Satọde Izuụka nke Iri Abụọ na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Rom: 8:1-11
-
Abụọma na azịza ya
Ps 24:1-2, 3-4, 5-6
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk 13:1-9
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Rom: 8:1-11
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Rom
Ugbu a, ọ dịghị amamikpe ọbụla dịịrị ndị nọ n’ime Jesu Kristi. Iwu nke mmụọ na-enye ndụ, nke dị n’ime Jesu Kristi emeela ka m nwere onwe m site n’aka iwu nke njọ na nke ọnwụ. Chineke emeela ihe iwu emelighị n’ihi adịghị ike nke anụahụ. O mere nke a site n’izite Nwa ya n’ụdị anụahụ adịghị ike, ka ọ bụrụ aja a chụrụ iji wụchapụ njọ. Chineke mere nke a ka e mezuo ihe niile iwu chọrọ n’ime anyị bụ ndị na-ebi ndụ nke mmụọ, abụghị nke anụahụ. N’ihina ndị na-ebi ndụ n’usoro nke anụahụ na-atụkwasa uche ha n’ike nke anụahụ, ma ndị na ebi ndụ n’usoro nke mmụọ na-atụkwasa uche n’ihe nke mmụọ. Otu ọ dị, ịtụkwasa uche n’ihe nke anụahụ na-eweta ọnwụ. Ma ịtụkwasa uche n’ihe nke Mmụọ Nsọ na-eweta ndụ na udo. N’ihina onye ọbụla tụkwasara uche ya n’ihe nke anụahụ bụ onye iro nke Chineke, ọ naghị edobe iwu nke Chineke. N’eziokwu, ọ gaghị enwe ike idobe ya. Ndị na-erubere anụahụ ha isi apụghị ime ihe na-amasị Chineke. Ma otu ọ dị, ụnụ onwe ụnụ anaghị ebizi ndụ n’usoro nke anụahụ, kama ụnụ na-ebi n’usoro nke Mmụọ Nsọ n’ihina Mmụọ Nsọ nke Chineke bi n’ime ụnụ. Onye ọbụla na-enweghị mmụọ nke Chineke abụghị nke ya. Ọ bụrụ na Kristi bi n’ime ụnụ, ọ bụ eziokwu na anụahụ nwụrụ anwụ n’ihi njọ mana mmụọ ụnụ dị ndụ n’ihina a gụọla ụnụ na ndị eziomume. Ọ bụrụ na mmụọ nke Chineke, onye mere ka Kristi si n’ọnwụ bilie biri n’ime ụnụ, onye ahụ mere ka Kristi si n’ọnwụ bilie, ga-enye ahụ ụnụ ndụ site na Mmụọ Nsọ nke bi n’ime ụnụ.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 24:1-2, 3-4, 5-6
Azịza: Onyenweanyị, Ọ bụ ụdị ndị dị otu a na-achọ ịhụ ihu gị
1. Chineke nwe ụwa na ihe niile dị na ya,
Ụwa na ndị niile bi n’ime ya;
Ọ bụ ya wukwasara ya n’elu mmiri,
Ọ bụ ya wuru ya n’elu osimiri.
Azịza: Onyenweanyị, Ọ bụ ụdị ndị dị otu a na-achọ ịhụ ihu gị
2. Onye nwere ike irigoro n’ugwu nke Onyenweanyị?
Onye nwere ike ị nọ n’ebe ya dị nsọ?
Onye aka ya na obi ya dị ọcha,
Onye anaghị etinye obi ya n’ihe efu.
Azịza: Onyenweanyị, Ọ bụ ụdị ndị dị otu a na-achọ ịhụ ihu gị
3. Onye dị otu a ga-anata ngọzi n’aka Onyenweanyị,
Ọ ga-anatakwa eziomume n’aka Chineke onye nzọpụta ya
Ọ bụ ụdị ndị dị otu a na-achọ Onyenweanyị,
Ndị na-achọ ihu Chineke nke Jekọb.
Azịza: Onyenweanyị, Ọ bụ ụdị ndị dị otu a na-achọ ịhụ ihu gị
MBEKU:
Alleluịa, Alleluịa:
Chineke Nna jiri okwu nke eziokwu ahụ mee ka anyị pụta iche.
Meekwa ka anyị bụrụ ụdị mkpụrụ mbụ nke ihe o kere eke.
Alleluịa.
OZIỌMA –Lk 13:1-9
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
O nwere ụfọdụ nọ ebe ahụ n’oge ahụ ndị kọọrọ Jesu maka ndị Galili ahụ Paịlet gburu, were ọbara ha gwọkọta n’ihe aja ha. Jesu wee jụọ ha sị, “Ụnụ cheere na ndị Galili ndị a nwụrụ n’ụzọ dị otu a bụ ndị mmehie karịa ndị Galili ndị ọzọ? Agwa m ụnụ, mba; ma ọ bụrụ na ụnụ echegharịghị ụnụ niile ga-anwụ otu ha siri nwụọ. Mọbụ, kedụ maka mmadụ iri na asatọ ahụ ndị ụlọnche elu dakwasịrị, tigbuo ha na Saịlọm, ụnụ na-eche na ha bụ ndịọjọọ karịa ndị niile bị n’obodo Jerusalem. Agwa m ụnụ, mba, belụsọ ma ụnụ chegharịrị ụnụ niile ga-anwụ otu ha siri nwụọ.” Jesu ji ụkabụilu gwa ha sị, “Otu nwoke nwere osisi fiig nke ọ kụrụ n’ubi ya. Ọ bịara chọọ mkpụrụ n’elu ya ma ọ hụghị. O wee sị onye na-elekọta ubi ya, “Lee, kamgbe afọ atọ ka m na-abịa na-achọ mkpụrụ n’osisi fiig a ma ahụghị m. Ya mere, gbudaa ya; gịnị mere ọ ga-eji na erikọ nri dị n’ala ubi? Ma ọ zara ya sị, ‘Nna m ukwu, hapụkwa ya n’afọ a, ka m gwuo ala gburugburu ukwu ya, wụnye ya agbụgbọ. Ọ bụrụ na ọ mịa mkpụrụ n’afọ ọzọ, ọ dị mma; ma ọ bụrụ na ọ mịghị, Ị nweziri ike gbudaa ya.”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu