Mọnde Izuụka nke Iri Atọ N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Rom 8:12-17
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 68: 2, 4, 6-7, 20-21
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk 13:10-17
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Rom 8:12-17
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Rom
Ụmụnna m, anyị ji ụgwọ. Ma ọ bụghị anụahụ ka anyị ji ụgwọ ịdị ndụ dịka ọchịchọ ya si dị. Ọ bụrụ na ụnụ na-ebi ndụ dịka anụahụ si chọọ, ụnụ ga-anwụ. Ma ọ bụrụ na ụnụ ga-eji ike nke Mmụọ Nsọ mee ka omume niile nke anụahụ nwụọ, ụnụ ga-adị ndụ. N’ihina ndị niile Mmụọ nke Chineke na-edu bụ ụmụ Chineke. Mmụọ nke ụnụ natara abụghị mmụọ nke ịbụ ohu, nke ga-eme ka ụnụ laghachi n’ịtụ egwu. Mmụọ nke ụnụ natara bụ mmụọ nke ụmụ Chineke, nke na-eme ka ụnụ tikuo Chineke sị, ‘Abba! Ezi nna.’ Mmụọ Nsọ ahụ n’onwe ya sokwa mmụọ anyị na-agba ama na anyị bụ ụmụ Chineke. Ọ bụrụ na anyị bụ ụmụ Chineke, anyị sokwa na ndị ha na Kristi ga-eketa alaeze ya. Ọ bụrụ na anyị soro Kristi taa ahụhụ, anyị ga-esokwa ya keta oke otito ya.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 68: 2, 4, 6-7, 20-21
Azịza: Chineke anyị bụ Chineke nke nzọpụta.
1. Ka Chineke bilie, ka ndịiro ya gbasasịa,
Ka ndị niile kpọrọ ya asị gbapụ n’ihu ya
ndị eziomume na-añụrị ọñụ,
ha na-añụrị oke ọñụ na-ekwekwa ukwe añụrị.
Azịza: Chineke anyị bụ Chineke nke nzọpụta.
2. Nna ndị na-enweghị nne na nna,
Onye ogbugbo ndị ajadu
Otu ahụ ka Chineke sị dị n’ebe obibi ya dị nsọ;
Onye na-enye ndị nọ na mkpọrọ añụrị
Site n’ime ka ha nwere onwe ha.
Azịza: Chineke anyị bụ Chineke nke nzọpụta.
3. Ngọzi dịrị Onyenweanyị ụbọchị niile,
Chineke na-azọpụta anyị, na-ebukwa ibu anyị
Chineke anyị a bụ Chineke na-azọpụta
ọ bụ Onyenweanyị Chineke nweụzọ e si agbanarị ọnwụ.
Azịza: Chineke anyị bụ Chineke nke nzọpụta.
MBEKU:
Alleluịa, Alleluịa:
Mee ka m ghọta ihe iso ụzọ gị pụtara,
ka m wee nwee ike ịchịgharị ọrụ ịtụnaanya gị n’obi m.
Alleluịa.
OZIỌMA –Lk 13:10-17.
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
N’otu ụbọchị izu ike, Jesu nọ n’otu ụlọnzukọ ndị Juu na-akuzi ihe. N’ebe ahụ, e nwere nwaanyị nke mmụọ nrịanrịa ji ihe dịka afọ iri na asatọ. Ọ rọọla nwanyị ahụ o nweghịkwa ike iguzozi eguzo. Mgbe Jesu hụrụ ya, Ọ kpọrọ ya sị ya, “Nwaanyị, e meela ka ị pụọ na nrịanrịa gị.” Jesu bikwasara ya aka ya abụọ, ozigbo nwaanyị guzozie, wee too Chineke. Iwe were onyeisi ụlọnzukọ ahụ, n’ihina Jesu gwọrọ ọrịa n’ụbọchị Sabat; maka nke a ọ gwara ndị mmadụ sị, “Ọ dị ụbọchị isii iwu nyere mmadụ ike ịrụ ọrụ, bịanụ n’ụbọchị ndị ahụ ka a gwọọ ụnụ, ọ bụghị n’ụbọchị sabat.” Onyenwenayị zara ya sị, “Ụnụ ndị ihu abụọ! O nwere onye n’ime ụnụ na-anaghị atọpụ ehi ya mọbụ ịnyịnyaibu ya n’ụlọ anụ, duga ya ka ọ ñụọ mmiri n’ụbọchi izuike? Ọ bụ na nwaanyị a bụ ada nke si n’agbụrụ Abraham, onye Ekwensu kere agbụ, kamgbe afọ iri na asatọ ekwesịghị ka a tọpụ ya agbụ n’ụbọchị izuike?” Ka ọ na-ekwu nke a, ihere mere ndịiro ya niile, ma ndị mmadụ niile nwere añụrị maka ihi ọrụ ebube nke ọ rụrụ.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu