Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Rom: 7:18-25
-
Abụọma na azịza ya
Ps 119: 66, 68, 76, 77, 93, 94
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk: 12:54-59
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Rom: 7:18-25
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Rom
Ama m na e nweghị ihe dị mma bi n’ime m, ya bụ, n’ime anụahụ m. Enwere m ike iche echiche ime iheọma ma anaghị m emeli ya. Ezi ihe nke na-agụ m agụụ ime, ka m anaghị eme. Ọ bụrụ na ihe m achọghị ime ka m na-eme, o gosiri na ọ bụghị m na-eme ha n’ime m. Kama njọ nke dị n’ime m na-arụpụta ha. N’eziokwu, nke a dịzi ka ọ bụ iwu: Na mgbe ọbụla m chọrọ ime ezi ihe, ihe ọjọ na-akara m mfe. N’ime obi m, ana m enwe mmasị n’iwu Chineke, ma ana m ahụ n’anụahụ m na-eso iwu ọzọ dị iche, nke na-alụ ọgụ megide iwu nke ime obi m. Ọ bụ nke a mere ka m bụrụ ohu nke njọ bi n’anụahụ m. Ah! Onye hụjurula anya ka m bụ, onye ga-azọpụta m n’anụahụ m nke a na-eduba n’ọnwụ? Ekele dịrị Chineke site na Dinwenụ anyị Jesu Kristi! Otu ọ dị, ana m efe iwu nke Chukwu n’ime mmụọ m, ma anụahụ m na-efe iwu nke njọ.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 119: 66, 68, 76, 77, 93, 94
Azịza: Onyenweanyị, Kụziere m iwu gị
1. Kụziere m ikpe ziri ezi na amamihe
maka na m kwere n’iwu gị.
Azịza: Onyenweanyị, Kụziere m iwu gị
2. Ị dị mma na-emekwa ihe dị mma
kụziere m iso ụzọ gị.
Azịza: Onyenweanyị, Kụziere m iwu gị
3. ka ịhụnaanya gị kwụdosiri ike dị njikere ịtasị m obi,
dịka nkwa I kwere nwodibo gị siri dị.
Azịza: Onyenweanyị, Kụziere m iwu gị
4. Ka ebere gị bịakwute m ka m wee dị ndụ,
n’ihina iwu gị na-atọ m ụtọ.
Azịza: Onyenweanyị, Kụziere m iwu gị
5. Agaghị m echezọnata iwu gị,
n’ihina ọ bụ site na ya ka i si enye m ndụ.
Azịza: Onyenweanyị, Kụziere m iwu gị
6. Abụ m nke gị, zọpụta m,
Maka ana m edobe iwu gị.
Azịza: Onyenweanyị, Kụziere m iwu gị
MBEKU:
Alleluịa, Alleluịa:
Kụziere m ụzọ gị O Dinwenụ. Dube m n’ụzọ kwụ ọtọ.
Alleluịa.
OZIỌMA –Lk: 12:54-59
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Jesu gwakwara igwe mmadụ ahụ sị, “Mgbe ọbụla ụnụ hụrụ urukpu ka o si n’ọdịda anyanwụ na-arịgo, ụnụ na-ekwu ozigbo sị, ‘Mmiri ozuzo na-abịa’; ọ na-emekwa otu ahụ ụnụ siri kwuo. Mgbe ụnụ hụkwara ikuku si na ndịda ugwu ka ọ na-eku, ụnụ na-asị, ‘Oke ekpomọkụ ga-adị’; ọ na-emekwa otu ahụ. Ụnụ ndị abụọ! Ụnụ maara out e si akọwa ihu ụwa na ihu igwe, gịnị mere na ụnụ amaghị otu e si akọwa ihe na-eme n’oge a? Gịnị mere na ụnụ anaghị ekpebiri n’onwe ụnụ ihe dị mma? Ka gị na onye gbara gị akwụkwọ na-aga n’ụlọikpe, gbaa mbọ ka gị nay a kpezie n’ụzọ tupu okwu eruo na ntị onye ọkaikpe, ka ọ ghara ịdọkpụrụ gị nye onye ọkaikpe, onye ọkaikpe arara gị nye onye nlekọta ụlọ mkpọrọ, onye nlekọta ụlọ mkpọrọ akwaba gị n’ụlọ mkpọrọ. Agwa m gị, ị gaghị esi n’ebe ahụ pụta ruo mgbe ị ga-akwụghachi, ọ bụladị ego nta ikpeazụ I ji n’ụgwọ.”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu