Wednezde Izuụka nke Iri Abụọ na Itoolu N’Oge Adanyeghị n’Emume.
-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Rom: 6:12-18
-
Abụọma na azịza ya
Ps 124: 1-3, 4-6, 7-8
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk: 12:39-48
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Rom: 6:12-18
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọozi Pọl degaara Ndị Rom
Ụnụ ekwela ka njọ na-achị eze n’ahụ ụnụ ọzọ, nke ga-eme ka ụnụ na-erubere agụụ nke anụahụ isi. Ụnụ enyefela ahụ ụnụ n’aka njọ ka ọ bụrụ ngwaagha nke ọrụ ọjọọ, kama nyefeenụ onwe ụnụ n’aka Chineke dịka ndị e siri n’ọnwụ kpọbata na ndụ. Nyekwanụ ya ahụ ụnụ ka ọ bụrụ ngwaagha nke eziomume. Njọ agaghị achịkwa ụnụ ọzọ, ebe ụnụ anọghịkwa n’okpuru iwu kama n’okpuru amara Chineke. Gịnị kwa? Anyị ga na-emehie n’ihina anyị anọghị n’okpuru iwu, kama n’okpuru amara Chineke? Chineke ekwela. Ọ bụ na ụnụ amaghị na ụnụ kwenye ife onye ọbụla dịka ohu, ụnụ abụrụla ohu ya n’ezie. Ụnụ enweghị ike ịbụ ohu nke mmehie nke na-eduba n’ọnwụ, bụrụkwa ohu nke nrubeisi nke na-eduba n’oziomume. Ekele dịrị Chineke, na ụnụ ndị bụbu ohu nke njọ esila n’obi ụnụ nwee nrubeisi n’ozi ahụ nke a kụziiri ụnụ. A zọpụtara ụnụ n’ohu nke njọ ka ụnụ bụrụ ohu nke eziomume.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps 124: 1-3, 4-6, 7-8
Azịza: Enyemaka anyị dị n’aha Onyenweanyị.
1. Ka Izrel kwuo sị:
A sị na Chineke anọnyeereghị anyị
Ha gaara elo anyị na ndụ
mụọ anyị ọkụ mgbe iwe were ha.
Azịza: Enyemaka anyị dị n’aha Onyenweanyị.
2. Ide mmiri gaara eri anyị,
ebili mmiri gaara ekpudo anyị,
Ngọzi dịrị Onyenweanyị, onye nke ekweghị
ka ndịiro anyị laa anyị n’iyi!
Azịza: Enyemaka anyị dị n’aha Onyenweanyị.
3. Anyị gbanarịrị ọnya ndịiro anyị kwere
dịka nnụnụ si agbapụ n’ọnya dinta,
ọ gbajiri ọnya ha,
anyị wee nwee ike gbalaga.
Enyemaka anyị dị n’aha Onyenweanyị Onye mere eluigwe na ala.
Azịza: Enyemaka anyị dị n’aha Onyenweanyị.
MBEKU :
Alleluịa, Alleluịa:
Mee ka ihu gị chakwasị nwodibo gị ma kuziere m ime uche gị.
Alleluịa.
OZIỌMA –Lk: 12:39-48
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
Jesu gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ma matanụ nke a, ọ bụrụ na nna nwe ụlọ matararị oge elekere onye ohi ga-abịa, ọ ga na-eche nche, ọ gaghị ahapụ ụlọ ya ka onye ohi gwupuo ya. Ụnụ ga-adịkwa njikere n’ihina Nwa nke mmadụ na-abịa n’oge ụnụ atụghị anya.” Pịta jụrụ sị, “Dinwenụ ọ bụ naanị anyị ka I ji ụkabụilu a agwa okwu, ka ọ bụ maka onye ọbụla?” Ma Dinwenụ zara sị, “Onye bụ nwodibo ahụ kwesịrị ntụkwasịobi, nwekwaa uche, onye nke nna ya ukwu ga-enye ike ilekọta ezinụụlọn ya anya, ka ọ na-enye ha oke nri ha n’oge kwesịrị ekwesị? Ngọzi na-adịrị nwodibo ahụ onye, mgbe nna ya ukwu ga-abịa, ọ ga-ahụ ya ka ọ na-eme otu a. N’ezie agwa m ụnụ, nna ya ukwu ga-eme ya onye nlekọta nke ihe niile o nwere. Kama, ọ bụrụ na nwodibo ahụ echee n’obi ya sị, Nna m ukwu anọọla ọdụ na mbata, wee bido iti ụmụodibo ndị nwoke na ndị nwaanyị ihe, na-eri na-añụkwa, mmanya ana-egbu ya, nna ya ukwu ga-abịa n’ụbọchị ọ na-atụghị anya ya n’oge elekere ọ na-amaghị. Ọ ga-ata ya ahụhụ, tinyekwa ya n’ebe ndị na-ekwesịghị ntụkwasịobi na-anọ. Odibo ahụ nke maara ihe nna ya ukwu na-achọ, mana ọ dịghị njikere ime ya, o meghịkwa dịka ọchịchọ nna ya ukwu sị dị, ga-anata ọtụtụ ụtalị. Ma nwodibo nke na-amaghị ma mee ihe kwesịrị ịpịa ụtalị ga-enweta ụtalị olemole. Onye ọ bụla nke e nyere ihe ukwu, a ga-achọkwa ihe ukwu n’aka ya; onye ndị mmadụ nyekwara ihe ukwu n’aka, n’aka ya ka ha ga-achọ ihe nke kanụ.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu