Rom: 8:26-30
-
Abụọma na azịza ya
Ps 13: 4-5, 6
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk: 13:22-30
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Rom: 8:26-30
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Rom
Otu aka ahụ, Mmụọ Nsọ na-enyere anyị aka n’ime adịghị ike anyị. N’ihina anyị amaghị ka e si ekpe ekpere dịka o kwesịrị. Ma Mmụọ Nsọ n’onwe ya ji ịsụ ude nke ọnụ apụghị ịkọ na-arịọrọ anyị arịrịọ. Chineke, onye na-enyocha obi mmadụ, amarala ihe Mmụọ Nsọ bu n’uche. N’ihina Mmụọ Nsọ na-arịọrọ ndị nsọ niile arịrịọ dịka Chineke si chọọ. Anyị ma na Chineke na-eme ihe niile maka ọdịmma ndị niile hụrụ ya n’anya bụ ndị Ọ kpọrọ dịka O si chọọ. N’ihina ndị O buru ụzọ mara, họpụtakwa, O kenyere ha oke dị iche inwe ụdị oyiyi Nwa ya, ka Nwa ya wee bụrụ onye e buru ụzọ mụọ n’etiti ọtụtụ ụmụnna. Ndị ahụ Chineke buru ụzọ mara, ka Ọ kpọrọ; ndị ahụ Ọ kpọrọ ka Ọ gụrụ na ndị eziomume, ndị ahụ Ọ gụrụ na ndị eziomume ka O nyekwara otito.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 13: 4-5, 6
Azịza: Onyenweanyị nchekwube m niile bụ n’ịhụnaanya gị.
1. Lee anya ma za m oku, Onyenweanyị na Chineke m!
Nye m ihe nke Gị, ọdịghị otu a, aga m arahụ ụra nke ọnwụ
Mgbe ahụ onyeiro m ga-ekwu sị, ‘etigbuola m ya,”
Ha ga-enwe añụrị mgbe ha hụrụ na m adaala.
Azịza: Onyenweanyị nchekwube m niile bụ n’ịhụnaanya gị.
2. Mana mụ onwe m nwere
nchekwube n’ịhụnaanya gị Onyenweanyị
Ka mkpụrụobi m ñụrịa n’enyemaka nzọpụta gị
Aga m ekwere Onyenweanyị ukwe
Maka iheọma nke O meere m.
Azịza: Onyenweanyị nchekwube m niile bụ n’ịhụnaanya gị.
MBEKU:
Alleluịa, Alleluịa:
Jerusalem, toonụ Onyenweanyị,
Ọ na-ezipụ okwu ya n’ụwa niile.
Alleluịa.
OZIỌMA –Lk: 13:22-30
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Jesu na-agagharị n’obodo ukwu na n’obodo nta, na-akụzi nkuzi, ka ọ na-aga Jerusalem. Otu onye jụrụ ya sị, “Onyenweanyị ọ bụ naanị mmadụ olemole ka a ga-azọpụta?” O wee gwa ha sị, “Gbaanụ mbọ ka ụnụ si n’ụzọ dị warawara banye, n’ihina agwa m ụnụ, ọtụtụ mmadụ ga-achọ ka ha banye, ma ha agaghị enwe ike. Oge ọbụla onye nwe ụlọ biliri gbachie ọnụụzọ ya, ụnụ ga-amalite iguzo n’ezi na-akụ aka n’ụzọ na-asị, “Dinwenụ megheere anyị ụzọ.” Ọ ga-aza ụnụ sị, “Amaghị m ebe ụnụ si bịa.” Mgbe ahụ ụnụ ga-ebido na-asị, “Anyị na gị riri, ñụkwaa; ịkụzikwara nkụzi n’ogbe anyị.” Ma ọ ga-asị, “Agwa m ụnụ, amaghị m ebe ụnụ siri bịa. Sinụ n’ebe m nọ pụọ, ụnụ niile bụ ndị omenjọ!” N’ebe ahụ ụnụ ga-akwa akwa, na-ata ikikere eze; mgbe ụnụ hụrụ Abraham, Aịzik na Jekọb na ndị amụma niile ka ha nọ n’alaeze Chineke. Ma ụnụ onwe ụnụ ga-abụ ndị a chụpụrụ n’ezi. Ndị mmadụ ga-esi n’ọwụwa anyanwụ na ọdida anyanwụ, sikwa n’ugwu na ndịda, bịa nọdụ n’oche nri n’Alaeze Chineke. Ma lee, ụfọdụ ndị ikpeazụ ga-ebu ụzọ, ụfọdụ ndị bu ụzọ ga-ekpe azụ.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu